Stella Dimoko Korkus.com: OKWU MBITE

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Tuesday, June 06, 2017

OKWU MBITE

If you cannot Understand or write Igbo,excuse those who can while you read..Inugo?



IGBO KWEENU.......Yaa!
IGBO KWEENU........ Yaa!!
IGBO KWEZUONU...... Isee !!!

Ndi be anyi mmammanu !, nke onye chiri ya zere , O kwanu nwanne unu nwanyi bu BV AMANDA FAVOUR na-ekele. otela aka anyi sudobere asusu IGBO anyi na bloogu a, ya mere m jiri si ka anyi suo ya ta.

O nwere ajuju nwanna anyi bu B.v Chike juru m otu ubochi ebea, o siri m gwa ya ije bu window n'asusu IGBO. O bu ajuju a butere isi okwu m choro ka anyi tulee Tata bu OKWU MBITE.

Asusu o bula na-ebite mkpuruokwu n'aka asusu ndi MBA ozo wee mezuo nke ha ma o bu mee mkpuruokwu Di n'asusu ha ka o bawanye uba.
Ndi bekee, French, Yoruba, Awusa bitechara mkpuruokwu di iche iche wee mee ka asusu ha towanye. Ndi IGBO bitekwara Ufodu mkpuruokwu site n'asusu di iche iche mana anyi na ewere okwu mbite ndia dika okwu IGBO.

Omumatu Ufodu okwu mbite ya na asusu esi bite ya ..

1. Windo...... Bekee
2. Osikapa.....Awusa
3 Tebulu.........Bekee
4. Boolu.........Bekee
5. Akamu....... Awusa
6. Ogbono........Yoruba
7. Akawo...........Yoruba
8. Bokwu............. French

Chike ihulanu na windo bu mkpuruokwu anyi bitere n'asusu bekee? O buru na o nwere okwu mbite IGBO I Mara biko Bia gwa anyi.
Umunne m ogwukwanu ka o ra m na-onu, ka o di oge ozo.
Daalu nu umunne m

BV Amanda favour


Osikapa bu rice Okwaya?


224 comments:

  1. I just feel like eating @OHA soup after reading this igbo language



    @Galore

    ReplyDelete
    Replies
    1. Taaa. Gbafwo. Oha gini? Gosim onu ichorigi ri oha

      Delete
    2. Ana m ezitere gi oge ora na ngwugwu akpu abuo....hehehe

      Delete
    3. Anybody wen go curse me for igbo language. ..make GOD help me punish am this rainy afternoon MABASI





      @Galore

      Delete
    4. Is stella igbo

      Delete
    5. Stella by nwafor wafi. Mana ona o na sukwa igbo oge ufodu.

      Delete
    6. E chekwa m na window bu mpio. ndi kam mara ngwanu oo

      Delete
    7. Please what is "bokwu" @ Amanda et al

      Delete
  2. Interesting.....ndi igbo ke ebe unu no?

    ReplyDelete
  3. Replies
    1. Ife nlacha m!💋
      Nne kedu Ije?
      Bia were nsusu Nwa oma m💋

      Delete
  4. Ngwanu ooooo, ndi yardi m
    Igbo kwenu!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. @pipi lee,Ama mm na aga m afu gi ebea...lol
      Kedu nke na eme?
      Umu egwu ndi a i na-agu ubochi nile a gara aga na atogbum atogbu ooo...pipilistic pipee!!
      Ima ife ana aru..#wink

      @MARTINS ABOY

      Delete
    2. He he he he he he he, ogbo m!!!
      Nna daalu, m na agbaghara gi nke ukwuu. Na agbalisi ike na Chineke na agozi gi ugwo oru do ukwuu.

      Eleghara m typos biko (Ignore typos pls)

      Sandy Yo!!!!
      Kedu nke na-eme?

      Delete
    3. Pipi nwa, kedu ka i mere
      Ana m ekele o !

      Delete
    4. Pipi Yo ezigbo neighbour m, onwero kwa nke na eme o. Adim mbada okay😂😂😂💋

      Delete
    5. Amanda, ekelekwa m gi nwanyi oma, I ga-ada na aha Jisos.

      Delete
  5. Umunne m omenu !!!!
    ngwa putabanu, ka anyi suo IGBO
    Stella iji ya, kuoro Onwe gi aka...hehehe.

    ReplyDelete
  6. Nwa ada Amanda Favour Olisa bi n'igwe gozie gi nke oma.

    Biko ubochi ozo i kenesia umu Igbo ibe m(Igbo kwenu ) I tenye kwa "Awkuzu ekene m unu" maka na obodo m bu Awkuzu anaghi ekwe ekwe, inugo nwanyi oma? Lol

    Dalu!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ah Chike Chyko!
      I bu onye Awkuzu?
      Chai!
      Kita ka mu ghotara ife mere iji enye nsogbu ebe a. Nwa Awkuzu ka I bu?
      Okwa Nwa nna ka I bu!

      Delete
    2. Odogwu nwoke!

      Anula m ihe ikwuru

      Delete
    3. Nwunye G abu m Nwa afo Awkuzu, nwanne Igwe John Nebeolisa, Awkuzu ka ome, Awkuzu emena emena Awkuzu emekwa ozo... Lol

      Delete
    4. Ya bu n'ekwesiri ina-egbuchapurugi ebe opuru iche?@chike
      O chim! Nsogbu dikwa. Ngwanu oo Amanda inulanu.


      Igbo bu igbo ya gazie ooo

      Delete
  7. Replies
    1. Lucile ADA oma ekele m gi

      Delete
    2. Ogiri bu Igbo
      Ogbono bu igbo

      Delete
    3. Mba kwa nwanne'm,ogiri bu igbo. Ogiri na yoruba bu iru. Akamu bu kwa igbo, hausa na kpo ya kamu mor bu koko. Ogbono bu nu igbo nu, yoruba amaho ihe bu Ogbono ooo...Dalu unu umunna na umunne.

      Delete
  8. Amanda favour abiala ooo...can't come and kii maself ontop reading igbo,its too konk.Ah ah abeg explain what you wrote in igbo to english for me joor or summarise.Nice one though

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ekwunwe kwa na!!! 🙊🙊🙊
      Espeakilekwene espeak!!! 🙊🙊🙊

      Oputara na ibu onye Igbo mana imaghi asusu igbo as? Lol

      Esther Mgbolu hichapu aka ijiri dee ihe a

      Delete
    2. hahaha... Esther Jisike guo ya, I ga aghota ya

      Delete
    3. Hia oh okwa afunuro

      Delete
    4. Onye nke bu, mama m gwara m na mbu onye Igbo.

      Delete
    5. Unuu sii gini?lol you bvs need to see ma face concentrating,trying to read this,hahahahahahahahahahaha... some one saw ma serious funny face and mouth twisting,reading,trying to comprehend what i was reading and snapped me,chisos my facial expression was epic

      Delete
    6. Ezikokwu ka ikwuru Priscababe!...
      Asi ndi Igbo puta,Esther Mgbolu etiri ka nwamba maputa!...
      Ihea bu ihe ihere!!...

      Biko ndi nne na nna no ebea,kuzibere nu umu unu asusu Igbo!...
      A na m asuru umu akam Asusu Igbo...ha na aghota kwa ya nke Oma!...

      Delete
    7. Queen and boss, ihe ikwuru by ihe mere eme. O kwa asiri anti subakwa Igbo.jisie ike subara umu gi Igbo.

      Delete
  9. how can i read what i dont understand



    waiting for yoruba turn sha

    ReplyDelete
    Replies
    1. Mbo lo ti wa?

      Oya ema lo jor...

      Sari lo jor... Lol

      Delete
    2. Bashiru Onye ofe, mechie onu gi ebe afu

      Delete
    3. Amarom ihe bashiru na acho ebe a!...
      Biko nyere anyi Efe!...anyi achoghi unu!...

      Delete
  10. Amanda kedu? Idi ofunma

    Ndewo ooo ndi yardi nkem

    ReplyDelete
    Replies
    1. Bia nwanyi a, ibudi Onye Igbo? Eh gi yori yori!

      Delete
    2. Yori yori nwa!
      Oma una ASA ahu!
      Ana m ekele
      apasa m na ogbe
      udodi

      Delete
    3. Yori Yori Nwa!!! Ewoo men pasa n'ogbe, juo ese I ga ahu na ha bu alobam.

      Delete
  11. Nna mehn...nsogbu di ebea. akuko na egwu ga eju here now. tueee tueee Ala nwa nyi Asaba Sharumi

    ReplyDelete
  12. Bloogu - English


    Igbo amaka...
    Ebea ka mu ga ehi ura ubochi taa.

    Nwa ada Amanda Favour ekene ooo.
    Oga diririi gi na mma.

    Afo juputara m na obi uto maka osisa gi a. Imela nwannem nwanyi.

    ReplyDelete
  13. Nwa Ada Amanda, oge n'adighi anya, Biafra nwere onwe ya, aga enye gi onye isi edemede obodo biafra. Jisieike nwa ada di nma!
    Enwere otutu okwu mbite n'asusu di iche dika,
    Restaurant: ndi oyibo bitere ya n'okwu french!

    Just Krix!

    ReplyDelete
    Replies
    1. E chiem e nor na abroad? Igbo gi manma o. Jisike nwoke oma. Ke maka ochiria Lizzy?

      Delete
    2. Lingerie e bite kwara ya Na okwu French.


      Ekene mu gi Mazi Krix!

      Eji m Na-aka na aru di gi Na ezi n'ulo gi.
      Oriaku anyi a?
      Tuolu mu ya afa!
      Tuolu m ya "Di Malu anu"

      Delete
    3. Krix nwoke oma biko, bikonu, bikozianu bia laa nu mu otu. Adim serious papa. Igu gbugom💋💋

      Delete
    4. Hahaha mazi krix, Ana m ekele o!
      Enyekwa m oru a ,o maka kwa...hahaha

      Daalu rinne nwoke oma Ndi IGBO ji eje mba

      Delete
    5. Restaurant by ulo erimeri ngwa kenee mu

      Delete
    6. Anon 14;16, o bu krix na-agu gi ka o bu ego ya? Kwuo eziokwu!
      I na-acho ezi na ulo I ga etisa
      ADA Delilah!

      Delete
    7. Hahahahahahhahaahahhaha
      Anon 14:16...
      Isi emebigo gi!...
      Ichoro itinye Kris onye mgbasa ozioma chukwu na onwunwa!!...

      Kris Ngwanu,bia laa nwa Ada a otu!...
      Osi na ife gi na amasi ya...
      Kwakwakwakwa...

      Delete
    8. LMAO🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣


      Hahahahhahahahaha chai!
      Ebee ka ufodu si puta bikonu?🤣🤣🤣🤣

      LMAO @bia laa nu mu otu Papa🤣🤣🤣

      Delete
    9. Lol
      Lmao
      Lwkm
      Hahahahahahahahahahahahahahahaha
      Anon 14:16 ishi nini?


      Nwunye G, anon 14:16 si na OTU wee puta. Ya mere ila otu gi ato ya uto nke ukwu.

      Delete
    10. Lol

      Kris onye Nna bia ka ila ya otu.

      Otinyere kwa papa... Lol

      Delete
    11. Nwunye General, Ndi igbo anaghi adult lingerie. Ha na akpo ya Peteri ma obu durosu. O bu Ndi bekee biters lingerie from French

      Delete
    12. Chike Chike, akota nke di onye oria mma osi dozigodu ya isi. Ochi si ka otgbuo'm!
      Anon 14:16 Biko chegharia ma nabata onye nzoputa na ime ndu gi.
      Nkea bu okwu ofuo (papa)

      Just Krix!

      Delete
    13. Okwu so! O ka ihe nracha sia ami...

      Delete
    14. 🤣😂😂🤣🤣🤣
      Anyam afula ntim
      Anonymous 14:16
      Chim oooh! Efuom oooh
      🤣😂😂😂😂

      Delete
    15. Oooo Chimoo(OMG)!
      Onye a osi na owu gini?
      Cheagharia nwanne m nwaanyi, Jisos na abia n'oge na-adighi anya.
      #kwusiIko
      #kwusiAguuMmekoahu

      Delete
  14. Igbo ndi oma na ege nti, enwerem otu ajuju, ajuju'm bu nkea, onye ihuru n'anya, iga akpachapu anya mee ya ihe ojoo?
    Ubochi nta anyi achuo na owerri nchi!

    Just Krix!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Aziza maka ajuju gi a bu Eeh.
      Ndi be anyi siri na onye ma mmadu na egbu ya.

      Mana ama m na obu maka Stella ka ijiri juo ajuju a... Lol

      Otee la omebere gi many many things... Lol... Ndo onye oma Kris. Ahotaram ka osi eme gi.

      Delete
    2. Lol!!
      @krix,osisa ajuju gi bu MBA!!!

      Kedu ife mere iji aju nkea nwanne??
      O nwere onye mere gi ihe ojoo??

      Biko gbalia nwebe obi anwuri ubochi niile..Uwaa enwero ife di na ya..

      Jisie ike!! Chukwu gozie gi..

      @MARTINS ABOY

      Delete
    3. Mba!!!
      Maka na onye obula I huru na-anya bu so ihe ga na-ato ya uto ka I gana eme

      Delete
    4. Lol
      Hahahahahahahahahahahahahahahaha

      Queen na Boss okwa ngi hapuru Stella owere Ola di gi na Sexy Spermy Daddy wee na eme Kris ihe mgbawa obi...

      Delete
    5. Hahahahahagahahha
      Obi mgbawa is real, ndo o Oga Khris

      Delete
    6. Oziza ajuju gi a bukwa KAPITA EHH, 'obi di aghugho' nwannem

      kedu ihe ojoo kariri di ma obu nwunye ina aghogbu (cheat) nwunye ya, ma obu ya na nwanyi ozo ana edina ebe onwere nwunye n'ulo.

      Delete
    7. Hahahahaha
      Chike,gbaa mu okpa na eze!...
      Stella,emero nke Oma...Kris biko gbahara ooh

      Delete
  15. Lool! Oburo obele Ife. Biko gini bu Boolu na Bokwu na onu oyibo? Daalu so!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ife ana-akpo Bolu bu Ife ukwu egwuri-egwu.

      Delete
    2. 😂😂😂😂😂😂😂@TGW...

      Delete
    3. Oops! Ed daalu!
      Hahahaha! Nwuge G a sef! Afum na Ife di na ukwu na ato gi pieces😉😜

      Delete
    4. Bokwu bu plenty na onu oyibo

      Delete
    5. Nwunye G Ana m achiliri gi aka Beyonce na jay-z elu...hehe

      Delete
    6. Amanda Nwa oma!
      Nne Ekene mu gi o!!!!
      Nne iga adi o!

      Delete

  16. i naanị ịghọta ihe ole na ole n'ebe a, nwere ike onye biko ịsụgharị

    ReplyDelete
  17. Hmmm Nwanne m Nwanyi AMANDA FAVOUR..A Na-eme Ekele gi o..Daalu oo..Ji si ike inu Nwanne m...SDK blog ebe o na kpotu...

    ReplyDelete
  18. Nd'alu nnwayioma. 👏
    Very educative.

    Kedu maka ahia?

    Yes Stella osikapa bu rice, igbaliri.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu nwanne mmadu
      Ahia na-aga nwayo nwayo

      Delete
    2. Nemerem ka ubochi taa shiri gaa?
      Igakwara ofuma?
      Ndo.

      Delete
  19. Oga ooo... Yoruba abeg, do una won na

    ReplyDelete
    Replies
    1. Afi won. Kikikiki Anumanu

      Delete
  20. Nwanne nnwayi Amanda, hmm jisike, Ndewo nu ndi ba enyi, azuzu anyi amaka

    ReplyDelete
  21. Nwa Ada Amanda,dalu rinne,okwu GI kwu oto dika ife umunwoke ji anyu mamiri😂😂😂😂😂😂😂😂
    Enwere otutu okwu mbite di iche iche dika:
    Faanu- Fan na ndi ozo....

    Afurum unu na anya rinne😘😘😘😘😘😘😘

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahaha B.V Ed, imebisigo
      o kwa na okwu m kwu oto dika ofe Umunwoke ji anyu amiri...hahaha

      Delete
    2. Lol..
      Bia Ed akuko adighi mma... Lol

      Ishi nini?

      Delete
    3. Ed onye mere gi ihe? Lol
      Elastic oma kwa na idi ona? Lol
      Ajo ife nato amu... Hahahahahahahahahahahahahahahaha

      Delete
  22. Igbo bu igbo mmammanu o,Amanda inwaka oo!nwanyioma,stella onu na ekwuru ora na germany! Ekene kwam gi oooo!ka ogara anyi nile oo!ka kwanu nka umu nnem! Giant -english,bikonu gini bu BLUE na igbo,suya ,yabasi-hausa, JIGIDA-HAUSA AGIDI -YOURBA AKAMU-YORUBA ASHAWO- #udo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu onye oma
      IGBO nwere mmadu !

      Delete
    2. Agidi bu igbo, o ekò bu Agidi na asusu yoruba. Jigida bu kwa igbo, ndi yoruba bu ileke ka ha na kpo ya na asusu ha. Dalu kwa nu.

      Delete
  23. Eeeyioo! I zatatara ya nwada Stella, Osikapa but Uroisi, ufodo n'akpo ya raisi. Bv Amanda ejim ezigbo Ekene n'ebe oburu ibu n'etu isi agba nnukwu mbo ihu na asusu anyi Ka n'eku ume. karichaa na odide na ogugu ya. Mana otu nnukwu nsogbu m nwere bu na umum na aghota asusu Igbo nke oma, mana ha amaghi asu ya!. onwere otu mgbe mu na ha so gaa nmeme, Nnem na nnam ajuo ha ajuju, umum kedu Ka unu mere? osisa ha atoghi uto na nti Chaa Chaa! Ha Zara si, odi Mma! Mana odara Ka mgbe onye Ocha na asi odi Mma.

    Bv Amanda favour, onwere otu ezigbo ajuju Di ezigbote mkpa m choro Ka anyi Nile by ndi Igbo no na bloogu a saa, onye obuna zatara ya, ga enweta ozim mgbe na adighi Anya. Ihe kpatara mji choo iju ajujua di oke mkpa bu maka na izu uka gara aga, anyi gara mmenme ncheta omumu nwa afo asaa, ndi ocha wee na aju anyi Nile bu ndi Igbo etu esi agu "happy birthday to you" anyi Nile kpudoro ihu n'ala n'ihi nnukwu ihere Juru anyi Anya. Anyi si ha na anyi amaghi etu esi agu ya bu egwu n'igbo. Mgbe anyi lotara n'ulo, mkpoo Nnem na nnam n'ekwe nti, juo ha ma ha ama agu ya bu egwu, mana owute kwaram ebe odi ukwuuuu na ha amaghi ya agu!

    Ejim akaa, akpoku umunnem Nile no ebea, biko Ka unu gbataram oso enyemaka. 'Bv' Amanda, Chike, "Bloogu Eze", TGW, kwiiinu na Booozu, Sandy Yo! Na umunnem ndi ozo, biko nuooo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Happy - obi uto
      Birthday - ubochi omumu
      To - diri
      You - gi

      Oya sing

      Obi uto ubochi omumu diri gi x4

      Ngwa kene m... Lol

      Delete
    2. Onye Ajuju ekene mu gi o!
      Igaghi Efu uzo ooo!
      I ga adi o!

      Iseeee!

      Delete
    3. Onye ajuju, eziokwu m a maro m ka esi agu egwu a n'IGBO. Mana I nwere ike igu ya etua ...

      Nuria na ubochi omumu gi Nuria na ubochi omumu gi
      Nuria na ubochi omumu gi
      Nuria na ubochi omumu gi

      Afo ole ka I Di taa
      Afo ole ka idi taa
      Afo ole ka idi taa
      Afo olee ka idi taa ?


      Adi m afo ........(4x)

      Nke a bukwa aziza nke m, onye nwere ike inyere anyi aka biakwa biko
      Daalu nu Umunne m

      Delete
    4. Happy birthday to you putara anuri ncheta omumu gi

      Delete
    5. Hahahahahahahah...
      Ochi atogbuolam!...
      Nwa Ada Amanda egbuola,inu mu ooo..

      Nke bu eziokwu bu na egwu ahu Abughi egwu ndi Igbo...

      Delete
    6. Hahaha, Linda , isikwanu m kwuo gini?
      Aga m eme nchoputa maka egwu a
      Linda, onye echichi ana m ekele o !

      Zere nke I chiri

      Delete
    7. Lekwanum anya! Happy birthday by egwu oyibo, guoro ya egwu Igbo obula gbataragi na obi, tinye egwu ekpili na ya, ha ncha sokwa!
      Ndi igbo anaghi ekpeazu!

      Just Krix!

      Delete
    8. Onye ajuju ihea buru ibu
      Nara aka iri na abuo🙌🙌🙌🙌

      Delete
    9. Happt birthday wu ,ezigbo ubochi a muru gi.

      Delete
    10. Hian! Ochi atokalam ahu, haha hahaha haha hahaha
      Amanda Yo, biko sandy hapum ka m gbaziri 'yo' gi a.

      egwu nkea atolam ochi@Amanda yo. Igbaliri mana ñuria putara (rejoice)
      Mana, egwu ahu bukwa egwu ndi bekee, oburo nke anyi)

      Delete
  24. Anyi ekele unu oooo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ekele diri gi onye na enwehu aha.
      Kedu ka imere?

      Delete
  25. Igbo Mmama nu o!
    Nuo nu!
    Rie nu!
    Zuo nu!
    Kachaa nu!
    Igbo mmama nu o!!!!!


    Igbo Ekene mu unu o!

    Iseeeeeeee!!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ogologo ndu na oganihu na ahu ike zuru oke bu nke gi ma TG mama

      Delete
    2. Lolo Igwe aka CHIEF aka Queen and Boss, oke mmuo na eti onwe, agu nwanyi, ijele na onwe ya, Nwanyi oma I bu tam tam... Ekene ooo

      Ebe ka ino kemgbe?

      Delete
    3. Pipi Yooo! Iseeeee!

      Chief! Ekene mu gi o! Nwa Nne m onye Oga adiri nma!
      Chike nwoke Ike! Nna iga adi ooo!
      Ed Nwoke oma,nna Oga-adiri gi nma!


      Amanda Nwa Ada anyi ji eme onu,Nne Udo!

      Delete
    4. Nwuye G ndewo, nwanyi igbo bu igbo ji eme onu, asim kam kele gi. Chukwu gozie gi ma chebekwa ezi n'ulo gi.

      Just Krix!

      Delete
    5. Mmama ndi igbo ibem kara aka

      Delete
    6. Krix nwoke oma nara ekele.
      Chickyclassy onye owerre ebe ka anyi. Arim mma daaaaa.
      Pipilastic nwata agbohobia m nlutara Anthony J kedu?

      Delete
    7. Hahahahahahahahahaha.
      Iphie m, Iphie mama! Onye nkem! Onyem worldwide!

      Delete
  26. Ndi Igbo but Umu Isreal

    Igbo amaka biko

    ReplyDelete
  27. Akala yoruba

    ReplyDelete
  28. U people are just wicked ooo
    Do want to kill me with these language
    Stella pls bring Edo people own...
    I have to understand this language ijn amen😂😁😀

    ReplyDelete
  29. Umunnem mmama nu.
    Unu mere ofuma nkeukwu

    Naranu aka na elu🙌🙌🙌🙌

    ReplyDelete
    Replies
    1. Iphie Dearie so I bu otu n'ime ndi "famous" ato... Lol

      Udo diri gi

      Delete
    2. Ndi b'anyi ndewo nu o! Kee ka eke si anya anwu? Igbo ga di

      Delete
    3. Iphie nwanyi oma Daalu !

      Ekele m gi o !

      Delete
    4. Ekele kelere Amanda🙌
      Ifeoma onye ofu aham,Ekele kam jiri bia.

      Chike,nwoke ukwu na onwe ya,Kedu kwanu otu esiri chufu gi na group nke eji eme party?

      Delete
    5. Iphie,I mela mkpole?...
      Asusu ndi be unu na atom!...

      Delete
    6. Arim mma daa LinLin
      My tomatoe chara acha♥️

      Delete
  30. Nwa ada Amanda Favour imeela o. Umu igbo subanu igbo n'igbo amaka. Ndewonu

    ReplyDelete
    Replies
    1. Pipi Lee the Medusa Nwa oma idi na udi gi. Nwa ikporu akpo ka chin-chin... Ekene ooo

      Delete
  31. Amanda nwanyį öma,ekelekwa m gį
    E ji m na-aka n'ahu sigbodoro gi na Ndi nke gi ike?
    Okwu Ndi ahu įkporo okwu mbite,nwekwara ihe anyi na-akpo ha na-asusu Igbo. Gbalia ka įchoputa ha ma meekwa ka Ndi be anyį Ndi na-amaghį mara ha.
    Ana m ekelekwa gi na etu isiagbali akwalite asusu Igbo. Ka onyenwe anyį gbaa gį ume ezi Ada.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu TM,ezigbo mmadu
      A nuru m ihe I kwuru
      Chukwu gozie gi nne

      Delete
  32. Amaghi kwam na ndi Igbo anyi na asu bokwu-plenty. Anukwaram na anyi bitere Ichafu n'aka ndi frenchi. Igbo mmamma nu. BV Amanda, daalu nne, biko onwere ife m choro irio gi, Dee maka okwu ntabi ire, o tee go kwa. umu nnem, ka odi...

    ReplyDelete
  33. Igbo kwenu, rie nu, chienu eze!

    ReplyDelete
  34. Asusu Igbo ebuka. Odikwa iche iche na Obodo bebe. Ahotaram ihenine ederi bu na nmu wa enweroike isu udiri nka. Jisi nu Ike.

    ReplyDelete
  35. Uni igbo kwen u! Keep ze nu ✌️

    ReplyDelete
  36. Amanda Nwanyi oma, Imeela. Okwu torom ochi ebe I kporo Nwa mmadu "Ada Delilah". Onye ahu enweghi ako n'uche.

    ReplyDelete
  37. Ka m kuziere unu etu esi ama okwu mbite
    Mgbe o bula I hürü üda nfe na üda aro ka ha di na otu mkpuru okwu mara na ya bu okwu dara iwu nke nsugbe. Nyochakwa ya bu okwu n'ihi na ötütü okwu ndi dara iwu nke nsugbe bü okwu mbite.

    Ö bürü na m nwe oghere,a gam abia kowa ya bu okwu ka odo anya.

    Udo diri ünü ümünne m.

    ReplyDelete
    Replies
    1. TZ onye nke m!
      Nwanne m were nsusu💋💋💋

      Delete
    2. Nwunye G,Onye o ga-adiri mma. A na m ekele.😘😘
      Pipi,Nneoma kedü ka į mere? Daalu so

      Delete
    3. Adi m mma, daalu Ada Mazi.

      Delete
  38. Lmao Jelly! What was that? Loool

    ReplyDelete
  39. Waoh! so this is a confirmation that,
    na only Igbo people full this blog. Odiegwu really.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Relax owu turn by turn😀

      Delete
    2. Atula egwu, oge nke unu na-abia.
      Meanwhile, anyi n'achi n'ebe nile. Nke ahu bu oru anyi (na d work wet we dey do be this)

      Delete
    3. Nekwanu ndi ufu obi!!...
      Ndi jelosi jeloma!...
      Ndi Igbo bu ozuru mba onu!...

      Delete
    4. Lmaoooooooo
      Eze nwanyi herself!!
      Always dropping it hot.

      Delete
  40. Odikwa mma ka anyi muta na asusu igbo nwere usoro eji ede ya. Dika iji (na) na-edemede ngwaa.  Ngwaa nke nwere nga n'ihu ya bu 'e' na 'a'  biko etinye kwana ya n' (na rikom), tinyere ya na- (na akara uhie).
    Eg.  Ano'm n'ulo nkwu. (na rikom)
    Queen na-acho okwu nke ukwuu. (na akara uhie)

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahaha..
      Dear Stan,I dere ya nke Oma!...
      Ide igbo izugbe na ahia aru...
      Kedu ije gi nwanne?..ihuru ozi m?...

      Delete
    2. Queen ezigbo oyim dalu, adim mma. Kedu ka imere? Afuro'm ozi gi biko je na-akpati ozi gi ka ifu nke'm dere gi.

      Delete
  41. Igbo amaka,umu igbo ekelam unu o, igbo amaka.ya gashie la nnu ,Stella Rice wu osikapa.

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141