Stella Dimoko Korkus.com: NRI UKPO OGEDE

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, October 02, 2017

NRI UKPO OGEDE

IGBO KWEENU........YA!!!!
IGBO KWEENU..........YA!!!!
IGBO KWEEZUONU....... ISEE!!!!!







Ndi be anyi mmamanu o!, Rie nu!, muo nu!!, zuo nu!!, baa nu !!!..... Iseee!!!
Awuchikwanu m ozo taa ka anyi kparita ka esi esi otu nri Igbo ana-akpo UKPO OGEDE. Ukpoogede bu ezigbo nri ndi igbo na-edozi ahu na-atokwa uto eji Oka na ogede esi. Nri a na-amasi m nke ukwuu. Onye kuzurim ka-esi esi ya bu nri bu Nne m ochie.

IFE-EJI ESI UKPO OGEDE;
1. OKA
2. OGEDE(Nke dere ede nke oma)
3. ISHA
4. MKPURU AZU OKPOO
5.NNU
6. OSE
7. YABASI
8. NCHUANWU
9.KNORR
10. MMANU IGBO/NRI
11. AKWUKWO NDU/OGEDE EJI EKE YA
ETU ESI ESI YA;


Gbachasia oka gi ma sachaa ya nke oma, biee ogede gi tinye ya na oka gi,tinye ose oyibo,yabasi na isha were kwokoo ya onu.
Sachaa azu tinye ya n'ite,tinye yabasi,nnu na knor, sie ya nke oma.
Tinye mmanu nri na oka na ogede ikworo, wunye azu na mmiri i siputara na ya,tinyekwa nnu. 





sachaa ma bie akwukwo nchuanwu tinye na ya. (Biko tinye obere nchuanwu).
Ñaa akwukwo ndu ma obu ogede n'oku iga eji kee ya. Biko o buru na imaghi ka esi esi na akwukwo ndu biko were ihe ozo sie ya,mana o na-aka ato uto ma e were akwukwo ndu sie ya. I ñasia akwukwo ndu gi n'oku,bee ya etu o ga-esi kwe gi were kee ukpo ogede gi.
Sinye ite n'oku, o suo,i tinye ukpo ogede i kere na ya. I ga esigide ya ruo mgbe o ruru nkeji iri ise,o yee nri agbakwala.


Umunne m o kwanu etua ka m si esi nke m . I nwekwara ike bia gwa anyi etu isi esi nke gi,gwakwa anyi ihe i na-etinye na nke gi adiro ebea.
Ngwa daalu nu ndi oma m ji eje mba
Nara nu nsusu

B.V Amanda Favour


56 comments:

  1. Replies
    1. It looks delicious Mummy Amanda.

      But back in the oldies, I remember hating the "chaffy' mouth feel from the maize added.

      Okay I have bookmarked this for future purposes

      Thanks for the Recipe

      Delete
    2. Beloved dee ya na igbo bikonu
      Echekwa m ma ima ede igbo?

      Delete
    3. @beloved ekele kwa m gi na oru stella nyere gi.
      Chukwu gozibe gi nwa oma

      Delete
    4. Nne ihe di ka nri ga ato uto ma doziekwa ahu. Ma na ihe m choro imata bu ihe ozo ana akpo ncha. Ajuju ozo maka umunne anyi ndi nno ebe o na adighi nfe inweta oka dika nke ulo, enwere ike ji oka nke akworo akwo sie ya bu nri?
      Oso di akpa aku Amanda, i mela rie nne maka nri nkea. O buru na m mata ihe bu ncha, m ga esi ya bu nri na anyansi taa. Dalu nwanne m.

      Delete
    5. @olannaya,daalu nwanne m
      I nwere ike iji oka akworo akwo were sie ya bu nri
      O nweghi kwa ihe a na-akpo ncha m dere ebea ka o bu nchuanwu ka i na ekwu maka ya?

      Delete
    6. ISHA ka m na ekwu ma ka ya.

      Delete
    7. Isha bu crayfish Na oyibo @olannaya

      Delete
  2. Ngugu asusu igbo bu so 'edek'

    ReplyDelete
  3. Anubeghi m maka nke a. Ma odika oga ato uto. Ndeewo nwa Ada Igbo.

    ReplyDelete
    Replies
    1. @lucille ,e nwekwara ike o buru ya . Ihe anyi na akpo ya ebea bu ukpo ogede
      Daalu nwanne m

      Delete
  4. Nwaada Amanda daalu rie nne!

    NRI ede a ona agwo oria mmniri amu?
    Okwa ajuju kam njuru!

    ReplyDelete
  5. Bikonu o nwere ihe m choro ka m yoo sexy daddy na chike.
    Biko a buro m NWAADA,ihe m bu bu ORIAKU biko umunne m

    ReplyDelete
  6. Nwa afo nu maka ife ana akpo ukpogede for d very first time ebea. Owe kwa ka odi.😁 Seems easy dikwa ka ife ga ato ezigbo uto.
    Lemme bookmark and see if I can try it out someday. Daalu sis.😘💋

    ReplyDelete
  7. Iya Oshoronga of Blogosphere AKA Mrs Always RIGHT2 October 2017 at 13:44

    They have slowly but surely turned this blog to an igbotic blog.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwanyi na-eti eti2 October 2017 at 15:50

      Bo language woman try and publish an article in your language and see stella post it. It's just that simple and not rocket science

      Delete
  8. Nice, I will try it,anything made with plantain must taste good. Pls,what's isha? It's the only thing I don't get on the list of ingredients.

    ReplyDelete
  9. Amanda imela Nke ukwu. Icheta gorom Ihe m ga esi ubochi abani abuo na abia abia
    Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

    ReplyDelete
  10. Amanda imela Icheta gorom m Ihe m ga esi ubochi abani abuo na abia abia Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

    ReplyDelete
  11. All I see is the ukwa, so yummy

    ReplyDelete
  12. Isha bu crayfish my mum use to put ukpaka na mkpuru anyara while cooking her own very sweet it my favourite food

    ReplyDelete
    Replies
    1. Eziokwu ka i kwuru ,a na etinye kwa ya mkpuru anyara na ukpaka etu obula isi cho. Daalu

      Delete
  13. Amanda Biko achoro m ka idee ka esi esi ikpagwu oka aririo kam na ario gi
    Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

    ReplyDelete
    Replies
    1. Etu esi esi ukpo ogede na igbagwu oka bukwa otu uzo naani ihe di iche bu na adighi etinye ogede na igbagwu ighotago?

      Delete
    2. Daalu nwannem
      Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

      Delete
    3. Ozokwa bu Obu oka nkpo ko Nke mmiri ka eji esi ya
      Olybekee you want me to

      Delete
    4. Oka mmiri ka mma mana o buru na ihughi oka mmiri were oka mkpo sie ya

      Delete
  14. Amanda again m where nria oil mill ubochi echi ma Obu ubochi Wednesday
    Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

    ReplyDelete
  15. Amanda aga m jere nria oil mill echi ma Obu ubochi Wednesday
    Olybekee Amawbia ugbo ogiriga

    ReplyDelete
  16. Kudos to you Amanda. I really enjoyed reading this though I found it a bit difficult, maka na otego aka munwa guru edemede na asusu Igbo anyi.

    ReplyDelete
  17. Anyi n’akpo ya moimoi oka

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141