Stella Dimoko Korkus.com: ETU ESI ALU NWANYI NA-ALA IGBO

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, October 10, 2016

ETU ESI ALU NWANYI NA-ALA IGBO

IGBO KWEENU.........YA
IGBO KWEENU....YA
IGBO KWEZUONU.....ISEE.....






   Umu nnem ekele m unu o....,nke onye chiri ya zere o....
Ó nwanne unu nwanyi na-ekwu.
A siri m stella ka- anyi bloogu o na asusu anyi,maka na igbo amaka!!
     Ndi ugwu na ndi ofe biko si ebe a puo LMAO.

Umu nne m achoro m ka anyi kparita ka esi alu nwanyi na obodo anyi di iche iche.
     Aga m agwa unu etu esi alu nwanyi na-obodo m.
A bu m onye NGBO na EBONYI STEETI.
Ka anyi si alu nwanyi na-be anyi bu e tua;

1. Mgbe nwoke huru nwanyi ohuru na-anya o ga-alu,o ga-aju ya ezi-na-ulo o si.

2.Nke nwoke ga-ejekwuru onye agbata obi nwanyi ahu o choro ilu ka o nyere ya aka iluta nwanyi.
Onye ahu ka o ga-na ezi ozi o ga-ezi ndi be nke nwanyi,ndi be nke nwanyi ga-na ezikwa ya ozi o ga-ezi nke nwoke.
Ndi be anyi na-akpo onye di otua "ONYE NSUBERE", ufodu na-akpokwa ya "NWA NDU UZO".

3.Ndi be nke nwoke ga-agazi na-be ndi nke nwanyi,kwuo ihe ha na-acho n'ezi-na-ulo ahu.
Anyi na-akpo ya "IGBATA NJI", ufodu na-akpokwa ya "IKU AKA".

4. Ndi be nke nwanyi ga-eje juo ese maka ezi- na-ulo nke nwoke choro ibu ogo ha.
Ha ga-aju ka ha mara ma ha abu ndi ohi, ndi na-egbu mmadu,ndi mere aru ma o bukwa ndi nwere ajo oria na-agburu ha.

5. Ubochi akara aka,ndi be nke nwoke ga-abia, o buru na ndi be nke nwanyi emecha go nyocha ha were fu na ndi be nke nwoke bu ezigbo mmadu,ha ga edeputa ihe eji alu nwanyi were nye ndi be nke nwoke.

6. Ndi be nke nwoke ga-eje zutasia ihe ederena-akwukwo ahu.
Aga azuta ihe nna,nne,umunna,umu agbogho,umu okorobia,umu okpu/umu ada,ydgz.
Ha ga-akwukwa ego ha na umunna nke nwanyi kwekotara ha ga-akwu n'isi nwada ahu.
Nkea ka ana-kpo "IME EGO".

7.A ga anozi ebe ahu kwekorita ubochi a ga- agba nkwu.
Ubochi ahu,nke nwoke ga akpo ndi ikwu na ibe ya na ndi enyi ya were gaa na be ndi ogo ya.
Ubochi ahu kwa ka nwada ahu ga egosi oha obodo di ya.
Ndi be nke nwanyi ga ekpekwara ya na di ya ekpere oma,ka alu m di -na - nwunye ha gazie nke oma.
Ndi be nke nwanyi ga ejikwa ngwo ngwo eji ebi na ulo were duo nwa ha nwanyi ulo.
Etua ka-esi eme ya na obodo m.
Ngwa bia kwuo ka esi eme ya na obodo gi.


   Daalu nu o!!!
B.V
AMANDA FAVOUR



Amanda dalu oooooo.


216 comments:

  1. Hey,Adanne I bu onye uzo Ulo? Nwanne m nwanyi di otu? Ahu o digi Ike? Unu adila emela?

    ReplyDelete
  2. What are u all saying?i'm ibo but don't understand hian.heck i dont even know what was written up there.

    ReplyDelete
  3. Nnem kaaki me?amarom ife ndia naa su nede,obia dizika naa aburom ibo.chai this is hard ooo,didnt do igbo in secondary school d only time i did i passed cos i did copy nd paste.even when d teacher was teaching i didnt understand a thing.there where delta ibos that understood everything the man was saying word for word,i tire jaareh and i schooledin owerri for 5yrs and i'm going back to owerri soon.nne ngaa mutaa ibo by fire by force

    ReplyDelete
  4. I disagree!!!!
    Me I want my kids to be sound in ibo,infact different languages. See me,my mama say I be ibo.

    ReplyDelete
  5. Unuu sii na gini?biko kaa unuu breakdown the igbo so i can wata

    ReplyDelete
  6. Amanda nwayi oma daluu rie n'ne

    ReplyDelete
  7. @mmadu nile, akwa Ana ma ko ke mgbe si na ma huru ndi ne ri nkita na abum ezigbote onye Igbo. Ma npa mu na nnem.

    Unu eweliwe, na Igbo mu adicharo sound.

    ReplyDelete
  8. Ezigbote Ana akogheri, Ndi Uchu!
    America Na Afio, o kwa Ebe Nno kita, Kedu kwanu ife Na eme ebe a, ufodu ji kwa eze akpa ekwere.

    ReplyDelete
  9. Lekwanu Ndi nwanneukwum, Unu omeru anunu?

    ReplyDelete
  10. Nne e bu nwa afo Igbo, Igbo no nu mma oooo

    ReplyDelete
  11. Nwaanyi oma imeela nke ukwu, chukwu gozie gi.

    ReplyDelete
  12. Amanda good job.you have done well,I pray God increase your memories.Amen
    😍🙌🙏🙏🙏🙏🙏

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141