Stella Dimoko Korkus.com: Igbo Proverbs And Their Meanings

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, November 07, 2016

Igbo Proverbs And Their Meanings

Stella Abiala oooooh---LOL







Igbo kweenu......... Ya...
Igbo kweenu.............ya
Igbo kwezuonu.......... Iseee....




Umunne m awuchi kwanu m ozo.
Ana m ekele onye obula no ebea,nke onye chiri ya zere.

A choro m k'anyi kparita uka maka ILU.

Gini bu ilu?
Ilu bu mmanu ndi igbo ji eri okwu.
Ilu na-eme ka asusu anyi na-ato uto.

Odi mkpa na ezi nwafo igbo obula ga-ama atu ilu.

Obu ya mere ndi igbo jiri si na; Atualu nwa omara ,omara, mana atualu ofeke ofenye isi n'ohia.

Odi mkpa na onye Igbo obula ga amakwa nkowa ilu gasi.

Ndi Igbo n'ekwu si ; onye aturu ilu kowara,imara na ego ejiri luo nne ya nara n'iyi.

Ihe m na-akowa bu na onye Igbo obula ga-ama etu esi atu ilu ma na-akowakwa ya.


UFODU ILU IGBO NA NKOWA YA.

1.ILU....... Agadi nwanyi da nda abuo,aguo ihe obu n'ukpa onu

NKOWA....... Ihe mekaria, a choo ihe kpatara ya.


2. ILU......... Ukwa ruo oge ya o daa

NKOWA...... Ihe ruo oge ya o mee.


3. ILU.......... Ka eletechaa ka mgbo ji atu nwa enwe n'isi.

NKOWA......... Ka amatasia ihe n'ile na-egbu mmadu.


4. ILU........ Were ehihie choo ewu ojii

NKOWA........ Emee ngwa emehalu odachi


5. ILU...... Iru di mma adighi mma itu mbo

NKOWA........ Onye ana akwanyere ugwu adighi mma ime ihe ga ewetere ya ajo aha ma obu ihere.


6. ILU....... Asokata eze anya, ekpuru nkata n'ihu gwa eze okwu.

NKOWA...... onye ana akwanyere ugwu nwere ihe o ga-eme, i wepu ihere baara ya mba.


7. ILU........ Ukpana okpoko gburu,nti chiri ya.

NKOWA...... onye ana adu ndumodu mana onughi, o nwere ihe mere ya,o di n'isi ya.


8. ILU....... Anu gbaa nwata, ohu okporoko ijiji, o gbaba oso.

NKOWA...... ihe mee mmadu, ohu ihe yiri ihe ahu,ujo atuba ya.


9. ILU.......... Ntutu,ntutu ka akpa ji eju.

NKOWA...... obere,obere ka eji emecha ihe buru ibu.


10. ILU....... Adighi agba aka ahu nwata eze.

NKOWA...... Ego di mkpa ma ana-eme ihe siri ike.


Ndi oma m ji eje mba, o gwu kwanu ka ora m n'onu taa.

O ga amasi kwa m ma unu bia tukwa ilu nke unu ebea.

Onye tuta ilu abuo ma kowaa ya,o nwekwara *OBERE* onyinye m nwere m ga enye gi.

Ka anyi jedebe ebea taa,ubochi ozo anyi achuo n'owere nchi.

K'odi oge ozo

Ahuru m unu ncha n'anya

Unu nara nsusu

BV AMANDA FAVOUR






*Okay,Unu enjoy,anu ma bia inugo?



127 comments:

  1. Mba oh!
    Isi na awam, reading this will make it worse!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Mrs korkus, it is
      Anam abia, inugo? Not
      Anu ma bia, inugo?
      Hahaha

      Delete
    2. I will read later abeg make i rest from this trekking under this hot sun

      Delete
    3. Na only ibo u like for your blog?
      We no dey c yoruba anythn!

      Delete
    4. Okuku ga-abu oke na-ebido n'eju

      Delete
  2. Abeg this language is hard to read. Very primitive with plenty consonants. My eyes. No wonder it sounds like people are fighting war when spoken

    ReplyDelete
    Replies
    1. Taa,suru gi bekee si ebe a puo osiso.

      Nwa ada Amanda,l gbalia la maka ilu ndi a.O ga adirigi na nma o....iseeee!!!
      Ilu mu nwere itu bu:
      1.Agadi Nwanyi a n'aghi aka nka n'egwu O mara haba.
      Nkita:Madu a dighi echefu ihe o mara eme nke oma.
      2.Nwata agwo n'azu a maghi n'ije di anya
      Nkowa:Onye a n'emere ihe n'amaghi otu e si mee ya,a maghi n'ihe e mere ya a dighi ofele.
      E nwetere m ya?

      Delete
    2. Kedu ihere mere asusu igbo primitive. Biko oburu na imaghi aguputa asusu igbo, biko gaa noro otu nga maka mpiawa azu

      Delete
    3. Nkita ara taa gi dia@anon12:20

      Delete
    4. Inwetara ya nne....
      Ada eji eje MBA ka ibu!

      Delete
    5. Onye nka osi ebe puta bikonu? Onye ime ofia, onu ofia nwuru anwu. Primitive kujie gi olu, ozuo

      Delete
    6. Daalu Nne. Rapu onye na enweghi aha 12:20 ka o na ekwu ihe o na-maghi

      Delete
  3. Amanda favour how market? how your business

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nne adi m mma
      Ahia na-aga nwayo nwayo
      Nne m suo nu igbo bikonu

      Delete
  4. Abeg let me speak my Edo
    Ivbi'Edo nu zomo wakoyor o

    ReplyDelete
  5. Replies
    1. Nwada Amanda daalu ri nne. Obi sochasialu m n'onwelu ife di otu a na sdk. Jisike nne.

      Ilu: ukwa ruo oge ya, o daa.
      Nkowa: ihe ruo oge ya, o me.

      Ilu: nwata akwo n'azu amaghi n'ezi eteka.
      Nkowa: onye ana enyelu aka amaghi na ihe siri ike.

      Ogwu ka ora m n'onu. K'emesia.

      Delete
  6. Replies
    1. Ndewo, ezigbo nwa afo eji eje mma.

      Bia k'am micha kwo gi onu.

      *nsusu nsusu*

      Lmao!

      #WhiteDiamondOut

      Delete
    2. Amanda Chinwetalu agi
      Ara nwanyi asaba
      Anowaa mu ike
      Ekwensu ama Buhari aka n' nti
      Ike ana ekpuchi ka Amanda n' ajeghe ajeghe
      In efficiency agho ina eficha nsi.ma dere gabazie,bikonu anam abia,ukwa nsinyere n' oku eregokwa oku.bikonu umu nnem ndi no na ugwu ebea,anam aga village (anambra)n' izu uka na abia abia,kedu ihe mga ewetere unu?

      Delete
    3. Lucille o !!!!;hahahahahaha
      Iga egbukwa mmadu ebea o!!
      O ihea bu ilu m si gi tuo?
      Choi!!!!

      Delete
    4. @white diamond
      💋💋
      Ebee ka ino ka mgbe?

      Delete
  7. Stella,ebeee ka idebere onu nsusu nyere umunne m...

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwannem Amanda, ejighi m email gi. Kedu ka m gesi wee nweta ya?

      Delete
    2. Amanda nwaanyi oma. Chukwu gozie GI nno, I gbaliri nke ukwu. Ilu m choro I tu bu 'a gbacha oso, a guo maili...😁😁😁😁

      Delete
  8. Replies
    1. Agadi nwanyi adighi aka nka na egwu o Mara agba.

      Delete
  9. Nne igbo gi di uto n'nti.
    Aka Aja aja m'ebute onu mmanu mmanu...
    Nkowa-igba mbo,iri juo afo.

    ReplyDelete
  10. 1:ILU - Nwata akwo n'azu amaghi n'eje di usually.
    NKOWA - onye Ana emere ihe adighi ama na ihe siri ike.
    2:ILU: awo adighi agba oso ehihe na nkiki.
    NKOWA : Ihe adighi eme na nkiti.
    3: ILU: ire oma ka ejula ji aga n'ogwu.
    NKOWA: ezigbo omume ka eji agbanari nsogbu

    ReplyDelete
    Replies
    1. Iji ya nwanna
      Zitere m ozi na e- mail,ka m nye gi onyinye gi

      Delete
    2. 1:ILU - Nwata akwo n'azu amaghi n'eje di ufu.
      NKOWA - onye Ana emere ihe adighi ama na ihe siri ike.
      2:ILU: awo adighi agba oso ehihe na nkiki.
      NKOWA : Ihe adighi eme na nkiti.
      3: ILU: ire oma ka ejula ji aga n'ogwu.
      NKOWA: ezigbo omume ka eji agbanari nsogbu

      Delete
    3. Gbamest @ no 3 ilu na nkowa!! Lol

      Delete
  11. 1:ILU - Nwata akwo n'azu amaghi n'eje di ufu.
    NKOWA - onye Ana emere ihe adighi ama na ihe siri ike.
    2:ILU: awo adighi agba oso ehihe na nkiki.
    NKOWA : Ihe adighi eme na nkiti.
    3: ILU: ire oma ka ejula ji aga n'ogwu.
    NKOWA: ezigbo omume ka eji agbanari nsogbu

    ReplyDelete
    Replies
    1. 8:ILU: anyuko mamiri onu ogba ufufu.
      NKOWA: agbako izu onu atuputa atumatu bara uru.

      Delete
  12. Amanda ibiakwa go ozo? Anyi aga ekwute kwa Gi ume eeeee? Ogini Na afio?

    Awotacharom ilu ndi itu maka Na amarom otu esi agu igbo ofuma ma otu esi ede ya.. Mana etu obuna osina di agam ejisie ike nwata oke m.

    Ilu ndi mma bu:
    Ochu nwa okuko nwe Ada:when you chase a hen or is it a chick? Chances are, you will fall in the process.. Lol

    Oke so ngwere ma mmiri, aru kokwa ngwere, o ga akowa oke? :the rat that jumped into water just because the lizard did same, when the lizards body dries off, will yours dry off too? Lol

    Anuta agbohobia, achupu agadi:out with the old, in with the new.

    Mbe si Na ozu ozo ga Ada kwa:the tortoise says another corpse will fall? LMAO!

    Onwero uzo esi ga onitsha di nso:there is no shortcut to onitsha.

    LMAO! Isi Na awam Biko!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nothie Igbo gi amaka. Igbariri ofuma.

      Delete
    2. Northie !!!!!;
      Ochi atogbuenu m ebea..hahahaha
      Unu ekota gokwa okwu!
      Unu ga amutariri ka esi ede igbo

      Ilu gi amakakwa o!, mana ikowaghi ya na igbo.
      Bia kowara anyi ihe oputara na igbo

      Delete
    3. 1:ILU : ochuu nwa okuko nwe ada nwa okuko nwe mwomwo oso.
      NKOWA : onye ajo ihe nwe odida onye ana eme ajo ihe nwe mmeri.
      2:ILU: oke soro ngwere mma mmiri okozia ngwere oga akokwa oke?
      NKOWA: isoro onye ozo mee ajo ihe, onye ahu lafere iga esokwa ya lafere?
      3:ILU: aluta agbohobia achupu Agali.
      NKOWA: ewebata ihe ohuru echezo ihe ochre.
      4:ILU: mbe siri na ozu ozo ga ada.
      NKOWA: Ihe mee ta gafere ozo ga emekwa echo.
      5:ILU: onweghi uzo esi eje onicha di nso.
      NKOWA: onweghi uzo ihe oma si abia di mfe

      Delete
  13. nwaada Amanda, daalu rie nne, exigbo nwaada amuziri amuzi.

    ILU: ka a mara ka mmiri si baa n'opi ugboguru
    NKOWA; ka achpouta ihe kpatara ihe jiri mee ma obu mebie

    ILU: agbusi gbaa otule o muru ako
    NKOWA: ihe mee mmadu, omuta ihe

    ILU: otu aka ruta mmanu, ozuo ora onu
    NKOWA: otu onye mee ihe, o ruo/ zute umunna ya

    ILU: gidi gidi bu ugwu eze
    NKOWA: igwe bu ike n'etiti umunne ma obu mba

    ILU: emee ngwa ngwa, emeghara odachi
    NKOWA: emee ihe n'oge, agbanahu ihe obula ga egbochi ya

    igbo ndioma ekelekwa m unu oh. ikuku oma fesa anyi ooh
    Empressitta

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ada igbo ka ibu!!! 🙌
      Iji ya
      Zitere m ozi ma ichoo obere o nyinye m

      Delete
    2. Daalu rie nne. Biko kedu ka m ga esi nweta ya bu email gi?

      Delete
  14. ILu: Aka aja Aja na-eme Onu mmanu mmanu
    Nkowa : Onye ruo olu,o rie

    Ilu:,Nwuru okwa n'aka bia
    Nkowa: Bia n'ezigbo ututu ma Obu Bia n'oge.
    Ilu: Nwata akwo n'azu amaghi n'ije di anya
    Nkowa: onye a na-emere ihe adighi ama uru ya

    Ilu: Nwepu aka enwe n'ofe tupu o gho aka mmadu
    Nkowa: kwusi ajo ndu tupu obutere gi oghom

    Viva igbo language

    ReplyDelete
  15. Daalu Nwaada Amanda. I mere ofuma. Anyi huru gi na-anya nke ukwuu....

    ReplyDelete
  16. Kupurunu ya'ka!
    Imela nwanne mmadu, anyi hukwara gi n'anya.
    Gosh! My Igbo is rusty, I should practice more.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Kpamkpam kpakpakpam onwe m

      Delete
    2. Egbe bere ugo bere kowaa ya na asusu igbo

      Delete
  17. Issorite, keep being stingy with your language o anty Stella, Deriz God.

    ReplyDelete
  18. Bv Amanda favour ibia kwa ozo ooo..lol! Nne dalu soo,ina try maka odiro easy biko.Ahuru ngi n'anya too,nara nsusu too*heheehehehe*wish I could write igbo so well oo. Bia Bv Queen and boss I go need tutorial o cos I can see you write it soooo well..choi! Una doooh

    ReplyDelete
  19. Igbo kwezuo nu ndi mji biri. Ekele kwa mu unu oooo. Oyo atugbuola madu na obodo Elizaaa. Asi na oyi aroaaa ga apu iche.

    Nwada Amanda. Daluooo. Ibu noo ezigbote ada Igbo. Nna gi muru gi.

    ReplyDelete
  20. ILU- Nwata nyuo piripiri nyuo piripiri, ihu oru ya nokwa n'eche ya.

    NKOWA: ihe omasiri gi mee/n'eme, ihe ikwesiri ime g'ano n'eche gi.

    ENGLISH: If you like do any how anyhow, what you are suppose to do will be there waiting for you. Lol



    ILU: Nwata rie ihe ojiri muru anya orahu.

    NKOWA: Nwata/onye mee ihe ochoro ime, ya-ezuru ike.

    ENGLISH:If a child/someone does what he/she wants to do, he/she will go and rest/sleep

    ReplyDelete
  21. ILU- Nwata nyuo piripiri nyuo piripiri, ihu oru ya nokwa n'eche ya.

    NKOWA: ihe omasiri gi mee/n'eme, ihe ikwesiri ime g'ano n'eche gi.

    ENGLISH: If you like do any how anyhow, what you are suppose to do will be there waiting for you. Lol



    ILU: Nwata rie ihe ojiri muru anya orahu.

    NKOWA: Nwata/onye mee ihe ochoro ime, ya-ezuru ike.

    ENGLISH:If a child/someone does what he/she wants to do, he/she will go and rest/sleep

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwa ada amanda, mekie shoo na ihe onyinye gi ahu rurum aka.

      Maka ederem igbo dee na bekee
      Lol.

      Delete
    2. Udodi!
      Zitere m ozi Na e-mail m

      Delete
  22. 4:ILU: ukpana okpoko gburu bu nti chiri ya.
    NKOWA: onye aduru ndumu odu ihe wee mee ya bu onye nkpochi nti.
    5: ogodor ga eru nwoke ebe oruru ibe ya.
    NKOWA: onye obula ga ahu ihe ibe ya huru ma oge ya ruo

    ReplyDelete
  23. No. 5 amaka.

    Nne jisie ike

    Anaghi agwa onye-isii na mmiri choro izo.

    ReplyDelete
  24. Oya igbos come and translate O.

    ReplyDelete
  25. Stella, obu unu n'enwete onwe unu, anam abia.

    Bia Amanda, mgb'ozo, were Igbo etiti de ya, k'okwe anyi nile nghota.
    Igbaliri nk'ukwu mana igara igwa anyi ihe bu ihe'nritaa.

    1) Ilu: Igbuo kpo, iputa n'uzo juo onye n'egbu.
    Nkowa: Onye aruru ala, m'obu onye ihu abuo.

    2)Ilu: Okuko nyuo ahu, ala achuwa ya oso.
    Nkowa: Onye ojo n'ano n'ujo mgbe enwebeghi onye n'achu ya m'obu n'echere ya echiche ojo.

    Ilu: Hie isa n'anya.
    Nkowa: Kpachara anya gi, m'obu leruo anya.




    K'odi mgbe ozo.

    ReplyDelete
  26. 6:ILU: ukwu na-aga warara anya na-aga warara n'ahu ya.
    NKOWA: Ihe mmadu na-eme na ezo ezo onwere onye n'ahu ya.
    7: ILU: mberede nyiri dike mana obu mberede ka eji ama dike.
    NKOWA: Ihe ndakwasi na adakwasi onye obula, mana obu onye kwudosiri ike luo ogu nke ya bu onye mmeri

    ReplyDelete
  27. Bia ndi warri, o bu Na unu anoro Na blog a? Unu ana asu kwa as usual unu?oge Obula igbo, Hausa, na Yoruba,ya Na Efik.ogini Na emedi unu?

    Waffy una no dey this blog so? No one fit yarn urhobo give Stella so? Na wa for una.

    ReplyDelete
  28. Amanda Chinwetalu agi
    Ara nwanyi asaba
    Anowaa mu ike
    Ekwensu ama Buhari aka n' nti
    Ike ana ekpuchi ka Amanda n' ajeghe ajeghe
    In efficiency agho ina eficha nsi.ma dere gabazie,bikonu anam abia,ukwa nsinyere n' oku eregokwa oku.bikonu umu nnem ndi no na ugwu ebea,anam aga village (anambra)n' izu uka na abia abia,kedu ihe mga ewetere unu?

    ReplyDelete
  29. I be ibo boy o, buh to read it eeh takes time...

    ReplyDelete
    Replies
    1. O kwa ofufu ka I na Efu ihe a nwanne. We're ugbua choba ewu oji tupu chi ejinahu gi.

      Delete
  30. Abeg i can't kii masef trying to read and understand this igbo.im sure this is imo,if it where anambra it would have been bera.Imo is too hard abeg.Igbokwenuu

    ReplyDelete
  31. Ilu abuo:

    1. Anaghi eji amu ukwu amaja agadi nwanyi

    Nkowa: Anaghi eji ihe doro onye anya (ma o bu ihe onye hurula otutu mgbe) emeghari ya anya

    2. A jukata nkwu, tapiawa onu, oge mgbupu ya eruwego

    Nkowa: Emekata ihe rue mgbe o dizi ka ike ime ya aguwago onye na-eme ya, oge eji akwusi ihe ahu eruwego...

    Ngwa, kuturunu m aka! ;)

    ReplyDelete
  32. Nne daaluso. Igbo Amaka. Uwam ozo mu ga abu Onye Igbo

    ReplyDelete
  33. i think it makes more sense when you translate to English so we can understand and appreciate the proverbs more or else na......

    ReplyDelete
    Replies
    1. Amanda nwanne,hapukwa įge nwa Amadi a nti,óbughį Ebe Onye Sara ahu ka o na achįrį awuru ya. Ôcho imuta etu esi asu asusu anyi, ókwuta ûgwo.

      Delete
  34. Igbo oma na ege nti ya gazie oooh,nke onye metere diri ya ooooh.Ya gazie oooh

    ReplyDelete
  35. Igbo kwenu!! Iyaaa

    Awo adiro agba oso efifie n'efu-- A toad doesn't run around in the afternoon for no reason lol

    Brb lemme go and cram more

    ReplyDelete
  36. I na asi nwanyi mechie ukwu, Ima ebe osi eku ume...onweghi ka isi amu gha ka oghara ira otu

    ReplyDelete
    Replies
    1. Chei! Chei!
      Isi mebiri gi o!
      Ochi atogbue nu m o!

      Delete
    2. Idi ile anya l'ihu d'ariplayi ndi nmadu nñana? Obughi otu l'eji eme hue.
      Obu imere nwa ngozi, g'emere nwa daa enyidiya, hue ada aga aga.
      (Ask an ngwa person to interpret)

      Oya look for my ilu....udo nwanne✌

      Delete
  37. Igbo Kwenu....
    I love my igbo people like that.
    No dull moment with them.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Yes oh!!!
      We're cool 😎 like that

      Delete
    2. Yes o!
      Anyi digodi wuuuu!

      Amanda Nne m Ekene m gi o! Dalu so!

      Delete
    3. Oriaku G ekele o!!!
      Kedu ka unu mere?
      Ana m Na ahu di unu mma
      Kelere m unu gi

      Delete
  38. Fada awuro nwata na ekpere-Onye ma olu
    ya nke oma
    Ukwu Naga wamwam,anya nele wamwam nahu ya-Onwegi ihe zoro ezo

    ReplyDelete
  39. Need someone to teach me igbo... help a new wife.

    ReplyDelete
    Replies
    1. A na-ekwu na ôkû gbara ûkôchûkwû,į na-aju ma ô gbakwara afo ônû. Enweghį ihe ana eme na-Efu ugbua. 😴😴😴😴

      Delete
    2. Otu isi de Igbo gi dikwa mma. Ôwû otûa ka'm na-e de ya.

      Delete
  40. Amanda nnem,onwero ebe anyi bu ndi igbo nor ka arapu e mata na'anyi bataa.

    Igbo nwere mmadu
    Igbo siri ike.

    Dalu rinne!

    ReplyDelete
  41. Igbo is sweet o
    I wish I can write and read it well but am struggling fine. Amanda jisike 🙌🙌🙌🙌🙌

    ReplyDelete
  42. Chukwu gozie gi Amanda
    Udo umu omas.

    ReplyDelete
  43. Biafra kwenu; yaaa!
    Biafra kwenụ; yaaa!
    Ụmụ Igbo kwezoonu oh;yooooo!
    Igbo makwaranụ mma oh!
    A na mụ ekele nwada Amanda Favour, maka Igbo ọ na-edere anyị kwamgbe, kwamgbe na blog a. Daalụ nwanyị ọma. Chukwu gọzie gị maka na ịhe ị na-eme na-amasịm nke ukwuu.
    Ilu:Egwu adị atụ nwoke ị laba na ụlọ ajadu, maka na ọ maara nga di ya nọ.
    Nkowa ya:Nwoke a dị atụ ụjọ ị laba na be nwanyị ajadu dinaa ya, maka na ọ maara na di ya anwụọla.

    ReplyDelete
    Replies
    1. A na'm ekele gi Chinny. I bû ezigbo nwa'Igbo. Chukwu bu ike gi.

      Delete
  44. Ugo bere, egbe bere - nke obuna ishi ibeya ebena, nku gbajie ya

    Translation: Let the eagle perch and let the kite perch - anyone that doesn't want the other to perch, may his wing break. AKA biri ka mbiri (live and let live)

    ReplyDelete
  45. YOU HAVE REALLY TRIED MY DEAR SIS!

    ReplyDelete
  46. Bikonu, kedu ihe ilu a putara; agwo na ihe o loro were wusara? Ndewonu!

    ReplyDelete
  47. Please someone should explain this in Igbo:
    1. Awo anaghi agba oso ehihie n'efu.
    2. Nwata bulie nna ya elu, ogodo ayochie ya Anya.
    3. Ihe egbe muru aghaghi ibu okuko.
    4. O bu mmiri by ndu azu

    ReplyDelete
  48. Replies
    1. Ndi be anyi ekele m unu ooo
      ilu:Adanna nwe aru n'abo
      Nghota:Na Adanna di ime
      ilu: Nwata ahu n'eme aka n'abo
      Nghota:Na nwata ahu na ezu ori
      ilu:uchennaa nwe anya ukwu
      Nghota:Na Uchenna na achokari ihe ukwu mgbe obula odighi anabata ihe obula di obele

      Delete
  49. Nwada I gbariala ooo.Daalu rinne.

    ReplyDelete
  50. A bu m maazi a bughi m nwada

    ReplyDelete
  51. Kekwanu etu m ga esi nwete ihe onyinye m nwada stella

    ReplyDelete
  52. Daalu ezigbo nwa maka ilu a. Eji mu ya elote akwukwo Mgbidi Igbo mgbe anyi ka no n"ulo akwukwo sekondiri.
    Ilu nke m nwere bu;
    1) Onye oku na-agaba be ya na-achu nta oke
    Nkowa - Onye nwere ihe di mkpa o ga-eme, o hapu ya na eme ihe na enweghi isi.

    2) Njudugba(a type of bird) tolu na penyi/obele anu
    Nkowa-O nwuru na ihe na enweghi isi.

    3) Nyochata ka mgbo ji atu enwe n'isi
    Nkowa- Mmachata ihe niile ka mmadu ji eburu ihe o na-amaghi isi ya na odu ya

    4) A dighi agwa ochi nyi na agba esu
    Nkowa- A dighi akowara ekwe ekwe mgbe o mere

    5) Izu ka mma na nne ji
    Nkowa- O di mma ikpako aro na ndi nwere otu echiche


    Daalu nu rienne

    ReplyDelete
  53. Please someone should help me out

    1. O mee ihe jide ofo
    2.Agwo adighi agba oso ehihe ń efu
    3.aga kwa Eji ama oka chara acha

    ReplyDelete
  54. Pls translate Ndu mmiri Ndu azu

    ReplyDelete
  55. Gini bu nkowa : mgbe nkita ga anwu o gaghi anu isi nsi

    ReplyDelete
    Replies
    1. O putara. Nwata na_anaghi anu ndumodu ga _ akwa mmakwara n'ikpeazu

      Delete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141