Stella Dimoko Korkus.com: NRI UKPO OGEDE

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, 2 October 2017

NRI UKPO OGEDE

IGBO KWEENU........YA!!!!
IGBO KWEENU..........YA!!!!
IGBO KWEEZUONU....... ISEE!!!!!







Ndi be anyi mmamanu o!, Rie nu!, muo nu!!, zuo nu!!, baa nu !!!..... Iseee!!!
Awuchikwanu m ozo taa ka anyi kparita ka esi esi otu nri Igbo ana-akpo UKPO OGEDE. Ukpoogede bu ezigbo nri ndi igbo na-edozi ahu na-atokwa uto eji Oka na ogede esi. Nri a na-amasi m nke ukwuu. Onye kuzurim ka-esi esi ya bu nri bu Nne m ochie.

IFE-EJI ESI UKPO OGEDE;
1. OKA
2. OGEDE(Nke dere ede nke oma)
3. ISHA
4. MKPURU AZU OKPOO
5.NNU
6. OSE
7. YABASI
8. NCHUANWU
9.KNORR
10. MMANU IGBO/NRI
11. AKWUKWO NDU/OGEDE EJI EKE YA
ETU ESI ESI YA;


Gbachasia oka gi ma sachaa ya nke oma, biee ogede gi tinye ya na oka gi,tinye ose oyibo,yabasi na isha were kwokoo ya onu.
Sachaa azu tinye ya n'ite,tinye yabasi,nnu na knor, sie ya nke oma.
Tinye mmanu nri na oka na ogede ikworo, wunye azu na mmiri i siputara na ya,tinyekwa nnu. 





sachaa ma bie akwukwo nchuanwu tinye na ya. (Biko tinye obere nchuanwu).
ร‘aa akwukwo ndu ma obu ogede n'oku iga eji kee ya. Biko o buru na imaghi ka esi esi na akwukwo ndu biko were ihe ozo sie ya,mana o na-aka ato uto ma e were akwukwo ndu sie ya. I รฑasia akwukwo ndu gi n'oku,bee ya etu o ga-esi kwe gi were kee ukpo ogede gi.
Sinye ite n'oku, o suo,i tinye ukpo ogede i kere na ya. I ga esigide ya ruo mgbe o ruru nkeji iri ise,o yee nri agbakwala.


Umunne m o kwanu etua ka m si esi nke m . I nwekwara ike bia gwa anyi etu isi esi nke gi,gwakwa anyi ihe i na-etinye na nke gi adiro ebea.
Ngwa daalu nu ndi oma m ji eje mba
Nara nu nsusu

B.V Amanda Favour


56 comments:

Miss Ess said...

Ok o, nice one

Eka Joy said...

Ngugu asusu igbo bu so 'edek'

Chidinma Grace said...

Anubeghi m maka nke a. Ma odika oga ato uto. Ndeewo nwa Ada Igbo.

EsE EsSAy said...

You say wetin? Issokay

LUCIFER said...

Make una comot for road jare.

sexy Daddy said...

Nwaada Amanda daalu rie nne!

NRI ede a ona agwo oria mmniri amu?
Okwa ajuju kam njuru!

amanda favour said...

Ndi be anyi osetigonu !

amanda favour said...

Bikonu o nwere ihe m choro ka m yoo sexy daddy na chike.
Biko a buro m NWAADA,ihe m bu bu ORIAKU biko umunne m

SANDY YO said...

Nwa afo nu maka ife ana akpo ukpogede for d very first time ebea. Owe kwa ka odi.๐Ÿ˜ Seems easy dikwa ka ife ga ato ezigbo uto.
Lemme bookmark and see if I can try it out someday. Daalu sis.๐Ÿ˜˜๐Ÿ’‹

Flawlessbae❤❤ said...

Good for dem������

Isolde Fontaine said...

Amanda Daalu

Lady Bug said...

Okay..

ThatYorubaChic#wifenotcook said...

And how do i read this?

Iya Oshoronga of Blogosphere AKA Mrs Always RIGHT said...

They have slowly but surely turned this blog to an igbotic blog.

Fierce of SDK blog said...

Nice, I will try it,anything made with plantain must taste good. Pls,what's isha? It's the only thing I don't get on the list of ingredients.

sexy Daddy said...

Oh biko Oriaku nwanyi Mara daalu rie NNE!

Oly Benny said...

Amanda imela Nke ukwu. Icheta gorom Ihe m ga esi ubochi abani abuo na abia abia
Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

egbuka caroline said...

Ada beke Amanda, dalu

Beloved said...

It looks delicious Mummy Amanda.

But back in the oldies, I remember hating the "chaffy' mouth feel from the maize added.

Okay I have bookmarked this for future purposes

Thanks for the Recipe

Oly Benny said...

Amanda imela Icheta gorom m Ihe m ga esi ubochi abani abuo na abia abia Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

jelly said...

All I see is the ukwa, so yummy

Just Glamour said...

Jisike oriaku Amanda.

Just Glamour said...

Mana gini bu Isha?

amanda favour said...

Isha bu Crayfish

amanda favour said...

O nne m daalu! Zitere m nkem ma isicha ya

amanda favour said...

Daalu nwanyi oma

amanda favour said...

Daalu nwanne m

amanda favour said...

Daalu nne m
Zitere m ma i sicha nke gi

amanda favour said...

Haahaha sexy dady abiakwa nu

amanda favour said...

Ndewo chidimma

amanda favour said...

Beloved dee ya na igbo bikonu
Echekwa m ma ima ede igbo?

Anonymous said...

Isha bu crayfish my mum use to put ukpaka na mkpuru anyara while cooking her own very sweet it my favourite food

amanda favour said...

@beloved ekele kwa m gi na oru stella nyere gi.
Chukwu gozibe gi nwa oma

LUCILE COCONUT OIL, CARROT OIL AND BLACK SOAP ABUJA 07059605320 Pin- 2BC6235E said...

Biko, obu nkea ka ana akpo asuru asu oka, Taadinu?

Olannaya said...

Nne ihe di ka nri ga ato uto ma doziekwa ahu. Ma na ihe m choro imata bu ihe ozo ana akpo ncha. Ajuju ozo maka umunne anyi ndi nno ebe o na adighi nfe inweta oka dika nke ulo, enwere ike ji oka nke akworo akwo sie ya bu nri?
Oso di akpa aku Amanda, i mela rie nne maka nri nkea. O buru na m mata ihe bu ncha, m ga esi ya bu nri na anyansi taa. Dalu nwanne m.

Oly Benny said...

Amanda Biko achoro m ka idee ka esi esi ikpagwu oka aririo kam na ario gi
Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

Oly Benny said...

Amanda again m where nria oil mill ubochi echi ma Obu ubochi Wednesday
Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

Oly Benny said...

*Jere nria

Oly Benny said...

Amanda aga m jere nria oil mill echi ma Obu ubochi Wednesday
Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

amanda favour said...

@olannaya,daalu nwanne m
I nwere ike iji oka akworo akwo were sie ya bu nri
O nweghi kwa ihe a na-akpo ncha m dere ebea ka o bu nchuanwu ka i na ekwu maka ya?

amanda favour said...

Eziokwu ka i kwuru ,a na etinye kwa ya mkpuru anyara na ukpaka etu obula isi cho. Daalu

amanda favour said...

@lucille ,e nwekwara ike o buru ya . Ihe anyi na akpo ya ebea bu ukpo ogede
Daalu nwanne m

amanda favour said...

Ihea a buro ukwa, o kwa ukpo ogede

Nwanyi na-eti eti said...

Bo language woman try and publish an article in your language and see stella post it. It's just that simple and not rocket science

amanda favour said...

Daalu nne
Isha bu crayfish na oyibo

amanda favour said...

Etu esi esi ukpo ogede na igbagwu oka bukwa otu uzo naani ihe di iche bu na adighi etinye ogede na igbagwu ighotago?

Olannaya said...

ISHA ka m na ekwu ma ka ya.

amanda favour said...

Isha bu crayfish Na oyibo @olannaya

Oly Benny said...

Daalu nwannem
Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

Oly Benny said...

Ozokwa bu Obu oka nkpo ko Nke mmiri ka eji esi ya
Olybekee you want me to

BIZ said...

Nawa oo na only igbo fit read ds one o

amanda favour said...

Oka mmiri ka mma mana o buru na ihughi oka mmiri were oka mkpo sie ya

Anonymous said...

Kudos to you Amanda. I really enjoyed reading this though I found it a bit difficult, maka na otego aka munwa guru edemede na asusu Igbo anyi.

Fierce of SDK blog said...

Daalu NNE.

Anonymous said...

Anyi n’akpo ya moimoi oka

Anonymous said...

Hahahahahaha!! Ibiakwa!

Related Posts Plugin for WordPress, Blogger...

Advertisement