Stella Dimoko Korkus.com: NRI DI ICHE ICHE ANA ESI N'ALA IGBO.

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, October 24, 2016

NRI DI ICHE ICHE ANA ESI N'ALA IGBO.

IGBO KWEENU.........YA!
IGBO KWEENU...........YA!
IGBO KWEZUONU..........ISE




Umunne m ekele kwa mu unu.
O ka bukwa nwanne unu nwanyi bu B.V Amanda favour na-ekwu.
A choro m ka-anyi kparita uka gbasara nri di iche iche a na-esi n'ala igbo anyi.
       Ututu unyahu,ka m siri nri a na-akpo ACHICHA EDE na FIO-FIO.
A ga m akowa ugbua ka m siri sie ya,maka ndi amaghi maka ya.


IFE EJI ESI YA;
1. Achicha ede
2. Fio- fio
3. Ukpaka
4. Mmanu nri/igbo
5.ose
6. Yabasi
7.maggi/okpeyi/ogiri
8.isha 
9.nnu.

ETU ESI ESI YA;
    Hochasia fio-fio gi ofuma,sacha ya na mmiri were sinye ya n'oku.
Suo achicha ede gi , tinye ya mmiri,kechie ya na-akwukwo,tinye ya n'ime ite ahu i sinyere fio-fio.
I ga-esi ya rue mgbe odere ofuma .
        sinye ite ozo n'oku,tinye ye mmanu ofuma,mgbe mmanu ahu di oku,tinye yabasi ibiere ebe,ose na isha ikworo akwo,maggi ma obu ogiri ñ'ime mmanu ahu.
   osuo ntakiri,itinye fio-fio na achicha ede ahu isiri n'ite ozo n'ime ya.
Iga etinye kwa ukpaka, were tuharisia ihe n'ile n'ime ite ahu.
Nri anyi eyekwala.
     umunne m okwanu etu a ka m si esi nke m,i nwekwara ikowara anyi ka isi esi nke gi,ma obu gwa anyi nri unu n'esi na obodo gi nke anyi na-amaro.
Umu nne m ka odikwa nu

Daalu!!



*Dalu ooooo...Chai,o ga di sweet well well....anom na bed,ne che sunshine



198 comments:

  1. Noted.. just feeling lazy commenting tday.

    ReplyDelete
    Replies
    1. I hate this food ehennnnn! U need to tie me down to even b ard where is made. D smell of that shyt 😡

      Delete
    2. You know this Anon. Very very somehow food.

      Delete
    3. I'm not sure u guys know what u are saying, the only smell u perceive when this food is been cooked is the smell of the onions been fried in red hot oil. So pls check again if it's Achicha or something else.

      Delete
    4. Kedu ihe bu achicha na fiofio? LMAO. I just asked my hubby, and he burst out laughing. I have a flu, too lazy to read comments.

      Delete
  2. Replies
    1. Hahahahaha.. Stella with her Igbo and she wrote it well.

      Achicha ede na fio fio adighi
      amasim.
      Ndewoo Nne@Amanda.

      Delete
  3. Ochi atopu m Ike....hahahaha
    Stella Ife Ina asu bu. Engligbo

    ReplyDelete
    Replies
    1. I've never tried it neither do I like any form of beans.lol, but i see it made into Beans and yam porridge whenever I visit Enugu or awka

      Delete
    2. Fiofio! E siwe eghe eghe. Nri a na-afu m ka ose.

      Delete
    3. Chai,Nwa ada Amanda,I bu ezigbote nwa afo Igbo a musiri ike.Achicha na fio fio bu ezigbo nri ndi Enugu.Ya bu nri n'edozi aru nke oma.I nweta onye mara ya esi nke oma,o n'atobi mkpuru aka.

      Daalu nwa ada Amanda,maka ka isi tapia ya bu asusu Igbo ofuma.Chukwu gozie gi o.

      Delete
    4. IVORY stop denying you are not Irene Bernards it is clear did you read what you wrote? Smh

      Delete
    5. Achicha na ede bu ezigbo nri Igbo na edozi ahu. Ndi nne na nna kwesiri ka ha kuziere umu ha nri ndi ahu ha jiri too ma mekwa ha ka ha mara etu e si esi ya bu nri. Nwada Amanda i mmela were kuziere anyi nri uto nke a. Ka Chineke gozie gi

      Delete
  4. Okwa nene Ada bu ibu!

    Unem Ndee? Ima maka ofe mpoto?

    Mana adirom alike fio-fio.

    ReplyDelete
    Replies
    1. NNE eeh,a burokwa m onye nsukka.
      Okwa nne m ochie kuzuri m ya

      Delete
    2. Kedukwa nke bu ofe mpoto? Unu ga egbu mmadu lee. Taata ka anyi ga ama ndi bu ndi Igbo na ndi mama fa gwalu na fa bu ndi Igbo.

      Delete
  5. Replies
    1. I ate it ofuma mgbe mu ka na agu akwuko na mahadum bu UNEC...

      Delete
    2. Thatigbobabe....Nya I bu Lioness?
      Biko bia ka anyi wee 2 aside!

      Delete
    3. Thatigbobabe...okwa na nke mama ada no na adelabu

      Delete
  6. Replies
    1. Ukwa bu kwanu nri mu ejighi egwu egwu.kuterem obere kam rie biko.

      Delete
    2. Ofe akwu na ofe onugbu ahu bu nke m nga eri biko
      Nne gwam na ishicha kam bia rie

      Delete
    3. Chai,Ukwa a gugbuo m.Kedu ebe I si gote ukwa n'ala ugwu a bu Abuja?Biko,tupenye azu ka m jee gotekwa nke m.

      Delete
    4. Soso gi? Inwero nsogbu. Okwa Onitsha ka ino? Banye Ose okwodu na Ochanja golu ife icholu.

      Delete
    5. Lucille Biko gwanu mu ebe ibi. Ka mu bia lie abacha Na ukwa. Choi!
      Igbo amaka o!

      Delete
    6. Ihe nile a ka ichoro ishi ugbu a. Biko Ina eshi nri canteen?!
      Achoro m iri ha. Nye m ntuzi aka ebe e bi ka m bia.

      Delete
    7. Ok,anugom,nsichaa mma okpo unu.
      Sassy Echem ma ana ere ya na utako mkt.nkem na esi bu na east ka esi sendia ya mana ichokwa,ngo enyegi maka oburu ibu

      Delete
  7. I love that achicha so very much!!;the one wey pepper full well well.
    Biko onye GA akuzirim ka e si esi ayaraya oka,igbangwu na ayaraya ji!!!
    I miss Nsukka mehn.

    ReplyDelete
  8. *salivates*

    Odinma o.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Wooooooooow

      I recall I used to eat this diet when I was very tender sha




      My mum used to make it when she was alive





      I am just missing my mum all over again



      Delete
  9. E'mechala? Okay, kam mburu oche nkem.

    ReplyDelete
  10. Poster this your achicha no too dey salivating like the one Nsukka ppl cook.

    ReplyDelete
    Replies
    1. NNE m biko a buro m onye nsukka.
      Ihe ozo bukwa Na mmanu m foduru obere mgbe m siri ya

      Delete
    2. Amanda Biko....kedu Ihe I tinyere Na ite fiofio Gi?
      Asin what did u add to d fiofio while cooking it?
      Biko gwanu m....my husband likes fiofio and I can't cook it.

      Delete
  11. Lol @ Oga di sweet well well.

    I tried reading, but my eyes...

    Biko, is fio-fio not supposed to be periwinkle? I don't know, but that's what my grand-mum calls it.
    Akidi... the food pic up there looks like Akidi.

    Biko ama m ihe unu na ako.

    Proudly igbo. *tongueout*

    ReplyDelete
    Replies
    1. Fio fio periwinkle???😒😒😒
      Proudly nwannem nawanyi🙌🙌🙌🙌

      Delete
    2. Olodo, u don't know periwinkle Is a sea food? Fiofio is dry akidi seeds aka agbugbu.

      Delete
    3. Anon wey dey call person olodo,fiofio is not dried akidi oo.Fio fio comes like beans when dried while akidi can be eaten with its pods when stil fresh and can also be cooked without the pods.Akidi looks like beans while fiofio looks like soybeans.

      Delete
    4. Periwinkle is that greenish thing used in preparing afang soup by the southeners.I know we call it "isam" in Igbo.Don't like it though,tastes like sand in my mouth.
      Fio fio is different from Akidi and also different from beans.Very nutritious.

      Delete
    5. B&G, isi na gini mere? Periwinkle kwa? hahahahaha

      Delete
    6. Hahahahahahaha....

      How do I explain this!

      Ok, erm... I know periwinkle is Isam. I grew up in the south and I eat it in every soup *no thanks to my mum*

      What I meant is that my Grandma calls Periwinkle fio-fio. That's the first and only time I've heard about it. Una grab? *kisses*

      That pained anon 13:45, why is your body pinching you? Did I steal ur boyfriend? Lucky you didn't use your ID and I'm in the best of moods. Take your frustrations to Buhari or you go and select beans!

      Delete
  12. Chai!
    Nnekwa nni m ooo!
    Ofu ezi enyi m bu onye Ameche Awkunanaw.
    O bu ya kuziri m nni a!
    Ana mu esi ya ncha! Choi!
    Ichoro inweta Nni a,gote ezigbo mmanu. Ife ozo bukwa Yabasi. Na ose. Abu m onye ose.
    Chai! Nri a aguoo mu Iche kita!
    Enwere Ife ndi ozo,Mana obu ebe mmadu ga enweta ezigbo achicha bu nsogbu. Ana mu eweta Nke mu Na obodo.

    Akara m Isi ka mu Jee Mara Na mu aga afu achicha na afia mana enwere mu nsogbu.
    Ana mu alu-ukwu eri Friday. Chai! Eji m otu lagbuo onwe m. Eri ubosi afu,ana mu Aru ukwu.Ebe obuna m galu,ana ene mu Anya,ndi mmadu ana asi mu ndo.
    Ana mu akwado ka mu jee Ulo ogwu. Na ona ifele Na-eme mu. Kedu Ife m ga agwa Dokita Na obu ya mere mu? Ochi atogbuo mu o!!😂

    Ekenee mu onye dere Edemede a.
    Nne isika o!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Biko ebee ka I no? Ka m bia Richa ife obuna a chorom

      Delete
    2. Chai, unu eluo unu o. Amanda na Stella Chukwu gozie unu. Agam ede maka ofe ora na ofe nsala. As Ada Anambra mbu, Ighotago. KEdu ebe Linda no.

      Delete
    3. Laba nu otu nu.nne ndi otu.obele Oge idi ime.na erI amu ka fiofio.ifuro ka onu gi di ka otu

      Delete
    4. Choi!
      Nwunye G
      Ife ntinye na-atokwa gi ncha
      Ndo,dibe ya...hahahaha
      Oto m ,egbu m...hehehe

      Delete
    5. Haha haha...jisike na ara òtu, Otu ubochi iga enwe permanent k-leg. Onye akwamiko dika gi. Ka chineke mere gi ebere!

      Delete
    6. Oh no! Lmaooo. I really should learn how to write and read in Igbo. I can't. Understand more than a few lines at a given and I'm a frigging igbo girl.arrrrrrgh!

      Delete
    7. Incase you don't understand Igbo. The General wife said she likes this delicacy a lot. Her hood friend friend from Awkunanaw in Enugu State thought her how to cook it well with plenty oil and onions.
      Meanwhile she has been limping since Friday and getting ready yo go see her Doctor, her hubby fucked the hell out of her pussy thus weekend in the process her leg got dislocated. Everyone telling her sorry and she is feeling shy.

      This SDK blog. Interesting blog with crazy characters
      *laughter*
      Carry on the you got fucked by hubby you didnty cheat. Go stretch your leg.

      Delete
    8. Kedu ife igwara umu gi kpatara iji alu ukwu?
      Ila otu aburokwa nri nwanyi a

      Delete
    9. Chaiii, nwanyi a, isi gbalilu gi final. Biko, gwa dokinta si na o bu otu mere gi ihe n'eme gi. Udiri nke a di allowed, o buro otu nzuzo.....LMAO.

      Delete
    10. Chai anoni,onye sigi kowa ihe okwuru na asusu igbo.ahia imaro ona azukwa na village gi?

      Delete
    11. Lmao @ E jim out lagbuo onwe m....Hahahahahaha.Pele

      Delete
    12. Hahahahahaha!

      Ochi atogbo mu oooo!
      Nwunye G, isina imere gini?

      Nne biko jirikwa nwanyo n'efeghari n'elu akwa, tupu nwanne anyi nwoke G, eweru ebubedike ya dupia gi akpa nwa.

      Jisike nne. Onwero ihe n'eme.

      #WhiteDiamondOut

      Delete
    13. Hahahahahahahahaha...
      Nwunye General isi na iji gini lagbuo onwe gi?...
      Kwakwakwakwa...
      Biko di gi bu General jiri nwayoo...nya agbaji kwana gi ukwu bikokwa!...

      Delete
    14. Ina ala kwa nno otu ofuma. Ndo.
      Mana I ga ejisike ga fu dokinta gi anya.

      Jirikwa ya nwayo unu ala gbuo mmadu ebe. Aka m di kwa single oh.

      Delete
    15. Bia nwunye General, irapulu otu iga ala laba ukwu? Keduzi nke ukwu na egbu gi mgbu? Itogbuom na amu ebea. nee ka ndi mmadu si enem anya na uno olu ebem na agu ederede gi achi so ochi.

      Delete
    16. Ndi nke m,Dalu nu so!

      Ka anyi nwebe anuli!
      Uwa bukwa nu ofu mbia!

      Delete
    17. Ndi Anuri!
      Nna mehn otegokwa m laa otu o!
      Chai....dim anoro nso! Konji ji kwa mu bad!
      Linda.....kedu ife m ga-eme Nya bu ife???
      Nwunye G....Biko nwe b'anuri!
      Odi allowed!

      Delete
    18. Anon
      Okwa ima na ila otu aburo nri!...
      Jide onwe gi aka ma obu I choo ezigbote nwada di nma gi na nya ga na eme supe...
      Supe ka nma maka na oria nmekorita Nwoke na Nwanyi erikazi na obodo anyi a...

      Delete
  13. Lolzz,, u r very funny Stella

    ReplyDelete
  14. Looks good.
    Eribeghim this fio fio before.

    ReplyDelete
  15. Enough of all these yeye Nigerian languages.
    Africa should embrace modernization , science and technology and let go of all things that hold us back eg our own language and primitive cultures

    ReplyDelete
    Replies
    1. Isigbuo onwe gi. As if you dey throway your local dialect.

      Delete
    2. Carry your bitter kola heart out of here!

      Two faced jobless man, living on a blog.

      Ejekwana choo ife iga alu.

      Delete
    3. Is it a must to comment? Better skip the post if you have nothing meaningful to say! Peacemaker ko, trouble maker ni.

      Delete
    4. Fuck off! Na jealousy go kill you... China with all their civilization still speak Chinese language. Prodigal son like you! Onye iberibe!!

      Delete
    5. Ogini na eme nwa amadi a?...
      O dika aguru adi ya na aru nkea o na eri ahu ya uka...

      Delete
    6. Lame!so those that embraced science and tech did not have language?omo ale jati jati

      Delete
    7. Otolo na enwero nne na nna gbalie ishi ebe ahu. Anu ohia

      Delete
    8. Peace maker I bu ezigbo onye ara. Onye obi akpo. Ekwensu kpokwaa gi oku. Buzz off osiso, ndi nwuru anwu na-aga ije. Ewu awusa. #proudlyanambra#

      Delete
    9. Anon 13:25 Please do u hv any job u are not using at d moment? Help me pls Thanks in advance

      Delete
    10. Hmmmmmmmmmmmmm!!!
      Truth is always bitter. Africa dark Continent

      Delete
  16. eribem nka.. ihe anyi na eri na ala Igbo kanku
    Igbo amaka

    ReplyDelete
    Replies
    1. Eziokwu, Anyi nwere nri. E misilim Ala Igbo maka chi. Onwere nke ana akpo akidi, haa, heaven on earth.

      Delete
  17. ihe na agu mu bu isi ewu ma obu nkwobi were nkwu ocha patuo ya.

    ReplyDelete
  18. Hahahaha...
    Nwada Amanda,imere nke Oma...ka ma na ihe ndi Igbo na akpo fio fio bu agbugbu!...
    Nri gi a adiro nma na anya nwanne m nwanyi!...
    Gba mbo ka itinye nya bu nri mmanu ofuma ofuma make mbochi ozo!..

    Mu na ndi bem ejiro nri a egwu egwu!...
    Nri ozo na amasikwa mu bu nke ana akpo akidi eji abacha gwo!...
    Nke ahu na ato m gwo gwo!...

    ReplyDelete
    Replies
    1. Queen, Biko Onye ebee k'ibu?

      Delete
    2. Queen biko i bu onye Ngwo n'Enugu State maka na ina asu asusu ha site n' nkowa gi

      Delete
    3. Nne mo. Onye eji eje mba. Otego m na eche ka ikwuo okwu.Nne mana idi egwuo, inokwu ebea fu na nri ya adiro mma na anya? Ochi atogbuom. Nne akidi a na agusim ike. Afuberom nke di fresh na Lagos a. Igbo Atoka.

      Delete
    4. Daalu nwanne m
      Mmanu m foro ntakiri mgbe m siri ya

      Delete
    5. Linda ibu onye wawa? Maka na Abacha na akidi bu nri ndi ala obodo Enugu.

      Delete
    6. Mba Linda na asu udi. Loyalwify ibu onye ngwo?

      Delete
    7. Hahahahaha...
      Anon,Loyalwify na Elastic..
      Abum onye Anambra steeti mana amuru m na ala Enugu!...
      Mgbe anyi na eto na Enugu,anyi nwere ndi agbata obi bu ndi Awgu,Udi neke achime,Eziagu Nya na Nsukka!...
      Nwoke izizi mu na ya mere enyi Nwoke na enyi nwanyi bu onye Achi di na Oji river...
      Ezigbo enyim Nwanyi oge ahu bu onye Nkanu!...afa ya bu Onyinye mana ndi be ha na akpo ya "oyiye"!...

      Mu na ndi wawa di ka ji na mmanu!...
      Ahuru m ha na Anya nke Ukwu...ife ha na amasim...

      Adadioranma,Akidi oyi adiro na obodo a..nke m na eri bu nke kporo nku Esi na ahia ogbete Enugu zitere m Nya na achicha ede!...

      Delete
    8. Queen o, ezigbote Oyiye. Imanno kafa si akpo. Okwa obere ife ka iji gbanari ibu onye Wawa. Kam gwanu ndi uno kafa zutaram akidi kporo nku. Mana kedu ka esi esi nke kpolu nku?

      Delete
    9. Ada,
      Ana mu ejikari abacha agwo nya bu akidi...
      Ufodu na eji ji...mana abacha tokariri...
      I ga eji "pressure cooker" sie nya bu akidi o dee edee nke oma...


      I yee yabasi gi na mmanu,tinye ya ose kporo nku eji agwo abacha na crayfish...
      I ga eme ka crayfish tuo Nya bu nri nke oma...
      Crayfish ana akwoghi akwo...
      Itinye knorr na nnu...
      Echezokwana iji mmiri Oku di ghari ghari sachaa abacha gi tupu I tinye ya na ime ngwo ngwo ahu iyere eyee...

      Yee abacha ahu nke Oma tupu itinye akidi...
      Gwokorita ha ncha nke oma Tupu igbanyuo Oku!...

      Nri na aka Uto ma oboo chi!...
      I dakwa ya na Oku mee ka oretu obele Oku na ite....

      Delete
    10. Biko Adadioramma na Linda kedu ebe unu bi na Lagos? Kam bia na ngwucha izua bia rie ezigbo nri Igbo esiri nke oma...ife unu na amasikwam

      Delete
    11. Lily nwannem oga abaragi. Dalu maka nkowa gi. Agam eme ya na ngwucha izu.
      Elastic dalu rinne, ebim na Surulere. Idi nkwadebe imee kam malu.

      Delete
  19. Mua eweghi IKE iji esi fio. Ka ma ihe nma bu otu esi eri ya 😁. Ndi enugu Ma otu esi esi fio fio. Mgbe ahu mu na'aru otu Na UNTH, onwe nwanyi n'esi fio fio a Na uzuaki final! Aha ya bu "idi okay". Chai anam e missi UNTH..

    ReplyDelete
    Replies
    1. Unth achicha Bu remix ya...Jee rie nke ana esi na Nsukka

      Delete
    2. Erikata kwaram agbugbu na special science school ike gwu m

      Delete
    3. Iji ya, udi nria dolu ndi Enugu anya. Abacha sikwa nu gi gini?

      Delete
  20. Mua eweghi IKE iji esi fio fio . Ka ma ihe nma bu otu esi eri ya 😁. Ndi enugu Ma otu esi esi fio fio. Mgbe ahu mu na'aru otu Na UNTH, onwe nwanyi n'esi fio fio a Na uzuaki final! Aha ya bu "idi okay". Chai anam e missi UNTH.. Igbo Na fiakwam aru ide

    ReplyDelete
  21. Stella I love your blog a lot , im a frequent reader and I have never commented before, lol today I thought I should since I don't understand a thing u said, English please im from south Africa and all my colleagues are laughing , anyways keep it up , we love ur blog way tooo much

    ReplyDelete
    Replies
    1. Send in an educative post in your native tongue honey,you'd be surprised ppl here can actually translate. It's all about broadening your knowledge.

      Stella maybe you should ask for eng translations for the benefit of ppl who dont understand or do a post and ask ppeps to comment in their languages stating the dialects..let's see how many nationalities we got here.



      Guys remember to vote for stella on the NEA awards.. Send Stella dimokokorkus, blogger of the year to nwaawards@gmail.com.voting ends nov 4. Lets do it

      Delete
    2. Awwww, bonang oo?

      Delete
  22. Replies
    1. Nsukka b'anyi, Anya sumar Ghede..Nsukka D'eje oo ,Ala ooooooooooo....lol

      Delete
  23. Eribeghi nri a mbu mana anam anu maka ya
    Amanda imere ofuma were kowara anyi etu esi esi ya bu nri
    Agam anwam isi ya otu ubochi
    Nri ndi igbo na atom 'pieces' bu abacha
    Abacha bugodi 'bae'

    Mana Amanda enwerem ajuju
    Okwa ibu onye ebonyi state?
    Nne maka chi anaghim aghota asusu ndi be unu o
    Asusu ahu obu igbo?

    ReplyDelete
  24. Onye igbo ka onye dere ihea bu,

    ReplyDelete
  25. stella abeg l know fit laugh, which one be anom na bed neche sunshine!.... l must talk

    ReplyDelete
  26. Replies
    1. Ndudu not ududu and yes it is.

      Delete
    2. Amam si ibu Onye uzo ulo be nnam maka na o bu ha na akpo ya ndudu.
      Mana ihe I ji acho okwu ka m na aghotaghi . Kpazia agwa nke oma nwanne maka na onweghi Onye ma mkpisi ngu ya furu Efu si abia.

      Delete
    3. Ezibo nne. Daalu. Ihia na tõ bullshit.

      Delete
  27. I miss Enugu ooooooooo. See me salivating,kai! Let me go and find something to eat biko. This has woken the hunger in me

    ReplyDelete
  28. Cooking fio fio alone takes about 2hours!! But i love it ehhh
    #i need distributors,if u intrested leave a comment..

    ReplyDelete
  29. Ihe a bu nri ndi Nsukka

    ReplyDelete
    Replies
    1. Abum Onye Olo Di n'Ezeagu.

      Anyi na eri y bu nri too

      Delete
    2. Anyi na eri ya ofuma mana aburo m onye nsukka

      Delete
  30. Ndi igbo ibem. Udo diri unu. Achicha bu nri ndi nsukka...umu nnem okwaya ya?

    Abacha agworagwo n'agusi m ike. Ndewo nu

    ReplyDelete
  31. Lol@SDK u tried and thumbs up @ Bv Amanda..igbo never gree me write till date even though I speak it fluently fa,over try worry you my dear. I was able to read some..i miss that fio fio of a food oo,been soooo long I had it. It takes time to done. 10x

    ReplyDelete
  32. Onye enwee ego okpa, o ji eri ofe owerre? Oolo!!!

    Ihe eji eshi ya wu - ede uhie, akwukwo ri: ugu, okazi, oha, nturukpa. Owu gi nama ndi nke Igahoro shie, azu mangala, ikpokwa, urubiri, anu kporo akpo, shakibari(crayfish), azu fridge amikporo na'ngiga ma obu adara oku izu uka ole na ole eju(snail), ogiri(optional), nnu, ose, mmanu nri(palm oil).

    Ka esi esi ya

    Bachaa ede ole ima ga ezu. Shie ya na'miri mmiri oku ka oyee. Suo ede ahu n'ikwe na enweghi mkpuru g'ano ya. Shima mmiri n'ite ofe ka ogboo. Tinye ede asuru asu n'ime mmiri ahu n'agbo agbo ma gbaria ya bu ede nke oma. Tinye mmanu nri ka isiri choo ma hapu ka o gbo ofuma ma n'akpaghari ya, ihu na ede gbariri nke oma. Tinye shakibari, ikpowa, urubiri akwokotara onu na ose. Hapu ka o gboo ofuma. Tinye okporoko isiburu esi, mangala, ikpokwa na urubiri ewepuchara ogwu. Hapu ka ogboo ofuma. Tinye anu kporo akpo na azu fridge kporo akpo na eju ma hapu ka ogboo ofuma. Tinye nnu na ose ka osiri digi nma n'onu. Hapu ka ogboo ofuma. Tinyezie akwukwo nri nke,ma obu, ndi nke ichoro. Hapu ka o gboo ka isi choo. Butuo ITE ofe n'oku. Ofe owerre emee na, umu nnem. Marakwa na anaghi etinye maggi na umunneya n'ofe owerre, kama ana etinye ogiri. I choro eba, ji a suru asu, akpu, alibo, o nogi n'aka.

    Ihe Nile ndia, owu kpa ego gi ha, ka iga ewere shie. Ya mere eji si na onye enweghi ego okpa anaghi eri ofe owerre.

    Owerre wu oke mba!!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Aga m agba mbo sie ofe owerri a.
      Otego nnubara maka ya

      Delete
    2. All ur comment must Sha long pass d main post. Mtsheeeeew. I ain't reading shit.

      Delete
    3. Dalu Nna!

      Ofe Owerri Na atowa nti!

      Eriri mu ya Na Jevinik mgbe afu wee roo ntutu,taa Na mu ga Amuta ka esi esi ya. Mu wee kpoo onye butere mu nni,anyi we suo. 😂
      Ejekwara m Na Interneti wee mutakwa ka esi esi ya.
      Mana Youngman,onwere ife gbwagwojuru m Anya.
      Jevinik ji ugu Na Okazi wee si ya. Mana ndi ufodu Na Interneti si Na obu ede Na uziza,ufodu si Na obu Ugu Na okazi.

      Nke mu siri buzi nke Ugu Na uziza. Mana otoghi ka nke Jevinik. Mu wee si ka m juo "Kedu akwukwo nri eji esi Ofe Owerri?"

      Delete
    4. Onye n'ejighi ego o na eri ofe owerre? MBA!!!

      Delete
    5. Chai!
      I di egwu oooo @ youngman.
      Iji ya!
      Amanda nwanyi oma, Ada igbo jisike oooo!
      Foi-foi na achacha di usoO!
      Ma obu Foi-foi na ji.
      Ife Queen and boss of this blog dere bu ezi okwu, mmanu igbo bu uto ya,ya na osee!
      Eeeeeeewooooo! Igbo nwere nri ooo!
      Kene Dili Chukwu na abumu onye Igbo!

      Delete
    6. Ify Onyekwelu I don dey shame for this your Igbo. Nndo nne

      Delete
  33. Ndi Igbo nwere erimeri uto di iche iche. Igbo amaka

    ReplyDelete
  34. This meal go sweet wella, but those of us that can't read in Igbo, how do we know the ingredients and method of preparing this meal?

    ReplyDelete
  35. Nk....NWANYI AWKA24 October 2016 at 12:53

    Hia! Ha ne tinye ukpaka na fiofio biko nu? Ji ka nma ,walie ji tinye inu uto fiofio

    ReplyDelete
  36. una doh o
    u fifu Shd cont d selfishness
    how can I cook Dis now wen I can't read it

    ReplyDelete
  37. Enter your comment...nri ndi Enugu. biko gwa anyi ka esi esi ofe owerre.ndewo favor.

    ReplyDelete
  38. Chimo, Amanda ilulu uno. Ada Nsukka confirm. Agam esi ya tata tata. Kedu umu afo ebe fa no, Linda Eze, Sweetest mother, GW etc. Chike Nwannem nwoke, mulu kwa nkea o, oburo ife ojoo ma imeta oliaku gi mma.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Amanda jelulu ejelu!

      Mama ana m asu Fio-fio mu joko-joko. Choi!
      Ukwu mu eme mu alu o!

      Joko-joko means "slightly"
      Ana mu asu fio-fio mu nwa joko-joko n' ikwe.
      Chai! Nni a Na-Ato iche! Especially mgbe odi oku! Tinye ya nnukwu ose Na yabasi!
      Chai! Ukwu a emee mu alu o!

      Delete
    2. Lol @joko joko

      TGW ilotelu mu mama m

      *suo ya joko joko*

      Isu ihe n'ikwe adighi amasim cha cha...

      Delete
    3. Ato m!
      Atokwanu m o!!!
      My Opinion,Nne Ibu onye Igbo?
      Chai,Nnekwanu Nwanne m nwanyi!
      Nne udo diri gi so!

      LMAO @joko-joko.okwa asusu mama bu Ife afu.
      "Nwa m,suoro m fio-fio a joko-joko.

      Nne,Na mbu,mgbe mu no Na Mahadum(University)Isu ife na ikwe Na afia mu aru.
      In short,o na-ewechi mu nti!
      Mana,Mama mu Na mama nnukwu mu muziere m ya.Mama mu bu onye nji Ji.Okwa otu a ka mu si wee muta ya Ofuma. Kita,tupu imechie Anya,mepee Anya,aga m asu nni ji mmadu iri ga-eri n'enweghi nsogbu ma oli.

      Nke mu na amutaro bu iro onugbu. Akporo m ya bu ozi asi nke ukwu!

      Delete
    4. Lol @ ato m

      Obu maka okpotokpo oyibo anyi n'asu ebe a? Abu m nwada Igbo. Ada Anambra!!!

      Ona agba Ndi mmadu ghari n'ife ma mu suo igbo maka adim ka Ndi ejo soso oyibo zuo.

      Papa m doro mama m aka na nti ya asunara anyi oyibo n'ime ulo mgbe anyi di obere! Anam asu igbo, marakwa ede ya ofuma!

      Enwerem ya A+ na waec na agbanyeghi na Ndi oyi mu nile amaghi asu igbo!

      Adaoma isikwara ike Nke ukwu o! Isi na ina asuru mmadu iri nri ji? Ichoro ka mu nwuo??? Obunadi crayfish na Ose n'agbakasi mu ahu, ma ya fodu nri olulo. Jisike oo!

      Chooo okwuma na aboniki tee ukwu ahu n'egbu gi o ga ala! Ndo

      Delete
    5. Isu ife na ikwe anaghi amasim ma oli
      Anam ejisi ike asu ede na umu ihe di ka ose na crayfish
      Ife obula ana eji muscle eme anaghi amasim dika ise nri olulo na isu ji...anwabegh isu ji anwa
      Chineke nyerem aka na udiri umaba nkea

      Delete
  39. Anutubekwam nke a, oga abukwa na otoro uto ofuma. Ogari idim mma ishi nria mana anubeghim otutu aha ndi ikporo iji eshi us di Ka isha.

    ReplyDelete
  40. Enter your comment...adadiora what's mulu? its muru.always changing r to l and vise versa

    ReplyDelete
    Replies
    1. Keep quiet some people pronounce R such as imo abia some parts of enugu and others pronounces L.teacher olodo

      Delete
    2. Onye nkea asi na gini na eme ya? Odiko so ife ighotalu na edemede ninea? Nne nodu ofuma, abum nwafo Anambra. O ka anyi si asu. Esther rapu onyea na osoro na ife Ana eme.

      Delete
    3. Anambra people use L instead of R, that's one of the easiest ways to tell if the person is from Anambra. Mulu is correct, same as muru.

      Delete
  41. Yeah, I remember those days my yorubanised ishan girl used to constantly ask me, babayi, I want to come, did you cook that your 'Ibo' soup? If you didn't, please do before I come. 'IBO' ke, when I'm not IBO but IGBO.

    Well I call her yorubanised because the first day I went to her house, she served me beans and yam with sauce. I couldn't believe I was in real life when I tasted the food. The yam was sugary, the beans was sugary. Omo what is this? She said they use sugar and not salt to cook yam, beans, corn etc. Eewe. I said okay thank you, carry your 'delicious' food!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahahahahaha are you serious? Like they cook beans with sugar? Oh my God! That is seriously funny o

      Delete
    2. Hahahahahahaha are you serious? Like they cook beans with sugar? Oh my God! That is seriously funny o

      Delete
    3. Umuaka yoruba kuziri anyi agwa na sugar mgbe anyi no boarding house

      O na aso gwo gwo

      Mana adighi m erizi ya kita; maka anam aso sugar!

      Delete
    4. That's not true we don't cook yam, beans or even corn with sugar in my house and my parents never did.

      Delete
  42. ..Youngman u b confirm ibo person not d ones calling oriaku oliaku.fansha fansha pple

    ReplyDelete
    Replies
    1. Budding bully leave people and their dialects alone*. Everyone must not sound like you or speak central Igbo...OGINI DU???? and fyi we are Igbo people not IBO people

      Delete
  43. stella oooh, igbo gi nkea atom iche. kikikikikiki. igbalia na. Nwada Amanda, dalu rie nne. Aga m esi ya bu fiofio na achicha ede.
    igbo ndi oma ekele m unu oh

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ada oma anyi ekele kwa gi oooo!!!! Chukwu gozie gi

      Ada nne Amanda daalu rinne maka ndi oma nkea i gwara anyi ka esi agwo ya. Chukwu gozibe gi nnem

      Delete
  44. Iphie, Queen and boss and TGW where art thou? Come and interpret bikonu. hehehe

    ReplyDelete
  45. Stella u are so funny. 'oga di sweet, anom na bed ne che sUnshine' hahahaha....oloo according to owerri people.

    ReplyDelete
  46. Nwa-ada Amanda jisie ike o.

    Nwunye General agurum ihe idere ebea...negodu! Biko jiri ya nwayo ebea bu kwanu blogi.

    Youngman...iwu onye Owerre.

    Anon 13:03 - Ofe owerre n'adi kwa gere-gere mgbe ufodi.

    Mana nwaada Amanda, ina agbali nke-oma. Chukwu gozie gi n'ihea idere.

    ReplyDelete
  47. @Youngman mbanu, ndi owerre anaghi etinye ogiri n'ofe owerre. Ugu na okazi bu akwukwo nke bu akwukwu eji esi ya. Mana ekwesiri itinye ede asuru asu, tinye kwa okporoko ahu n'ime ya ka ha abuo buru zo gbowaa.

    ReplyDelete
  48. Ofe owerre n'ato uto ma ijiri 'ji' asuru asu ji rie ya.

    ReplyDelete
  49. This is so interesting. I am quite ashamed I can't write Igbo very well.
    Amanda, nne e gbali go. Amaigm e'si fio fio mancha. Nnem ukwu a nwugo. Nmam ewero Oge e kuzi nni Igbo ndi ochie.
    Let me write down the recipe. *shines teeth*
    That took me 20 mins to type..lool

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ify lawrence isutakwaranu igbo a

      Kedu ihe iji agwa onwe gi na imaghi ede igbo? Obu ajebo* ka I na acho ime ka ina ekwu eziokwu?

      Oburu na ina ekwu eziokwu, gbalikwuo nwa obere I ga edeta ya ofuma

      Oburu ajibo; kpachara ezigbote anya n'onweghi uru di na igonahu asusu gi maka igbo amaka

      Delete
    2. Ify jisie Ike,inugo?
      Igbalili Na Igbo a idere.
      Odi mkpa Na anyi ga-ama asu Asusu anyi ma na-edekwa ya nke Oma.

      Delete
    3. Ify igbanili. Oge obuna ichoro isi nri ndi Igbo, juo nwunye General, no nya osiri ora na blog Stella.

      Delete
  50. No thank you. Looks like shit.

    ReplyDelete
  51. nri nkea tokatakwa yana chi ya. Biko ezinne kutere m oke nkem. DALUOOO

    ReplyDelete
  52. Them dey carry all these Nigerian language enter America?

    ReplyDelete
    Replies
    1. James James!!!!
      Be proud of your language inugo!

      Delete
    2. Because America is heaven abi? Shows your level of thinking, obviously never being to America so it's the ultimate for you.

      Delete
  53. I noticed nobody passed any derogatory comments about food or the tribe (except James off course), but if it's a Yoruba or Hausa food u go see insults from my igbo brethren. Stop igbo supremacy and love everyone cos we are all equal in God's sight.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Anon 15:09 maybe bcoz Hausa and Yoruba food is rubbish .food meant for prisoners

      Delete
    2. Lmaooooo...Mazi James ehhhhhhh, tufiakwa gi

      Delete
    3. Nna eh ahu akuola m gwo gwo...what a stressful day!
      ....and I missed one of my favourite post. Amanda Nwanneukwu jisike nne.

      Delete
  54. Odiegwu!!! igbo people av flooded everywhere

    ReplyDelete
  55. Stella nwanyioma biko post my comment. Amanda may God bless and keep u. Sassy meruchefire, adadiorama, lindaeze,TGw and all Igbo BVs may God bless u all amen. Stella biko post my comment. Igboamaka

    ReplyDelete
  56. Igbo kweenu, obi bu m nno so anuri ifu ebe ndi bvs na-ede igbo, jisie nu ike, igbo ga-adiriri, iseeeeee! Fio-fio bu nri na-amasim mana onaghi eghe osiso . I choo ka o ghee ngwa, ijri ihe ndi bekee na-akpo "pressure pot" were sie ya. O bu ya ka nnem ji esi ya. Umunnem, daalu nu.

    ReplyDelete
  57. Amanda chukwu gozie gi. The first time I read the other article, I had headache, I have always found it difficult to read and write Igbo though I speak fluently so I saved it and practiced with it. Was very happy to see I understood almost everything you wrote + comments. Will work on my writing next. Jisike nne.

    ReplyDelete
  58. B.V Amanda Favour eze aka m na ekele gi.

    Onye wu Peacemaker,who do you pen better than, the English Language?.The likes of you make me sick to my stomach.You are just the very creature we can do without in Africa.Its sad you do not think that any language can be used to impact knowledge in science and technology.The mandarin language is gradually taking the world.Many European universities teach in their languages.Why can't you be the person who lectures science and technology in one Nigerian language?How can I even accord you such loftiness? You are incapable of such sane thoughts. Joblessness has twisted your thought pattern,moreso when you are going through identity crisis. Onye apari!!!

    Bia Youngman,I wu di nwoke,i wu nwanyi? Nwanne m nwoke igbalifere oke dehuachaa kpa e ji eshi ofe owerre. O werri wu oke mba daa.Nani onye apari amagh.

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141