Stella Dimoko Korkus.com: Osu

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Tuesday, January 10, 2017

Osu

Ndi BVs biko Bia kai kwoku...Amanda biala again....BVs Amu ma bia biko!









IGBO KWEENU..... YA!
IGBO KWEENU...... YA!
IGBO KWEZUONU...... ISEEEE...

Ndi be anyi ekele m unu o!
Nke onye chiri ya zere
Afo ohuru a ga-na e wetara anyi so ihe oma!
Eji m na-aka na anyi gbara ekereesimesi na udo?
Ngwanu ka-anyi koo n'ubi onye anyi biara
Umunne m biko ihe m choro ka anyi kparita maka ya taa bu ihe gbasara OSU .
Ile anya taa,ya bu ihe na ebuta nsogbu okachasi na ebe alum di na nwunye di.
Nwoke nwere ike ihu nwanyi masiri ya, ndi be ha asi na o gaghi alu ya n'ihi na nke nwanyi bu OSU.
Ajuju m were buru;

1. Etua uka batagoro na obodo anyi,o kwesiri na anyi ka ga na eze ndi OSU?

2.O nwere onye nwere ike ikowara anyi isi mbido osu n'ala igbo?
3. Odi nma ikwusi OSU n'ala anyi?
4. Onye kpochiri nti luo onye osu,o nwere ihe ojoo ga eme ya na ezi na ulo ya?

Ndi be anyi biko ka anyi tinye onu na isiokwu a ofuma.
Chukwu gozie gi dika i na-atunye alo gi!
Ka o di oge ozo
Nara nu nsusu

126 comments:

  1. πŸ˜©πŸ˜’πŸ˜ž......... I go be ✌

    ReplyDelete
    Replies
    1. Okwu osu Na ala Igbo bu ihea. Ejim aka Na mu azago gi ajuju gi nwa Ada SharonπŸ˜€
      Dalu rinne Amanda nwa Oma. Kam scroll zia down guo comment ebe mu Na amaghi much maka osu.
      Igbo mma mma nu oooo

      Delete
    2. Stella warrisdis naa..biko subtitle for us non ibos so we can learn too oh..I asked my bf the meaning of osu and he changed topic.im suspecting something πŸ˜•πŸ˜•

      Delete
  2. Replies
    1. Amanda Nwannem,igbaniala.
      Ndi igbo si na ha emebiela osu mana inesie anya ike,ha ka aso ndi osu aso

      Delete
    2. Amanda Nwannem,igbaniala.
      Ndi igbo si na ha emebiela osu mana inesie anya ike,ha ka aso ndi osu aso

      Delete
    3. Ndi osu na ala igbo bu ndi eji chuoro agbara aja, nwa amadi anaghi alu ha nala igbo nihi na agbara ahu ejiri ha chuoro aja na emekpa onye obula luru ha anya nala igbo. Ya mere ndi nna anyi ha anaghi ekwe ka nwa amadi luo ha, ha nebutara onye luru ha uchu.
      Mana ka odi ugbua, uka abatala bia mebicha omenala anyi ha, OSU adizikwaghi ire. Ha naluzi nwa amadi. Oga adi mma ka ebe mpaghara ufodu na aso osu ugbua kwusi ha nihi na akwukwo siri na onye obula jisos mere ka onwere onye ya, enwerechala onwe ya n eziokwu.

      Delete
  3. Someone translate for me please
    TGBaibay get in here quickly.
    I know the topic, I need to understand the content.
    My ibo both in speaking and understanding is as rusty AF.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahahahaha
      M already here. Nice topic!
      This osu caste system should be abolished!

      Delete
    2. @ Amanda and TGBAIBAY, where is the explanation in English version nau?
      #rollingmysexyeyes

      Delete
    3. Basic osu topic. The beginning and the consequences of marrying an osu. Seeing that civilization and Christianity have come, is it wise to ignore and go ahead to marry an osu? ...

      Delete
    4. Godbless you Julit. Chop kiss.

      Delete
  4. I didn't bother to read cos am one.. My 2 sis got very very luck thou they both married late, one to a fellow born again d other to a divorcee.. My case, very pretty homely and decent still no luck o! Once pipo reach village ask questions especially my Anambra brothers they go just find excuse break off. Well na to follow ofemmanu last last

    ReplyDelete
    Replies
    1. Anon How did you become one?
      How does one become an Osu?
      Still don't understand this Osu thing.

      Delete
    2. Eeh yah!
      Di gi ga-abia mgbe oge chi ruru inugo?
      Jisike!
      Obi adakwala gi mba!

      Delete
    3. But this Osu thing should be abolished nau
      I know it used to be practised in the olden days but is it still in existence till now?
      Na wa o.

      Delete
    4. chai nawa o,I really don't know why they still do it.my mum warned me seriously that I shouldn't even think of going near them.Personally,I don't mind marryiny one.All these things na barbaric customs and traditions and should be abolished already.

      Delete
    5. Sassy is cos of pipo like u that am still single . I also don't know anything about this OSU thing,I was told in hush hush about how my great grand father was sold out and DAT stupid story has followed my generation till date, anyways Amanda nwannem dalu

      Delete
  5. How I wish I fit speak Igbo make i try first

    Igbo kwenu, odinma,ozizo,odikwa

    I try jare *shine teeth*

    ReplyDelete
  6. Stella did u say AMU ma bia???

    ReplyDelete
  7. Umunne m biko putaba nu o...
    Ka anyi kapia okwu a onu
    Udo diri onye obula

    ReplyDelete
  8. #BringBackOurEnglish




    *Larry was here*

    ReplyDelete
  9. Anyi ewero.... ahh fuck it lol! We don't have Osu caste system where I come from

    ReplyDelete
    Replies
    1. Neither do we, though Igbo

      Delete
    2. Me too,but as long as you're Igbo,you're affected one way or the other.

      Delete
  10. Uka,oka omenala ndi Igbo?

    ReplyDelete
  11. Ndeme oo!
    Iche na mu ga agu Ivea?I ga asikwa..
    Edemede nke a na eye m headache Biko.
    Dalu rinne!

    ReplyDelete
  12. And Amanda daalu!!! You dey try *kisses*

    ReplyDelete
  13. Lol Stella you & this your amu ma bia sef. Amu means dick,it's ana ma bia

    ReplyDelete
  14. Why don't I know how to write Igbo? Or even speak fluently?
    I need to go back to Abakaliki ASAP

    ReplyDelete
  15. I don't have strength to read the igbo will come back later for that. How uba dey
    Stella ezigbo nweyi how far
    Long life sdk
    Long live Nigeria
    Forward ever backward never
    Floxydibs

    ReplyDelete
  16. Mua na onwem afuro ihe di njo na ebe ndi ana kpo OSU di, maka ife ahun bu omena ala ndi gbo. Ma OSU ma itufu umu ejima bu omenala di njo, anyi nwa bu umu Chineke ekwesi ina eme udiri emume ahun.

    ReplyDelete
  17. Afo ofuru Oma Amanda!...

    Asim kwuo,Osu kwesiri ka ekpochapu ya na ala Igbo!...
    Umu Nwoke ndi Osu na akpata ego nke Oma!...
    Oburu na mu anubeghi di jide umu fu onye Osu ji Ezigbo ego,
    Agam eme ngwa ngwa nuo ya!...
    Anam achi kwanu!...
    Achoro di m ima sef!...
    Si siba asiri!!...

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahaha
      Idi egwu!
      Eziokwu m ihe nkea dikwa nma ikpochapu Na uche nke m

      Delete
    2. Dika onye nne I bu, i ga ekwe ka ada gi nwanyi luo di osu ji ego?

      Delete
    3. Chief Mrs Linda Egobundum Money. Okwu gi nile n'ebido na ego, kwusi kwa na ego

      Delete
    4. Chai see intimidation.
      It is well with me.

      Delete
    5. Lol,I ji okwu biko.Okwo osu a bu ihe kwesiri ka ekpochapu ya n'ala Igbo.

      Delete
    6. Ndi nwoke ha nakppata ego eziokwu Mana ihe ogho m di na ya. Oga adi mma ma ekpochapu ihe gbasara osu nala igbo.

      Delete
    7. Chief Linda Ibu nnoo ezigbo nwafor.... πŸ˜…πŸ˜. Onwere ihe OSU mere biko nu? Ndi mmadu Ana enye ndi ha nnoo nsogbo...... oburu otu chukwu kere anyi nachaa?

      Amanda nnem daulu rinnee oo..

      Delete
    8. Chief chief,igboro ihe ewu na eri....daluooo

      Delete
  18. My igbo no done to read all these and translate. All I know about osu is my family can't marry them if not you will be ostracized. Families go for verification before marriage rites are done. It's not good anyway because I don't discriminate against humanity

    ReplyDelete
  19. Amanda biko let me write in English. Inugo. Osu by traditional definition is somebody offered to or dedicated to a god or an idol . Nobody living today in Igboland of Eastern Nigeria can claim to be a living witness to the origin of the Osu Caste System in Igboland, an ugly dichotomy that tends to make some people inferior before their ilk.

    I believe we can end the Osu-Diala dichotomy by educating our children on its frivolity and its tendency to destroy rather than build Igboland. A negative tradition created osu. A positive one alone can abrogate it. The Osu Caste System has become a challenge to the Igbo intellectual. No progressive people can allow a matter as frivolous as the Osu Caste System distract them from confronting the challenges from outside. dalunu ooo!

    ReplyDelete
  20. Nwa ada Amada, dalu na okwu nke ituputala, ihe gbasara osu bu nnkwu okwu n obodo ndi igbo nile, mana echiche mu bu n etu Uk siri we di osu ekwesighi kwe bu ihe n esere mdu n ibe ya okwu, na ihe na anyi nile bu Otu n ebe Christi nno.

    ReplyDelete
  21. Ezigbo nwannem Amanda Favour, ana me ekene. Mu na ndi banyi gbara ekereesimesi na udo oo. Chukwu daalu! Biko, gini bu di okwu osu ana ekwu maka since ndi small? Eziokwu, okwu osu never gree me to understand till date. Anybody that really understands the OSU matter should come explain, even though I have never cared to know or understand how it came about and all. Adirom sure na oka na ewu sef maka otego ezigbo aka nnu maka osu me nka, osu emero nko. Obu na oka ne'ewu, ogadinma ikwusi o na this century biko. Oooo nsogbu uwa!

    ReplyDelete
    Replies
    1. NNE daalu o
      Aka Na emesi kwa ya Ike o
      Mana Ana m eche Na oruola oge ekwesiri ikwusi ya bu ihe

      Delete
    2. Hahhahaa, at least I can understand a bit of this. the English infused made it somewhat understandable. Sha...sha...sha...shame on me.

      Delete
    3. πŸ˜‚πŸ˜ƒπŸ˜† Dont mind me o..dont know how to write in igbo. Forcing maselfπŸ˜₯

      Delete
    4. Akuko! Forcing butty. Two of u can speak n write fluently in Igbo especially this fake Bloggy. Y announcing u can't write in Igbo. I detest fake people. Ndi ala

      Delete
  22. we Abians didn't believe in osu especially ohafia side.

    ReplyDelete
  23. It took me minutes to read and understand. Okay please let this OSU thing stop biko. How can we segregate yet we claim we are Christians. Maybe government should come in since we igbos stubbornly don't want to abolish it. Rubbish

    Mrs SDK may our Mother of Perpetua Help continue to intercede for your Children since GOD is using you to seeing the children of other people through

    ReplyDelete
  24. Nmu bu Chi exotic, Ana ime eze Ndi osu!
    Chineke kere anyi ofu
    Mana owe agboho nma bu osu
    Nwanyi a aka go nka mana owehi Onye icho inuya.
    Ke Ife mere nu?
    Biko Onwe Onye ma akuko Ndi osu ofuma, ya ko wa ra anyi.

    ReplyDelete
    Replies
    1. U ve tried my dear chi Exotic. I know u well n know how u struggled to write in Igbo yet those two igbotic fools re claiming they can't write in Igbo especially Bloglord that grew up in face me I slap u full of Igbo blood. Ana akogheli

      Delete
  25. TGW and Iphie, please interpret. Thank you. hehehehe

    ReplyDelete
    Replies
    1. Well, I go try write wetin I sabi don't beg me to translate cos stella no gree translate for us, here we go: nennekekber inabiogigbijigbi, asantaamalaywadada afitinidi asanwa majigbijigbi onwualanta terryg mbokki sawalelajaabo well if U understand what it means good for U o so far sey na me understand wetin I type

      Delete
    2. Anonymous. I di bad. Rotfl

      Delete
  26. Nne m Ekene mu gi!

    Osu Na ala anyi bu nnukwu ife ana Ezo ezo. Ufodu ga asi Na osu adighi. Mana osu di. Ofuma kwa.

    Na mbu ka osu si wee bido di ka nna m si koro mu. Enwere ndi Obu Na enwudoro ka fa buru oru(slaves) oru Eze. Nwere di bu osu maka aru nna nna fa kpalu. Enwere Otu osu ozo bu ndi oru eji achy aja. Ife di ka Enwee ka Chi Ma obu alusi si wee iwe,obu udi ndi a ka eji achu aja wee bida iwe ndi a.

    Osu ndi a nile nwere ife jikoro fa Nile. Ana aso fa aso. Fa bu osu. Ndi ozo,buru ife ana akpo "free born"

    Ndi Anambra adughi emekari osu. Mana odi Ike Na udodu ebe Na Imo Na Enugu states. Ama mu Na enwere osu Na Amechi Na Arondiizuogu.

    Na Oge gboo(olden days) mmekota osu Na ndi Ala muru bu nnukwu alu! Adighi ekwe ka ha luo ndi Ala muru. Ha Na-alu so onwe fa. Fa Na-ebikotakwa onu.
    Mana kita,obenatago oblele. Fa Na Ndi a muru Na ala Na emekorita. Beelu so Na ilu di Na nwunye. Obu ebe a ka nsogbu di!

    Ife Izizi ana aju ndi Na acho ilu nwunye Ma Obu nwanyi bu "Kedu ezi na'ulo fa?
    Otutu mmadu adighi ekwe. Maka Na iluo osu,obodo amapu gi. Gi Na ndi ozo agaghi emekorita. Obu n'ihi ya ka ndi mmadu ji stuff ujo. Mere Na fa adighi ekwe ka umu fa luo osu.

    Mana ife a bu bullshit!
    Anyi Nike bu ofu n'ime Chukwu!
    Ekere anyi Nile Na oyiyi Chukwu!
    Onye Chukwu zoro,onye afu aburugo onye ohuru.

    Ka anyi jikoo aka onu juu ajo ife a ana also Osu. Anyi Nile bu nwanne n'ime Jesu.

    Ogwu ka ora mu Na Onu!

    Igbo Kwenu!
    Igbo nuonu!
    Nuo nu!
    Rie nu!
    Igbo kaa nu!
    Igbo Mma nma nu ooooo!

    Iseeeeeeeeeee!!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daaly nwanne m
      Nkowa gi amaka!
      Chukwu gozie GI rinne

      Delete
    2. *ufodu
      *obu n'ihi ya ka ndi mmadu ji atu ujo(not Stuff ujo)
      Lol



      Chief Chief!
      The Chief Herself!
      Osodi eme ogo 1 of Igbo Land!
      Nwa Nne m onye Oga Adili nma!!!
      Nne ekenee mu gi o!

      Delete
    3. Oh my goodness! Teacher, na so you de do?

      Delete
  27. M fube ndi osu Na bemu bu Amandim Olo.

    Ha kwesiri wepu ndi osu

    ReplyDelete
  28. Daalu Nwa ada Amanda maka isi okwu a I wetere k'anyi tulee.I kwu ezi okwu,a machaghi otutu gbasara isi okwu anyi a.Kama otu ihe doro m anya bu na ihe gbasara osu,ka bu ihe di ezigbo mkpa n'ala Igbo.A ka n'aso osu n'ala Igbo nke ukwu.

    A bia n'ebe a n'alu di na nwunye,otutu ezi n'ulo a n'aghaghi ekwe ka umu ha luo onye O bula bu osu.A fugokwa m ebe nke nwoke kachiri nti wee luo Nwata nwanyi oha Obodo mara na o bu osu.Nkea mere ndi oha ododo no kuo ekwe,maa okwa si na ha bu ezi n'ulo a gaghi e nwezi mmekota o bula na oha ododo.

    N'uche nke m,osu a buru go ihe kwesiri ka e chefuo ya.O buzighi ihe kwesiri ka a n'eme ya n'oge dika ugbua.Daalu kwanu o.

    ReplyDelete
  29. Oriegwu.na who go read all dat.

    ReplyDelete
  30. Osu doesn't concern igbos alone na. This should have been in English to get more feedback.

    RME

    ReplyDelete
  31. if you cannot understand the igbo version please wait until 3pm,there should be something for everyone then.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Pls we are waiting, they are outcast Igbo's like us but I have heard of it long time ago...great job Stilz

      Delete
    2. Oh great! I look forward to that

      Delete
    3. Oh great! I look forward to that.
      *moonwalks outta post*

      Delete
  32. Amanda I bu nno nwa igbo amusiri Ike n'elu akwa 😜.
    Ndi be anyi si Na Uche onye adi ya njo.
    Ihe gbasatara osu a bu nno Nke ekweghi etinye onu, ogwuru Ike. Nke kacha njo bu Na even on top the whole Christianity, ndi nne Na nna anyi Na aju juwaa isi ma okwu alum di Na nwunye bata n'onye osu.
    Ka m nye aziza dika m Siri ghota

    2. Nnam siri Na Mgbe mgbe ochie, Ufodu ndi n'obodo na-emekpa Ufodu ezin'ulo ahu, Na-egbusisi ha ka okuko. So Ka ha gbanari onwu, ha gbakuru Arusi Ka o Chekwaba ha, buru ha ndo, n'ihi ya ndi obodo wee rapu ha maka Na ha bu ndi arusi nwezi, they are no more freeborns. Ha wee baa ha aha "osu"
    1. Osu kwesiri ibu akuko Mgbe ochie esp Na ezi Na ulo kwetere Na ha Na-ekpere Chineke n'ime mmuo Na Eziokwu mana o bu ihe mwute that such isn't the case. Onye no n'ime Kraist bu mmadu ohuu onye rededicate ndu ya nye Chineke.
    3. O di mma Ka akwusi ya bu ihe maka o affectigo a lotta would-be marriages (personally speaking)
    4. Onye kachie nti luo onye osu, ndi umunna nwere Ike igbahapu ya Ka onye enweghi mmadu. O nweghi mmemme obula I ga-eme ha ga-abia and they won't invite you as well, e nweghi echichi obula I ga-echi Na obodo gi, enweghi political position I ga-occupy Na obodo gi, umu gi Na umu umu gi ga-abu osu, I gaghi etinyenwu onu Na ihe Na-eme Na umunna ma obu obodo gi, ya dirigawazie.

    O bu ihe joburu usu ma sigbuo nkapi na Na-agbanyeghi the so called westernization and civilization, Na ndi igbo Ka-Na ako akuko osu rue taa, ndi Igbo onu na-eru na 'okwu kwesiri itinye onu tinye aka ka a abolish the osu caste system n'ala igbo nile.
    Dalu ri nne, ya gazie.

    ReplyDelete
  33. Osu is real, na obodo m Ndi osu na ebi na akuku ahia(market). O buru na ije be onye osu rie nni or nnuo miri, e nwee sore throat (so true.)
    Nna m gwara anyi na Ndi osu bu Ndi ejiri suo aja( sacrifice) mgbe mbgoo.
    Umu nwanyi ha na Ama ezigbo mma manna umunwoke ha na eji ego.
    But when you marry the one tha has money people don't talk about it. Amam otutu Ndi luru osu in my village, mana maka ha ji ego enweghi onye kwuru okwu. Is all about the money finally.

    ReplyDelete
  34. Ndi be anyi ekelem unu oo! Amanda nwanyioma I Na agbali ebe o di ukwu,jisie Ike ezigbo nwa Ada igbo.
    Ihe gbasara osu n'ala igbo bu otu ihe ndi igbo n'ejighi egwu egwu.
    Na mgbe ochie,otutu bu ndi eji chuo aja wee nye agbara,ndi di otua ka a na-akpo osu. Ndi ozo bu ndi a mapuru na obodo iji taa ha ahuhu maka ihe ojoo ha mere(ostracisation). Otutu ndi adotara n'agha sookwa Na ndi a na-akpo osu.
    N' Uche nke m, o kwesigi Na aga na-aso osu ruo ugbu a nihi Na choocchi ewerela onodu. Ihe gbsara osu bu ihe meere n' oge gboo tupu ndi choochi abata.

    O ga adi nno mma ma oburu na - aga akwusi ihe gbasara osu n'ala igbo nihi Mmadu Nile bu otu n'anya chineke.
    Ndeewonu.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nne daalu rinne!
      Nkowa gi amaka
      Chukwu gozie gi onye oma

      Delete
  35. Aka na-eme ihe osu n'uwa kita bikonu? Hia! O dikwa egwu o. Ndi be anyi (Aku) anaghi eme omenala Osu.
    Mmadu niile bu otu n'anya Chukwu Abiama

    ReplyDelete
  36. #Every exit is an entry somewhere else*

    ReplyDelete
  37. Nne, daalu na-okwu a I butere na-ebe a. Ife gbasara osu bukwa nno nnukwu ife na-ala Igbo. Nne'm ama gi nti nukwa na obu osu na abiara umu ya okwu di ma obu na umu ya ndi nwoke choro inu nwaanyi bu osu.

    Ife a gbasara osu bukwa ife na edochaghi ndi Igbo anya maka na obula di nani onye enyefere ndi mmuo ka anyi na-akpo osu. Mana onwegasili ife mmadu ga-eme, ndi ebe ahu e tuo ya osu.
    Ife kachasi eweiwe n'ime ife osu a bu na, o daghi agwu agwu. okwa nwa nwa nwa ha, dirigawazie, ife a bu ezigbo ife ojoo. Mana onye bula na-ezere isi fa.

    Ha si'm kwuo, m ga asi si kpochapu ife gbasara osu mana, onye ga ebido ya?

    Obi anuli nwere bu na, ndi agbala ohuo na-amaro ndi bu ndi osu na agbataobi ha, enwero ike I gwa umu ha, site na nke a, onwere ike iru oge, ndi mmadu agaghi ama ife di iche na osu na diala.

    O di kwa egwu, mana gini ka mmadu puru ime. Onwere otu igwe n'obodo anyi si na o mebigo ife osu, ndi alaa wee si ya nuru onye osu, nu Nye nwa ya nwoke, o ju wa isi.
    ka anyi n'ekpe ekpere gbasara ife osu. oburu na Mary Slessor mara ife a na eme ndi osu, o gaghi e be n'ikwusi ogbugbu umu ejima, ogara eji kwa amamife Chineke Jiri gozi ya, wee kpochapu ihe gbasara osu.

    ko di

    e maki kwara m sense?

    ReplyDelete
    Replies
    1. Onye oma daalu
      Nkowa gi amaka!

      Delete
    2. Nwada Chiamaka,okwu gi kwu oto nnoo. Eziokwu dika I kwuru,o buru Na Mary Slessor maara ihe gbasara osu,ogaghi akwusi n'ebe igbu ejima.
      Ma ekpere anyi bu Na Chukwu ga-enyere anyi aka ma mepee Anya ndi igbo anyi n'ebe okwu a di.

      Delete
  38. The Igbo race world over should be ashamed, in this 21st century, we still have Igbo families that discriminates based on old ag traditions, one don't have a choice into which family you are born into, yet you get discriminated based on this archaic tradition that should be discarded with promptly, yet Igbos accuse the Nigerian nation of exclusion, yet they are their own number one enemy,say for instance, biafra is actualised,there will still be the osu caste system,which means later on, those osu too among the Igbos will start clamouring for a state of their own abi, another South Sudan in the making, Igbos think and get right, no to osu caste system, all men are born equal and free

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nkea inasu bugodi oyibo!!! Dont get it twisted, i use to think this whole thing was a child's play. Even the so called elite, pastors and the high and mighty know this is not the matter of speaking English. They all pretend to be mordern but when its time for marriage, they will do proper investigation. Ihe nkea gwuru m ike dianyi

      Delete
    2. You guys are making sense. I hope people can just do the right thing and stop this segregation of a thing. I remember a lady that made a comment about going against her people and marrying her OSU guy who has now turned out to be the most successful... May God help us

      Delete
  39. Errrrrm,please while at it, you guys should tell us stories about this Osu thing....thanks!!

    ReplyDelete
  40. The sad part of it is that we IMOITES carry the thing for head pass Anambrians, Abians and other igbo speaking states.. and the irony is that some of the Osus and Umehs are really progressing in life than the ndialas..My mum even laff about the whole thing that we allowed the osus to live in the marketplace while the Ndialas inside the town , why wont they progress??

    Even in My church, A member once said that yes she was a christian but will never marry an Osu that God can heal an HIV Person but not an Osu person..Sad indeed..

    ReplyDelete
  41. Na ebi chineke nor Oweri oye bu OSU so osu adioma.....

    ReplyDelete
  42. Ihe gbasara osu a abughikwa obere something. Imagine na ndi mmadu gara siara onye na abia ilu my sister na anyi bu osu. Mgbe abiara mewezie inquiry o buruzie na enwere my grand aunt luru osu na obodo ozo. Inukwa mmadu itinye mmadu ibe ya na problem. Amanda, ana m a support ka eme this osu thing abolish. Ndewo kwa

    ReplyDelete
  43. This osu thing is crazy. My dad told me when I was in secondary school about it. He told me all the osu families in my village and that I can't mingle with them talk less of marriage. It's a really scary tradition. My BESTFRIEND is an osu I was warned to stop being her friend but I still sneak around to see her and hang out. The funniest thing is even people with Ph.D. Will still tell u that u can't mingle with osu despite their level of education. I don't think it can be abolished honestly. All I see is people getting stubborn and marrying who ever regardless. My dad to me is the most educated/exposed person I've come across and if he can still say stuffs like that I mean who won't say it? Point of correction it's not only in Igboland I'm from delta state and this stuff is everywhere they just have different names for it in other languages.

    ReplyDelete
  44. The Osu people are so rich and beautiful

    ReplyDelete
  45. So me that need to understand the osu system but can't understand igbo, how do u expect me to understand what u just typed?

    ReplyDelete
  46. I don't believe in it, hence I married one. Everything has been working perfectly to the Glory of God.

    ReplyDelete
  47. Ibu nwata nwayi Osu nwere agwa Oma, nwere obi Oma, nwekwaa ezigbo aka oru. Leave your contact Biko nwanne m nwoke nwunye ya mwuru choro ilughari nwayi.

    ReplyDelete
  48. Pls bible says that thires no condeminetoin for those that are in christ Jesus, abeg make une live that osu stof is no more esisten jooo

    ReplyDelete
  49. Nwaoma Amanda, iji akuko kajara akaja bia

    Ihe gbasara Osu no agbawoju Anya.

    Akwa umu agbogho anya cham cham cham, na anaghi eji mkpuru anya afu nwoke. Fa hu nwoke, fa araaaaaa nwoke, rapuya isi. Oruzie mgbe nwoke ahu choro ilu ha, ndi okenye, ajuwa ka nwoke obu Osu. Aghotarom oo. Kedu Ife di iche na irara nwoke bu Osu na ilu nwoke bu Osu. Fa aghotaro na ira nwoke, Ife ojo niile nwoke ahu metere na ndu ya esoro gi.

    Achokwaram iji ohere a, juo umuada ndi ahu onabu, na ara nwoke na otu obali (one night stand), unu ona agbakwa mbo mara ka nwoke ahu obu Osu tupu unu ayakapu wa panti.

    Ihe gbasara Osu bu Ihe eji amamighe eso. Ogwula ka oha m na onu.

    Unu dooo
    Unu gbakwa mbo soro mkpotu ulo uka unu na eme na ubochi

    KING XOXO MYSTERY

    ReplyDelete
  50. Its not just an igbo thing, it also happens in some tribes in Edo state.

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141