Stella Dimoko Korkus.com: ETU ESI ALU NWANYI NA-ALA IGBO

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, October 10, 2016

ETU ESI ALU NWANYI NA-ALA IGBO

IGBO KWEENU.........YA
IGBO KWEENU....YA
IGBO KWEZUONU.....ISEE.....






   Umu nnem ekele m unu o....,nke onye chiri ya zere o....
Ó nwanne unu nwanyi na-ekwu.
A siri m stella ka- anyi bloogu o na asusu anyi,maka na igbo amaka!!
     Ndi ugwu na ndi ofe biko si ebe a puo LMAO.

Umu nne m achoro m ka anyi kparita ka esi alu nwanyi na obodo anyi di iche iche.
     Aga m agwa unu etu esi alu nwanyi na-obodo m.
A bu m onye NGBO na EBONYI STEETI.
Ka anyi si alu nwanyi na-be anyi bu e tua;

1. Mgbe nwoke huru nwanyi ohuru na-anya o ga-alu,o ga-aju ya ezi-na-ulo o si.

2.Nke nwoke ga-ejekwuru onye agbata obi nwanyi ahu o choro ilu ka o nyere ya aka iluta nwanyi.
Onye ahu ka o ga-na ezi ozi o ga-ezi ndi be nke nwanyi,ndi be nke nwanyi ga-na ezikwa ya ozi o ga-ezi nke nwoke.
Ndi be anyi na-akpo onye di otua "ONYE NSUBERE", ufodu na-akpokwa ya "NWA NDU UZO".

3.Ndi be nke nwoke ga-agazi na-be ndi nke nwanyi,kwuo ihe ha na-acho n'ezi-na-ulo ahu.
Anyi na-akpo ya "IGBATA NJI", ufodu na-akpokwa ya "IKU AKA".

4. Ndi be nke nwanyi ga-eje juo ese maka ezi- na-ulo nke nwoke choro ibu ogo ha.
Ha ga-aju ka ha mara ma ha abu ndi ohi, ndi na-egbu mmadu,ndi mere aru ma o bukwa ndi nwere ajo oria na-agburu ha.

5. Ubochi akara aka,ndi be nke nwoke ga-abia, o buru na ndi be nke nwanyi emecha go nyocha ha were fu na ndi be nke nwoke bu ezigbo mmadu,ha ga edeputa ihe eji alu nwanyi were nye ndi be nke nwoke.

6. Ndi be nke nwoke ga-eje zutasia ihe ederena-akwukwo ahu.
Aga azuta ihe nna,nne,umunna,umu agbogho,umu okorobia,umu okpu/umu ada,ydgz.
Ha ga-akwukwa ego ha na umunna nke nwanyi kwekotara ha ga-akwu n'isi nwada ahu.
Nkea ka ana-kpo "IME EGO".

7.A ga anozi ebe ahu kwekorita ubochi a ga- agba nkwu.
Ubochi ahu,nke nwoke ga akpo ndi ikwu na ibe ya na ndi enyi ya were gaa na be ndi ogo ya.
Ubochi ahu kwa ka nwada ahu ga egosi oha obodo di ya.
Ndi be nke nwanyi ga ekpekwara ya na di ya ekpere oma,ka alu m di -na - nwunye ha gazie nke oma.
Ndi be nke nwanyi ga ejikwa ngwo ngwo eji ebi na ulo were duo nwa ha nwanyi ulo.
Etua ka-esi eme ya na obodo m.
Ngwa bia kwuo ka esi eme ya na obodo gi.


   Daalu nu o!!!
B.V
AMANDA FAVOUR



Amanda dalu oooooo.


216 comments:

  1. Replies
    1. Ewooo ihe nke a atogbugom. Anam agu na achicha eze ka oke mmiri mara.

      Delete
    2. Nwada Igbo ka I bu...Jisie ike nwannem

      Delete
    3. Amanda nwanne m nwanyi. Jisike nnoo, i gbali ka

      Delete
    4. Amanda. Chukwu Gozie gi nnem.

      Asusu igbo ga'ebi

      Delete
    5. Ewoooooo...ndaakwa mgba nkio meru?, biko ya gazia Nwanneukwu.

      Delete
    6. I no sabi write igbo.... Kisses to my igbo brothers/sisters

      Delete
    7. Well am out not igbo but esan!!!

      Delete
    8. What's this? Hissss. Stop gossiping

      Delete
    9. Igbo amaka na eziokwu. Ka anyi nine jisike na ikuziru umu anyi asusu ibo,agbanyeghi obodo ha bi.chukwu gozie gi Amanda

      Delete
    10. Nwanneukwu ndewo rii @Pipi Lee. Asusu wu gosiri na ibu onye isuikwuato

      Delete
  2. Stella daalu nwanyi oma
    Umunne m ngwa osetigo ...hahahaha
    Ka kpaa ndi ugwu Na ndi ofe anya 👀👀 LMAO 😁

    Igbo amaka

    ReplyDelete
    Replies
    1. No way! I'll have to read this later

      Delete
    2. Hahahaha ina achokwa okwu

      Delete
    3. Chai amanda nnem oma ima ife rinne.
      Ka m na agu, ona ato m ka ji mmanu.
      Ife nile ikwuru bu nno eziokwu ka esi eme ya be anyi. Mana nwa ndu uzo afu adiro adikebe soso ma acho iwechiya ego emere ma di na nwunye gbasa. Lol

      Nwa nwa jisie ike. Iso na ife ana eme biko.
      Ya gazielu gi onye oma

      Delete
    4. Amanda Nwanyi Oma! Oga adiri gi Na nma Na ututu, ehihie na abali. Ife idere amaka, mana onwere Otu ife jogburu onwe ya Ndi be Anyi ka Na eme mgbe Ana Aju ajuju adiro nma. Akuko gbasara Ihe OSU kana awunye aja Na ute otutu umu agbogho na umu okorobia. Ya bu ife jogburu onwe ya. Anyi bu ndi igbo tiwara slate ga Acho ife aga eme ya bu Okwu. Amanda akara m Isi kamu nubagi ugbua maka Ikpara agwa ka nwa nuru mmiri ala nne ya ofuma, mana anu go mu nwa Ada Anambra Na eme mu Obi Sara Sara. Igbo bu igbo , o ga adiri Anyi Nile nma Na agbanyeghi akpom asi ndi ugwu Na ndi ofe nwere Na ebe Anyi no - Isee!!!

      Delete
    5. @chinelo nwanne m,nara nsusu 💋💋
      Ibu ADADIORAMMA
      Chukwu gozie gi

      Delete
    6. @ANYAFULUGO
      Nwole oma
      Ibu dike eji eje agha
      Nna gi muru gi!!
      Okwu ikwuru amaka
      Ekwesiri ilebere ya bu Ife Anya
      Agbanyeru Na ebe m si,anyi adighizikwa eme ya
      Kelere m ndi be gi
      Alukwala m di
      Eji m umu ano
      Daalu nwanne m

      Delete
  3. Replies
    1. Ya kpotuba biko!! Amanda nwanyi oma,daalu ri nne.Asusu Igbo amaka.

      Delete
  4. MGBORURU....!STELLA OGINI BU NKA

    ReplyDelete
  5. End time things. Abegi they no dey carry all these yeye Nigeria languages go American.
    I think we should ban all African languages maybe we will stop lagging behind the rest of the world in terms of development

    ReplyDelete
  6. Amanda Isi gini? Chere kain kwa gi......errm errrmmm.....ana ma bia.

    ReplyDelete
  7. I can only imagine the speed Stella used in scrolling down and writing "Amanda dalu ooo." She nor understand pim.
    Amanda dalu nke gi.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hehehehe biko hapu Stella nwunye korkus aka ka ozuo ike

      Delete
  8. Stella wetin na. I must learn igbo for this life

    ReplyDelete
  9. Igbo wu igbo,ala owerri nwem ni.Alagham uyo m na ala owerri Christmas na bia

    ReplyDelete
  10. SDK onye asiri 1 of blogospher, anam ekele gi oo

    ReplyDelete
  11. Odiegwu, umu nwanyi Ana ekwezikwanu kita, fa na ebu uzo anu nwoke, kwabalu nwoke nuno,nnem hapu long gist, oorr na mgbe gboo ka inu nwanyi na ato uto,oburo kita,,,,,, ma ya diya, inu nwanyi bu ifeoma, mana ije ya eteka, bikoooooooo,hapu okwu, kam nuooo mmili togbo iko.errrmm, kedu sisi transformer, Clara ude,kedu nuu, errrm sapio,thelma,sage,kingsley,ezenwanyi,ndigbo kwezuonuuuuuuu

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwanne m hapu okwu, inu nwanyi ka na atokwa ezigbote uto ma oburu na gi na ndi be unu mara omenaala

      Delete
    2. Mba, umu nwanyi ani Igbo adighi eme otua. Obu umu nwanyi ndi ugwu, ndi ofe manu na ndi Niger-Delta na eme otua. Anyi adighi agbakuru nwoke.

      Delete
    3. Obu n'ezi. Umu nwanyi biko kwara onwe unu ugwu.

      Delete
  12. lgbo mma mma nu oooo
    igbo Amaka.......am proud to be an igbo.

    ReplyDelete
  13. Igbo bu igbo kwezue nu ooooo...

    ReplyDelete
  14. Amanda who are the ndi ugwu and ofe that should 'si e ba por'.
    I'm not poring anywia. I must pick the little i know,join it together and understand this write up.

    Ndi igbo kwezuenuuu eh!
    Ana me ekele oh. Hahaha iyanmi!

    ReplyDelete
    Replies
    1. LMAO 😁
      Shantelle Ana m ekele kwa gi o....
      O ga adiri gi Na nma...iseee

      Delete
    2. Hehehehehehehehe... the struggle is real.

      Delete
    3. Hahahahhaha.
      I can see you like igbo.
      Ngwa agam akponyegi otu ntolobia igb o

      Delete
  15. Warrisdis, every time man and woman discussion as if dats the solution to the problem in this country.

    ReplyDelete
    Replies
    1. E tire me oh. Every talk is man, woman and sex. That's why the western world is ahead of us....not forgetting food. Na wah for my people

      Delete
  16. It's pretty much the same thing in most Igbo cultures. Aga'm ede ya n'oyibo Maka na ike adirom ide as usual Igbo right now.

    The only difference in my part of Igbo-land is the Nwa ndu uzo. We don't do that middle-man thing.

    In short, I don't even know again.

    ReplyDelete
    Replies
    1. NNE biko suba Igbo,inugo
      Igbo amaka!!
      Igbaligo Na nke isuru

      Delete
  17. I Don't understand a thing biko nu.

    ReplyDelete
  18. Owu ya nnem, ikwuchala ihe nile.

    ReplyDelete
  19. Je ne comprends pas 😁😁😁


    ReplyDelete
    Replies
    1. Sonia pas du probleme si tu ne compris.

      Delete
    2. Biko o bu je ne comprend pas. Wepu the s. Ngwa kele m

      Delete
    3. Issorait 😀😀

      Delete
  20. No1 added me from yesterday's SnM ..wharis dis??

    ReplyDelete
    Replies
    1. Lwkmd!better luck next time...

      Delete
    2. Lol.. You were probably 1500th comment that Stella did not post.

      Delete
    3. Lmao! Dooh o

      Delete
    4. Lmao! Dooh o

      Delete
    5. Hahahahahahaha
      My belle oh

      Delete
    6. Lol ndo dear better luck next time

      Delete
  21. I'm just seeing nwoke and nwanyi everywhere. Hope its not otuocha and pleek matter sha? Anyways imela.

    Linda eze eyi m...kedu na the family?

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahahhaha. Try harder. You are getting clues.

      Delete
    2. 😂😂😂😂😂ajo ife Na aso amu.... Ndi be Anyi ndewonu oooo....

      Delete
    3. Hahahahahaha..
      Who is teaching this girl Igbo?...
      Shantelle,do you have an Igbo boyfriend?...
      Lmao...
      We are fine joor...

      Delete
    4. Lmao Lindodo. Cookies&creams is teaching me Igbo.

      Delete
  22. c as confusion take hit me.......beyonce hand for dem igbos oooo......

    ReplyDelete
  23. Onwere oyim Nwanyi Otu nwoke choburu ilu, insteadi nke nwoke ga aga n'iru gosi interesti ya n'ebe nke Nwanyi no, obido jueribe ajuju gbasara omume nke Nwanyi. Onye ogara n'ajuju wee wuru onye kporo nke Nwanyi asi. Onye ahu wee gwa nke nwoke na oyim Nwanyi amuola nwa n'ulo, wee tuo obere nwatakiri nwoke si n'ulo ha puta aka si na obu onye ochoro ilu muru nwa ahu mana omakwa na nwatakiri ahu bu nwanne ya nke obere. Otu ahu ka nke nwoke ahu si wee hapu onyim Nwanyi gaa luru onye ozo. Oyi m Nwanyi choputara ihea oge ya na nke nwoke huru mana by then nke nwoke jizi Nwanyi. Bikonu Ihe nkea odi mma? People dikwa wuked oh. Nke nwoke omeziri Ihe ojoo si ka ojuo ese. Chai. Ike agwulam oh

    ReplyDelete
    Replies
    1. Eeh yah...
      Tufiakwa onye mere nkea..
      NNE eh,Igbo gi a bukwa daachii..LMAO 😁

      Delete
    2. Ndi mmadu di njo. Ôtutu ndi mmadu ka na emekwa ihe a. Ihe m ma bu na ihe Chineke deere mmadu, onweghi onye nwere ike ihiche ya. Otum si hu ya, onwere ike oburu n'obughi nwoke ahu ka Chukwu deere oyi gi. Oga adicha mma

      Delete
    3. Nka bu Engili-Igbo ka ena asu ebea ooo
      😀😀😀😀😀

      Delete
    4. Nnem ihe ahu adighi mma, mana obughi uche chukwu na ha abua ga ebi di ka di na nwanyi, na uche akam O.,

      Ugbua abughizi mgbe amutara nwa nu ulo na anaghachi nwanyi ilu di.

      Ndi igbo mma-mma nuo, onye biri ibe ya birikwa nuo

      Delete
    5. The Nwoke di stupid. O by naani ofu onye ka a na ju ese gbasara nwaanyi a choro i lu alu? O kwesiri I ju I he di ka mmadu ato ma obu ano sef. In short, chineke e deroo na o ga lu oyi GI nwanyi.

      Delete
    6. Tufiakwa! Ndi Chukwu ga akpo oku kariri akari!

      Nke nwoke emero ihe ojo si ka ojuo ese. Onye mere ihe ojo bu that idiot gwara Nke nwoke okwu asi.

      Chukwu ga akpo that wicked idiot oku.

      Delete
    7. Odiro kwa nma. Ihe iju ase a, bu ihe Ma likeiri(lol), maka Ndi iro. But obu ome n'ala ndi igbo.
      Chai writing igbo is hard

      Delete
    8. Ah an! Ogini bu ifea?
      *cleans sweat*

      Delete
    9. Mana nke nwoke kwesiri ejiri akaya mara omume nke nwanyi,onwe ofu nwoke si na obulu na abiara jou ese Maka nwannem nke ntoro na ha gara imebi aha ya,ihea bu normal omume ndi iro na indi ajo obi na eme,oburo kwa na nke nwoke mere ihe ojooo ju ba ese,this days aka ana aju ese Maka ebe nnu di hei enwero time.

      Delete
    10. Kwakwakwakwa...
      Ezigbote engligbo!...
      Nkea ato mu iche!...

      Delete
    11. Chai ife ahu o mere adigji mma o

      Delete
    12. Akana aju ese nwanyi kita?nke nwoke nwe efe?afo talu some pple mmili...tufiakwa!

      Delete
    13. Okwa ya kpatara mjiri dee si na enwere ike ino ebe ana ajuju ihe mmadu aghoo ihe onye ozo.

      Delete
    14. Hey!!!! Ndi uwa! Chukwu ga gbo nwayi afu ike!!!

      Delete
  24. Biko onye ma otu esi alu nwanyi na ala ngwa, biko ya deputaram ya Na comment section. Lol I hope I got that right. Expecting your replies help a sister biko. Whoever started this segment may your pen never run dry. Keep it up Stella.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Onweghi ihe di iche. Owu otu ihe ahu. Nani na iga enwe ego. Ihe di iche bu na ndi ezi nwayi siri puta were Ike nwe akoluche na adi alucha nwayi alucha.

      Delete
    2. Nwannem nwanyi odighi hue ndi iche la huena odere. Ga ga juo ndi okemadu ezi unu.

      Delete
  25. Ndi yaraba, kam ji wanyo yenre unu aka. Ihe Amanda na ko wu 'bi won se fe iyawo ni Ile Igbo, Ile awon olori ire, Ile awon to rewa gan.

    OK, emi ni mo fi ibi ipare yen kun. 😂

    ReplyDelete
    Replies
    1. Eka i bu onye Igbo? E che m na i bu onye calabar

      Delete
    2. You try. Well done

      Delete
    3. Igbaliala. Jisike.

      Delete
    4. Eka Joy ega okwu fine,edara ewu.

      Delete
    5. Sabinus Eka, kedu mgbe ibidoro rachawa ike ebe a?

      Ha aga atugharikwara gi n'oburu ha?

      Kpachara anya gi!

      Delete
    6. Bia Eka ibu onye igbo😬😮?
      Echem nibu onye imi nkita???

      Delete
  26. NWAADA Amanda favour ,igbaliara Na ihe nke ideputara.itupiakwara ya rue Na isi.jisie Ike

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu nwanne m
      Ka anyi jisie Ike Na asu Igbo
      Asusu anyi amaka o....

      Delete
  27. Haha, Igbo amaka. Ndi banyi nma nma nu oo.

    ReplyDelete
  28. Igbo amaka.
    Abum nwa afo Awkuzu, ihe anyi n'ekele bu
    Awkuzu ekene m unu.

    Awkuzu adighi ekwe ekwe

    ReplyDelete
  29. Imere nke oma Amanda
    Igbo Amaka
    Igbo asusu eji eje mba

    Otu esi ALU nwanyi n'ala anti bu Isiala Mbano bu; nwokorobia ahu ga abia na nke ndi ogo ya gwakwa ha echiche ya ebe nwa ha nwanyi no na ihe butere ya.
    Nkea ka ana akpo mmaya iku aka n'uzo. Tupu ya lawa, ndi nwe nwa ga enye ya list ihe ndi o ga azuta eji eme ihe nwanyi, ufodu n'emekwa nke ha na ego.
    Mgbe o ga abiaghachi ozo, o ga akopro umu nnaya bia kwuo ugwo isi nwanyi na ihe omenala di na elu ya. Mgbe ahu Nwunye nwesiri like iso ya lawa n'ulo ya.
    Mana, oburu na ha chorosiri ime ihe ndi ulo nzuko na agbo agbama akwukwo nke di oyibo n'agbo "marriage". Di na Nwunye ga akapsi ofuma maka na nke ahu diri ha abuo ikpebi.

    Mama ka omenala siri diri, nwoke kwuo ugwo isi nwanyi, mee ihe ufodu omenala di na ya. Nwanyi ahu buzi nke ya.
    Udo diri unu umu nnem
    Onye nwe anti gozie unu, gozikwa ala Igbo nile na ala Nigeria
    Iseeeeee!!!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Iji ya nne!
      A Na m achiniri gi aka elu nwanne m 🙌👐🙌

      Delete
    2. Ndewoo nnem😄😄😄😄

      Delete
    3. Zion baby. Ya na iwu Ada otuocha?

      Delete
  30. Igbo amaka. even though I didn't read it. Don't know how to read igbo. #proudly igbo #igboforlife

    ReplyDelete
  31. I can't read pls. Someone should summarize abeg

    ReplyDelete
  32. Amanda favour Ndewooooo, ewu nwa affor, chukwu gozie GI omalichia,hahaa hope I try

    ReplyDelete
  33. O kwa i na-ede Igbo? Gini bu LMAO na asusu Igbo?

    ReplyDelete
    Replies
    1. Kedu ebe BV Arab Money nor? Okwa osina ona achor ndi Enugwu 'Akidi',Okwa okwu ka nna achor Enugwu Agidi,Arab Money afa gi Abu Onyeka?kuo ekwe ka ndi bu unu putawa

      Delete
    2. LMAO-ochi ato mu lou na ikem,hahahahahaha

      Delete
    3. Ochi ewulu Ike m oku!

      Hahahahahahahahahaha

      Delete
  34. Hahahaha.. I didnt read.
    Amanda baby, meere anya m ebere... Okwa oburo otu na amu matter be dis?

    ReplyDelete
    Replies
    1. Chy...hahahaha
      Nya I maro edee Igbo?

      Delete
    2. Eeeh yi! You are very correct.
      But why are you now saying they should mere ebere your anya,i thought you are Igbo.

      Delete
  35. My Ebonyi sister
    #proudOnichaIgboezegirl!

    ReplyDelete
  36. Ka esi ALU nwanyi n'ala Igbo di niche niche ma burukwa ofu ihe. N'iche n'che na etu esi ebu mmanya nakwa ihe ndi ana eweta. Ofu ihe maka na nwoke ga akpo umu nnaya gaa ebe nke umunna nke nwanyi. Ndi obodo abuoa, ga ezuko, kpaa ma kwekorita na emezugo ihe achoro. Ya mere, onye luo nwanyi ka esi alu n'ala igbo, mmegbu anaghi adi nnukwu n'ihina ndi obodo ga etinye anya hu na nrugbu na mmegbu adighi(at least nnukwu) n'etiti di na nwanyi. N'ala igbo, nwoke luru nwanyi, umu nwayi ndi ozor na akpoya dim, umu nwuke ndi ozor n'akpo nwanyi alu alu nwunyem. Obughi na ha na eriko bonkiti, mana obu na ha na enye aka hu na mmegbu na nrugbu adighi na etiti di na nwunye. Ya mekwara alukwaghim anaghi adi nnukwu. Onye si na ndi nwanyi na aluzi nwoke ugbua amaghi ihe ona ekwu nihina na ala Igbo, nwoke obuna nwanyi luru na eri akpulonu n'obodo. Ogaghi enwe ugwu n'ebe ibeya no n'obodo.

    ReplyDelete
  37. Amanda, udo diri gi Onyenkuzi omenala Igbo. Umuigbo nile, iheoma ga eso unu nihu sokwa unu na azu. Ya gazie.

    ReplyDelete
  38. Ndi oma ekele m ooo oliasa gozie unu ooo

    ReplyDelete
  39. Ndu mmiri, ndu azu. Obu su ndi mara igbo gaa ekwu okwu ebea. Ndi nne kuziere umuaka unu asuzu igbo biko. Ka omenala anyi hara i nwuawu.

    ReplyDelete
  40. Usoro Alu m di na nwanyi na ngwa.
    -----------------------------------------
    1) Iku aka n' Uzo:
    Nke nwoke na ndi ulo ha ga eji nmanya ga n' ulo nke nwanyi ga hu ezi n' ulo nke nwanyi. Nna nke nwanyi ga anara nmanyi ahu, wee gwa ndi biara n' ulo ya ka ha lawa.
    Eme cha, nna nke nwanyi ga ezi ozi ma oburu na Nwa ya nwanyi na batara ilu nke nwoke.
    2)
    Ina list maka alu m' Di na nwanyi.
    --------------------------------------
    Mgbe Ozi ruru nke nwoke nti na nke nwanyi anabata go ilu ya. O ga nachite, bia rio nna nke nwanyi ka onye ya list. Nna nke nwanyi game asi ya lawa ka O ga nata ndi ichie list alu m di na nwanyi. Nke nwoke ga eji obere ego wee nara di list.
    3)
    Ime ihe di na list
    ___________________________________
    Mgbe nke nwoke di njikere, O bia mee ihe edere na list. Ya na ndi be ha ga eso via mesie ihe ndi edere na list.
    O mecha ihe ndi edere na list, ya na nwanyi agba nkwu.

    ReplyDelete
  41. Ya mere, gi bu onye na acho ilu nwanyi na
    ala Igbo, I hulanu ihe o ga ewe gi. Ije oma ooo

    ReplyDelete
  42. Umunnem Anyi ga Adi ooo.... Ibiri kam biri.....onye azona uwa azo,Na uwa ga abata onye obuna.
    Ka Anyi jisi Ike Na ife obuna Anyi Na eme, tinye ya Na ekpere ka Eze chiteoke nwa abiama nyere Anyi ka....

    Daalu nu oooooo

    ReplyDelete
  43. Mschew.....biko achom ila otu....

    ReplyDelete
  44. Ihe nke a a sogbuo m!

    Amanda, daalu!

    Umu igbo, o ihe ziri ezi na anyi ga naa su asusu anyi ka o ghara inwu!

    Igbo kwe nu!

    ReplyDelete
  45. I seem to be the only non igbo here. Other bvs left? Lol
    Well..lovely language.
    I'm outtie#
    Ya all continue with the fun.

    ReplyDelete
  46. 😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒😒

    ReplyDelete
  47. Ogini kwakwakwakwa 😁 😁 😁

    ReplyDelete
  48. Anam acho umu asa mara mma si Anambra,onwelu umu nwannem si ka nchota raha Nwunye,otego nji nwanyo na ekili onyeowuna na ime uno Blogga,kam ne ekili kwa,biko umu asa na aputa nu ebe, owulu godi na oburo Anambra ki iwu, agwa gi dim mma,mme ka unu malu, Umunnem na Blogga Ekenem unu ooo.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Bia kpachala anyadike gi ooo, siya anom ebea!!! Okwa oji ego ne'sisi??? Achokwahamu ita Aku na ukwa...

      Delete
  49. Ihe'a idere di nma Nwaada Amanda. Otua ka esi eje ije di, mana odi iche-iche.

    N'ala Owerre nsi puta, anyi nwere - mmii ajuju uzo, mmii ishi-ewu/nkaleshi na mmii ukwu. Kam ti nye obere ihe na nke ndi Owerre. Nwoke nwere ike kporo mmadu abuo bia n'ulo nke nwa agbogho'ahu, bia hu ndi muru ya ka ha wee ha zie otu ije di g'esi ebido. Mana tupu nke'a eme, ndi nke nwa-agbogho ahu ga edinye ndi mmadu ka ha ga juo ajuju gbasara nke nwoke-ahu.

    Igbo amaka.
    Biko ndi Igbo BVs na akuziri nu umuaka nnu ASUSU IGBO.

    ReplyDelete
  50. Idim-nkem... Lol..I m delta ibo tho.😀😀😀

    ReplyDelete
  51. Idim-nkem... Lol..I m delta ibo tho.😀😀😀

    ReplyDelete
  52. O na adinma ka anyi noro na udo
    Wee kwa ihunanya ebe ndi ebe anyi noo
    Maa anyi obu ndi-ugwu, ma onyi obu ndi-ofe mmanu. Anyi niile bu ofu Nigeria.
    Ihunaanya bu ihe ga enyere anyi aka na obodo anyi

    Achokwaram igwa umunnem na anya ufu adiro nma. Kama anyi ga ana emebisi, ka anyi na akpakolata ihe onu. Ihunanya ka anyi ji agafere na uwa.

    Ekuwa okwu alumalu di na nwanyi
    Mgbe gboo, mgbe umuada were ara peke peke, oburuokwa ugbua, ara umuada daachara daa pii. Amam ekwu mgbe gboo, nwoke fuu nwanyi owere ihunanya gbasara, ya gaa na'abe nne na nna ya kwuo aka , gwa ndi beya na ofula out mkpuru chara acha ochoro igho. Nwanyi agaghi ekwu fim, nwanyi agaghi kwanu achu nwoke. Kita nuwa, nwaada noro na abe ya na ona eche nwoke ga akwu aka, o ga anokata chi ejie, chi abuo kama ogaghi afu otu mkpuru nwoke ga atupuru ya onu. Umuada na agba zi kwa mbo eme ka nwoke mara na ha ka no ya.

    Eeehm, odikwa kam kowaziri hapu ihe ajuru.

    Achoro m isu na asusu Igbo biko.
    Maka ndi ahu na eme kafa amaruo asu Igbo...daalu na asi ina asi. Gwa m ka owere onye ga akuru gi aka na imaghi asu Igbo?

    Unu noro nke oma.

    Amanda, Chukwu gozie gi nwanyi oma.


    KING XOXO MYSTERY

    ReplyDelete
    Replies
    1. Xoxo 💋
      Chukwu gozi kwa GI
      Ada eji eje mba

      Delete
    2. Hahahahahahahahahaha...
      Xoxo mystery egbuolam!,,,
      Isi na ala umu ada dachara daa pii...
      Kwakwakwakwa...

      Delete
    3. Iji okwu!!!!! achalugo nwanyi! Okwaya kam hi ekwu maka gi!!! Amamife nkegi puru iche!!! Iwu exigbo nwafo ibgo ji eme onu!!!

      Delete
  53. Umu igbo ibem, ekele m unu! Asim kam zaa otu anonymous juru ajuju wee si, gini bu LMAO n'igbo? Ihe Obu n'igbo bu ''Ochi atopum ikem''. Nke a abgughi okwu inugo? Amanda nwanyi oma, Chukwu gozie gi, nmaji puru nmaji, gozikwa umu igbo nile. Igbo Amaka. Suru nu gaba umunnem...

    ReplyDelete
  54. Nwanne m nwanyi Amanda Favour,I gbaliala nke uwku na ihe a i deputara maka alum di na nwunye na ala Igbo. Ihe i dere a dighi kwanu iche ebe usoro nke anyi di .Kama otu a bu usoro e ji alu nwanyi na Owerre:
    I ju ese
    I ku aka
    Ije Abali ano
    Mmii Ajuju
    Ije Abali Asato
    Mmi Shiehu na Mmi Eziokwu
    Ego Nfotu ite
    Ego isi aku nwanyi
    Mmii Ukwu(Ihe nna,nne,umu nna,mgboto(umuada),ezi i.e kindred,community,oha i.e elders) dgz

    Kama ka m tinye onu na okwu a n'ihi na agbara ohu ka anyi nozi na ya.Na mbu,nwoke hu nwa agboho o choro ilu,o bido i ju ese ya,o juta ihe obi ya nabatara, o kporo umu nna ya, jekwuru nne na nna nwa agbogho ahu je gwa ha ebu m n'obi ya ebe nwa ha nwanyi no mana oge agbanweela,ya mere taa,nwoke hu nwanyi o huru na anya ma nwekwa nmasi ilu ya,O ga agba mbo kowatara nwa agbogho ahu ebu m n'obi ya.Ha abuo ga e nwekwa nghota tupu ha agwa nne na nna ha. O diri nna nwa agbogho i kowara umu nna ya,ndi ga ekpebi ubochi ga adi mma i nabata ndi nke nwa nwoke a choro ilu nwa ha. Anyi anaghi alu nwayi ubochi nkwo ma o bu eke,nani orie na afor ka ana alu nwanyi na obodo anyi. Ozo, anyi anaghi akpo ya igba nkwu,anyi na akpo ya i paa mmi ukwu.Aghotara m na mbu,anaghi eme nnukwu emume ka o di ugbu a kama nwoke ga azutacha ihe nile ndi nwe nke nwanyi gwara ya zuo.

    N'oge ohuru anyi a,nwoke nwere kwuo ugwo nile otu mgbe i ji belata oge alu m di na nwunye na ewe.Umu nne m ihe kariri…Igbo amaka. Ekelere m umu afo Igbo nile.O ga adiri anyi mma na aha Jisos onye nwe anyi…Amin

    ReplyDelete
    Replies
    1. Otua ka odi Nwannem.
      Agbara ofuu emebichego ufodu omenala.

      Mana isikwam kwuo. Agbara ofuu adichakwalu njoo otu afu maka na ogologo Oge di na ufodu omenala.

      Ème Ngwaa Ngwaa emeghara odachi tupu ihe mmadu aghoo ihe onye Ozo.

      Delete
  55. AMANDA FAVOUR nwaanyioma daalu, Olisa bi n'igwe mee gi nma. N'eziokwu Igbo amaka bikonu dodo k'anyi gbalisie ike mee k'asusu Igbo kwuru chim. Ndewonu BVS ibem unu anwuchula.

    ONYI WAS HERE

    ReplyDelete
  56. AMANDA FAVOUR nwaanyioma daalu, Olisa bi n'igwe mee gi nma. N'eziokwu Igbo amaka bikonu dodo k'anyi gbalisie ike mee k'asusu Igbo kwuru chim. Ndewonu BVS ibem unu anwuchula.

    ONYI WAS HERE

    ReplyDelete
  57. Replies
    1. Must you comment on all post?

      Check the next pls

      Delete
  58. Umunnem ekene mu Unu nke Onye chiri nya zeru. Emmm asusu Igbo Amaka
    Onye o bu na gba mbo n'asuru umu ya igbo. Emmm ka m buru ukpa ekenem jere nwada dere edemede a ka obasi bi n'elu gozi gi, dude gi o ka cha si na usoro a isi we kwalite asusu anyi.
    NWA DI TUCHU (CHAPURU ACHAPU) EKENE GI

    ReplyDelete
    Replies
    1. Okwu gi kwu oto ka siga!...hehehe
      💋💋
      Daalu nwannem

      Delete
  59. ebe obuna i huru m kpoo m "onye igbo" n'ihi na IGBO AMAKA ooh. nwada Amanda daalu rie ne maka ihe odide gi ah. a huru m ya n'anya nke ukwu. Asusu igbo e ji eme onu. Umunnem ekele m unu oo.
    Bv Empressitta

    ReplyDelete
  60. Bikonu LMAO n'asusu igbo bu .... Achipulam ikem.

    ReplyDelete
  61. Hahahha.
    Nwada Adanna, imeru Nke oma.

    Ihe ndia nile ideturu bu ejiri mara alum di na nwanyi na ala igbo. Okw otua ka ndi banyi si ème Nke anyi.

    Igbo Amaka Nnem.

    ReplyDelete
  62. Amanda nwanyi oma, imeela nke ukwu. Obi juputara m na anuri otu otutu n'ime anyi si mara asu ma n'edekwa igbo. Udo diri unu nile ma dirikwara m. Ihe di iche na etu esi alu nwanyi na nke anyi na nke unu bu soso "onye etiti" (middle man). Anyi enweghi ihe di out ahu. Daalukwanu!!

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141