Stella Dimoko Korkus.com: IHE GBASARA IMU NWA N'ULO N'ALA IGBO

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, December 19, 2016

IHE GBASARA IMU NWA N'ULO N'ALA IGBO

IGBO KWEENU.........YA !
IGBO KWEENU.............YA !
IGBO KWEZUONU..........ISE !




Ndi oma m ji eme onu, ekele kwa m unu
O kwa nu nwanne unu nwanyi B.V AMANDA FAVOUR na-ekwu.

O nwere ezigbote nkata m choro ka anyi kparita, o bu maka etu obodo di iche iche n'ala Igbo si eme maka nwa a muru n'ulo.

Dika m gwara unu oge mbu, a bu m onye Ebonyi steeti,mana a bu m nwadiala na Awka-etiti(nne m bu onye Awka-etiti).

Abia na be nna m , nwa obula a muru n'ulo( nwa nne ya alughi di were muo),abughi ndi be nne nwa ahu nwe ya.
Onye obula mesiri bia luo nwanyi ahu muru nwata ahu,ga-akporo kwa nwa ahu a muru n'ulo.

Ihe nkea putara bu na be anyi,nwoke obula mere ego isi nwanyi muru nwa na be nna ya, nwezi nwa ahu o muru be nna ya.
Mana, nne m gwara m si na Awka-etiti be ha, na nwa obula a muru na ulo , buzi onye be nne ya ka obu.
Ihe oputara bu na, nwoke tuwa nwanyi ime,o buru na olughi ya o were muo nwa,nwa ahu agaghi abuzi nwa ya ozo.
O buru kwanu na nwoke ozo mechara luo nwanyi ahu,o gaghi kwa akporo nwa ahu o muru be nna ya.
Bikonu ndi be anyi,a choro m ka unu gwa m ka esi eme ihe di otu a na be unu.
Ka anyi nwe ike imuta ihe
Chukwu gozie unu
Nara nu nsusu



*kedu Amanda?achumkwo that idi make sense gaaaan..lol

130 comments:

  1. Replies
    1. Amanda i mere Nike OMA maka mkparita uka i malitere. A but Na ada Imo State ma na otego aka hapuru ala Nigeria. Ma Na aka na m echeta ka esi eme ya Na obodo nna m. Ndi be anyi Na aso NEA agbogho i no na ezi nna ya mu Nwa. Mana oburu na ihe di otu a mme. Ndi be nke nwanyi ga aju nwa ha onye tuwara ya ime. Ha ga akporo nwata nwa agbogho ga ebe nke nwoke. O buru na nwa okorobia ahu aju i nara ya ka nwunye, ndi be Nike nwanyi ga ala. Mana nwa ahu amuru ka aga Na ekpe ekpere ka Nonye ozo ga alu nne ya nwe ike inabata ya. O buru nwa nwanyi nsogbu adighi maka na o ga alu di. Ma na oburu nwoke o gaghi alu ulo na ezi ndi be nne ya. O nwere ike ga ruo ulo na obodo ozo. Ndi be anyi Na akpo ya "ume" Nwanyi amuru na ikwu nne ya.

      Delete
    2. A bum onye umunze Anambra. Anyi na emekwa ka ndi awka-etiti. Anaghi alu nwanyi na nwa together. Nwa obuna amuru na ulo buzi nna nke nwanyi nwezi ya. Oyamere e ji ahapu nwanyi na ulo ka o na amu nwa ma oburu na nna ya amughi nwa nwoke. I tuwa nwanyi ime ma I lughi ya, Nwa ahu agaghi abukwa nke gi. Otua ka odi na be nnam.mana dim bu onye umuahia, ka m ga Jua ya ka ha si eme na be ha.

      Delete
    3. Abum nwafor Oji River, inyi exactly...omenala anyi dikwa ka nke Awka etiti. Enyi anaghi enwe nwa. Nwoke nukwara nwa agbogho mmuru nwa na be nnaya agaghi kwa enwe ya bu nwa. Nwa amuru n'emeghi ego isi NNE bu ndi nke be nwanyi nwe nwa...Igbo kwenuuuu

      Delete
  2. Enter your comment...biko interprete stella. i love igbo but igbo guys don show me pepper. me am from edo state ooo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Cause u don't know their mumu button

      Delete
    2. Igbaliala nwada Amanda favour. Abum nwafor nwada ndi umuahia na Abia steeti.amaghim otu odi na alam mana odoro mu anya na nwa obula amuru na ulo nwere nna nke putara na onwere ebe osi puta. Nne ya luo di ozo,oga hapu has omuru na ulo soro di ya la. Mgbe Nwa hu toro okoro ma obu agboho oga acho onye wu nna, lakwu ya. E no easy to write in IGBo with this auto correct

      Delete
  3. Replies
    1. As I no sabi write for igbo, make I kuku park.

      Delete
    2. A bu m Ada-Ide! E si m Umuoji eje! Omenala anyi di kwa ka nke ndi Akwa-etiti I ji ma atu!. Nwa amuru n'ulo bu ndi be nne Ya nwe Ya.
      Ma o burukwanu na ezinaulo ha abughi ndi Omenala, nne Ya luo di, ha nwekwara ike I kporo ya ma o buru na ha kwekorita.

      Idemili ekenee m unu!

      Delete
    3. Proudly an ogidi geh.....lol

      Delete
  4. Sombori epp mee!!!, my bren is speening.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ya not alone

      Delete
    2. Ya not alone

      Delete
    3. U are not alone @villager.


      Stella when are having a post for isoko?

      Delete
    4. @ Village
      Am happy u can't read this
      That's how people can not read your comments

      Delete
  5. Odi iche iche Na obodo niine,oburo iwu na nwanyi muru nwa Na be nna ya,Na onua di Na di ya ga akpolu nwa ahu. Ufodu umunwoke adiro ekwe kpolu ya bu nwa. Oburu Na nke nwanyi mulu nwa nwoke,onye tubalu ya ime ga achoro ikpolu nwa ya. Umuaka nwanyi ka Ana adi arapu na be nna ha ma ochoba inu di. Osi na etu ndi be nke nwanyi choro ya,ufodu umu nwanyi ga acho ka okporo nwa fa naba be di fa, mama Na di onuru ofuru kweta ka ha Na ha biri.
    Ndi be anyi ndewonu o!

    ReplyDelete
  6. BV Amanda Favour noon'de?

    Ihe m wota na iha e ku bu inacho onye bu n'pa nwa ha mutara without nwoke i nuo nwanyi.
    Odikwa o Di iche na obodo. Na obodo mu be Amandim Olo nime Enugu state, amarom etu a si eme ya. Ihe ha ne me na obodo mu bu iga nu nwanyi before unu mua nwa

    ....abeg pardon my written Igbo, I speak it better

    ReplyDelete
  7. Nwa ada Amanda,daalu maka isi okwu o,I wetere k'anyi kparita uka.Ikwu ezi okwu,a machaghi m otu e si eme ya bu nwa amuru n'ulo na be Nna m.Kama otu ihe doro m anya bu na a n'akpo ya ime mkpuke na be Nna m.

    O di m ka o bu onye tuwara ime ahu nwe ya bu nwa.Ya kpatara e ji ekwu si,nwa ahu tochaa,o jee chota onye bu Nna ya.

    Amanda nwanne m nwanyi,jide nke I ji,maka nke I ji a maka.

    Igbo ndi oma,e melee m unu!!

    ReplyDelete
  8. Which one is this one again? The Igbo speaking bvs will come and scatter Igbo any how on this post. Biko don't forget to translate when you are don yarning what you want to yarn.
    Why am I pissed over this post sef? Lol







    *grabs cucumber*

    ReplyDelete
  9. Ezigbo n'madu.... *covers face, dunno the meaning* hehehe

    ReplyDelete
  10. At my own side a child given birth to at home belongs to the woman's family.I don't think ibia me ego the lady the nwa becomes yours. My own place is different

    ReplyDelete
  11. Ututu oma ndi members of BVN, aha'm bu Hannah AKA miss Aboki. Agwu ne gwu'm, achom nri ofe akwukwo na anu nama na azu mangala. Linda Eze nwanyi oma, ebe ki no? Anam ekele gi ooo
    Stella onye asiri 1of blogosphere, aka'm di ne lu.
    Xp kedu Lo and Behold?
    Martins Aboy nwoke oma, ID'm ne me'm nsogbu, ogini kain ge me?
    Amanda nwamama, chop kiss, idi gallant.
    Angel'm na Santa'm, Chukwu go zie unu nyafu nyafu



    miss Aboki

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nekwanu anya o!
      Onye kuziri gi ihea idere?
      ✔✔✔

      Delete
    2. Amanda, nara ezugbo aka iri n'ihea idere. Nkea gosiri Na- ibu ezigbote nwa afo igbo.

      Na Anambra steeti, o buru na- imeghi ego Na isi nwanyi, nwa o muru abughi nke gi, nwa ahu bu ndi be nna ya nwe ya, o buru godi Na nne ya emesis luo di ozo, nwa ahu ga na- aza aha nna ya, nke a bu maka Na nwoke enweghi nwa omeghi ego n'isi mama ya. Nwa ahu ahu bu nwa nna ya , o ga- ekete kwa oke Na be nne ya di ka nwa afo.
      Ya mere Na nwa amutara ebe ozo m' obu n'ilo di ka esi asu ya, eneghi oke Na be nna ya ruo oge nna ya gara ga mme ego n'isi nne ya.

      IGBO KWENU!
      MUANU!!
      ZUANU!!!

      ISEEEEEEEEEE.
      YA GAZIE NU NDI OMA

      Delete
    3. Miss Aboki o hahaha. I just confirmed one amebo. Hmmmm
      Daalù o oriaku anyi.
      Lo and behold are here. Fa na amichalù mmili ala. Na ekesisi anya.

      Amanda...daalu rinne. Ka ódí Na Awka etiti ka odìkwa Na Idemmili nine. Nwa amútòlú n'ùló bu ndi be nna nke Nwanyi nwe nwa. Ejirò okwu ejekwue.

      #proudadaide
      Ekene mu unu.

      Delete
    4. Daalu o,Ada eji eje mba!
      Kelere m umu ejima gi

      Delete
  12. Gini ka Stella n'ede bikonu?

    Amanda dalu.
    Ihe ikwuru gbasara Akwa-etiti wu otu eshi eme ya ebe msi bia. Anyi n'akpo ya (ime mkpuke).

    ReplyDelete
  13. Ezigbo Ada Amanda! Kedu isi okwu akuku gi a??

    ReplyDelete
  14. Sorry i will have to write in English.
    In my home town, if an unmarried woman has a child, the child belongs to her father and bears her family surname. and even if she gets married in the future, the child will still remain with her family.

    ReplyDelete
  15. Abum nwa ada Nkanu di Na okpuru ochichi Enugu Steeti,
    Itu ime nkpuke/ime okwa Na ala nkanu wu ihe alu.
    Nwata kiri obula atutara na ime nkpuke na obodom wu usu! Onwughi anu elu nke oji anwu anu ala. N'hi nkaa,umu agbogho anyi kpachapunu Anya unu,okachasi ugbua Wu oge ekeresimesi ndi oso chi egbu na acho onye ha ga edughe.

    Biko onwere onye Ogbuzuru Ogbuzuru no na uloa?

    Ekele kwaam unuoooo...

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ogbuzuru ogbuzuru.... Gwa nwanne gi eziokwu!

      Delete
  16. Stella,kedu ife i na ako?

    #Flygirl

    ReplyDelete
  17. Replies
    1. Na obodo m bu Umuahia,o buru Na nwata Nwanyi a turu ime n'ulo nna ya, o bu ihe ojoo kariri ihe ojoo.

      Nke mbu, nne nwata nwa agbogho a agaghi enwe onu n'ebe umunwanyi ibe ya no.
      Umunwanyi ga ezere n'igwe ma rie nwata nwa agbgho a ma o bu nne muru ya iwu(fine).
      Nke abuo, Nne ya agaghi esoro umunwanyi ozo ma rie ego ma o bukwanu ihe ndi ozo eji kee nwa agbogho ozo di nke bu ihe ilu Nwanyi.
      O buru Na nwa agbogho a emechaa luo di,o nwere Ike ikporo nwa o mutara n'ulo we luo di ma o buru Na di ya anabata ya, o oburukwanu Na di ya aju inabata ya, o ga anoro Na nke nne ya na nna ya ochie we rue mgbe o ga-akpata ego we bido ezinulo nke ya.
      Itu ime mkpuke abughi ihe dabara adaba. Ekelem unu o!

      Delete
  18. Obu ezi okwu ka ikwuru nwada Amanda,obu etu ahu ka odi na anambra state

    ReplyDelete
    Replies
    1. @Lucile adirom sure na obu etu ahu na anambra ni ne oo. Mbanu! Juo ese biko

      Delete
  19. Biko does anyone know where I can find an Igbo class or something in New York? Thanks

    ReplyDelete
  20. Daalu NwaAda
    Afam bu Nwada Chisom, Abum nwa Ogidi na Idemili North nke di na Anambra Steeti.
    Nnem si Nnewi were bia ije di na Ogidi.

    Abia na be Nnam, nwata obuna nne ya muru n'ulo (n'enweghi di)bu nwa nna mutara nne ya. oga aza afa nna mutara nne ya ma nwekwa oke na be nna nne ya. ya burugodi na nwoke tubara nne ya ime bia n'odi n'ihu si n'ochoro ikporo ya m'obu nuwa nne ya, ndi be nna ya agaghikwa ekwe kponye ya nwata ahu n'ihi na obuzikwa nwa nna nke nwanyi.

    ka osi di njori bu na, oburu na nwata nwanyi aturu ime,nwoke tubalu ya ime were yalu iji ngwa ngwa ga mee ego kporo ya, ozigbo achoputara na odi ime ndi be nna ya agaghi ekwe ka nwoke ahu me ihe obula belu na omusia nwa (ogidi anaghi eke nwanyi n'afo ime)and once omuru nwa, nwoke ahu agaghikwa enwe ike ikporo nwa ahu ozo.

    Kpatara na oburu n'ezi n'ulo amutaghi nwa nwoke nna ha were nwuo, umuada ndi choronu nwere ike nodu be nna ha muta nwa ga anochi nna ha tupu ha anuo di.

    Kamana, abia n'mpaghara be nne m bu Nnewi, nna nwata ahu mecha bia ikporo nwa ya, aga eme omen'ala di na ya ma kponyekwa ya nwata ahu.

    Daalu nu ndi be'anyi

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu nwanne m
      Ezigbo nwafo ka ibu!
      ✔✔✔

      Delete
    2. Dalu ri nne.otua ka odi na ba anyi umunze. Mana ogbara ofuru emebichagokwa otutu ihe. Anyi na ekezi nwanyi na afo ime. Mana nwa obuna amuru na ulo bu nna nke nwanyi ka nwe ya. Nke ahu akoro chenji.

      Delete
  21. What is this fuckery?

    ReplyDelete
  22. Bv Amanda e'bu nwa nnem. Abum oye Afikpo. Gisike..

    ReplyDelete
  23. Otutu ebe di iche iche n'ala igbo, omenala bu na nwa obula amuru n'ulo g'aza aha nna nne ya. Onwere ka odi nno na nwoke obula choro ilu nne nwa amuru n'ulo ga akporiri nwatakiri ahu. (An exception) ndi Igbo n'eme Ihe k'odiri onye obula nfe. otutu umu okoro igbo ruru ilu Nwunye agaghi ekwe k'anogide ha ka ha kporo nwa onye ozo belu so ma ha kwetenyere ka odiri otu a. Ndewonu.

    ReplyDelete
  24. Ndi be anyi ekele m unu....

    Aha m by nwada onyinyechukwu, Abu m onye arondizuogu nke di n'okpuru ochichi ideato north local government area n'imo state.
    Obuchaghi ihe di mma nwanyi imu nwa na be nna mana nke a mee nwa ahu ma oburu na nwoke tuwara ime ya ju na obughi ya,ndi be nke nwanyi ga ewerezi nwa ahu di ka nwa ha tupu o too were buru mmadu.

    ReplyDelete
  25. Biko onwe onye ghota ife Stella n'ako? Amanda oke nwadiana na Anambra, jisike inugo.

    ReplyDelete
  26. Amanda nwanyi oma jisike, I can read this but to write in igbo na wahala.

    ReplyDelete
  27. Nne kedu ije? Stella how body, Igbo bvs kwenu, kwezonu!



    ... Jesus is my worth

    ReplyDelete
  28. Nne kedu ije? Stella how body, Igbo bvs kwenu, kwezonu! One love from your Edo bv!



    ... Jesus is my worth

    ReplyDelete
  29. Onyigbo ya kpotuba!
    Stella, biko kpa chara anya gi o
    Osi gini kwanu?
    Ndi Onye yoruba, signing out!
    Hehehe

    ReplyDelete
  30. Stella, kedu Ife Ina ako? Hahahaha
    Umunne m bikonu putaba nu ka anyi tinye onu na okwu a
    Ihe anyi no ebea bu imuta ihe

    ReplyDelete
  31. Na WA ooo..
    Sometimes I can read igbo well and understand, sometimes I can't,like today.is there a name for that?

    Awotacharom Ihe'm guru kita.
    Nwa a mu na Ulo,o nkea Ana jero uloogwu we muta, ka obu ime nkpuke ka ina eku maka ya?
    O Doro kwa mu Anya.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nghota give foduru. Nwa amuru na ulo bu nwa nne ya anuro di were muah.

      Delete
  32. Amaro m ka e si amu nwa n'ulo n'obodo m. A bum onye Anambra state

    ReplyDelete
  33. Una don start...most difficult langauge to understand

    ReplyDelete
  34. Nwannem Amanda Favour,i gboro ihe ewu n'ata. Aham bu Paul Okah. Abum onye Afikpo,na ofu Ebonyi Steeti anyi. N'ebem esi,ofu ihe i kwuru bukwa ife a na enweta n'ebe ahu

    ReplyDelete
  35. Haaa! Nke unu dikwa nma na obulu like that. Errrm, enwero mu idea ka esi eme ya bu ife na banyi, mana agha ma aju ese inugo. Dalu! Nara nsusu nke gi

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahahaha...
      Nneka, ihe idere bu engligbo..
      Daalu nwanne m nwanyi

      Delete
  36. Nne.. biko ji site.. I need lessons

    ReplyDelete
  37. Nne dalu,ekene diri gi.Otu a o di na awka etiti ka o di na ala m Enugu staati.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu unu o...abu m onye achina di nime anambra steeti

      Delete
  38. Ogini kwa Amanda favour..
    Aka m dikwa na enu🙌🙌🙌🙌🙌

    ReplyDelete
  39. Na una sabi make una follow do my language too.

    ReplyDelete
  40. Ezi okwu ka I kwuru Amanda UFO diri gi

    ReplyDelete
  41. Ndi Igbo anaghi eri nwa onye ozo.
    Ya mere ana si na nwata to cha ochowa nna muru ya!
    Anyi anaghi akwado ka agboho muo nwa n'ulo,mana otu obula osi diri nwata ga Cho imata onye bu nna ya!.
    Ndewoooo.

    ReplyDelete
  42. Ihem ma bu na nwa nne ya muru n'ulo nna ya bu ndi be nna ya nwe ya
    Amaghizim ma nwoke ozo mee ihe n'isi ya aga akporo ya bu nwa
    Ike ide ogologo akuko n'igbo adighim taa
    Amanda ibu ezigbo nwa afo
    Nara nsusu😘😘😘

    ReplyDelete
  43. Nwa kedu ije? Munwa bu onye Oraukwu. Ka esi eme ya na be Nne gi fa ka esikwazi eme ya na be anyi. Odika obu IDemili nine. Oburu na imegbi ego isi nwanyi owee mua nwa, osokwa ya ya buru gi tubaraya ime, ima akpozi nwa afu. Kam biakwanu ndi be anyi, kam nye nwam ala.

    ReplyDelete
  44. Na igbos plenty pass for dis blog... e be like umuafia community for things fall apart. Smh

    ReplyDelete
  45. Amanda, nwaanyi oma, daalu n'ife okwu a I delu. O masiri'm na edeghi okwu a na asusu olu ndi be unu maka na anyi bu ndi Anambra a gaghi aghota ife onye Ebonyi delu.

    I bia zi n'ife okwu a. Ife nne gi gwalu gu bu ife ndu be anyi bu nde Utuh na Nnewi South na Anambra Steeti n'eme. Nwa obuna amuru n'uno bu kwa nwa nna nneya. O ga aza kwa afa nna nneya. Obulu nwoke, o ga eso kete oke ka umu nna nne ya ga ekete, oburu nwaanyi, nna nneya ga akwuru ka mpa ya ma ochoro inu di. (Asi m nno kam jilu onu ndi bee anyi wee dee nkem)

    Utuh mbadike

    ReplyDelete
  46. A bu mu onye IMO state. Nwa o bula amuru n'ulo, onye ozo Mme ihe n'isi nwanyiahu, aya nwezi nwa ahu. Ighotago?
    Oga adi iche ma oburu na onye ahu mmere ihe n'isi nwanyi ahu achogi nwa ahu. Nkea nme, nwa ahu bu zi ndi mama ya nwezi ya. Ighotago?

    ReplyDelete
  47. This comment has been removed by the author.

    ReplyDelete
  48. Chukwu gozie gi Bv Amanda. Igbaliala!

    ReplyDelete
  49. Chukwu gozie gi Bv Amanda. Igbaliala!

    ReplyDelete
  50. Echefuru ika na odikwa iche iche ma oburu nwa Nwoke na nwa nwanyi. Nwa Nwoke ga aga choro nna ya. O buru na Nna ya achohu ya, ma o bu ochotagi nna ya, onwe ziri ike buru onye ala mama ya.

    ReplyDelete
  51. Obi di mu nma kamsi dee Igbo a....otego m deere Igbo. Igbo amaka!! Aga mu ele Africa magic Igbo ugbua!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Unu mara na nwada ahu a na-akpo komee no na instagram, turu ime mkpuke...o taa ka m mara o

      Delete
  52. Rosblis nwanne mmadu ibokwaru? Nde eme o. Oji River obodo oma.

    ReplyDelete
  53. IGBO Ndi oma Ekelem unuoo Abum onye Obowu di Na ala Imo state Na be Nnam nwanyi turu ime Na ulo mesie luo di, di luru ya ga akporo nwa ahu omuru Na be nna ya di ka nwa ya, mana oburu Na di ya akpoghi ya nwata toputa mmadu oga cho wa nna ya, Ndi be Nnam anaghi akporo nwada,
    nnem bu onye NENWE di Na aninri nke di Na Enugu state Na be nnem ,nwada muo nwa oga akporo nwa ya la be di ya mana di ya Ju Na ochoghi nwa ya Ndi be nna ya ga akporo nwa ya di ka nke Ha ma obu nwoke Na obu nwanyi,
    Nne Nnam bu zikwa onye onitsha Ado n idu di Na okpuru ochichi onitsha North nke di Na Anambra. Onitsha ga akporo nwa nwada muru Na ulo mana igaghi echi ozo ma obu igbu odu.
    igbo Na asu Na Olu Na Olu otua ka omenala ANYI si di iche iche. igbo Ndi oma biri kwanu oooo.

    ReplyDelete
  54. Ife na afio bu ituta ime ma gi anuna di.

    @Anchor, i kowalu ya ofuma.

    ReplyDelete
  55. Nwada Amanda daalụ maka isi okwu gị a.
    Ka e si eme ya na obodo m ala Imo, bụ na nwa ọbụna a mụrụ na ụlọ, ga-abụrụzi nwa nke ndị be nke nwanyị. Ọ ga aga n'iru zawakwa afa nna nwa agbọghọ ahụ mụrụ ya. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ ahụ mụrụ nwa na ụlọ mechazie lụọ di, ọ nwekwara ike ịkpọrọ nwa ahụ ọ tụtara n'ime mkpuke jebe be di ya ma ọ bụrụ na di ya kwete.
    Nwada Amanda, enwekwaramụ alo isi okwu ọzọ ị nwere ike ị wetere anyị. Ọ ga-adị mma ma ị wetere anyị isi okwu banyere Osu, Ohu, na Ume n'ala Igbo anyị.
    Ndị be anyị kwezoonụ ooh!
    Iyoooo!
    Anyị bụ ndị Igbo n'ewete ọkụ biko.

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141