Stella Dimoko Korkus.com: ANYI HAPUZI KWARA OMENALA MEBE OMENELU

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Friday, November 24, 2017

ANYI HAPUZI KWARA OMENALA MEBE OMENELU

IGBO KWEENU......... YA!
IGBO KWEENU......... YA!!
IGBO KWEZUONU........ ISEEE!!!!





Umunne m ndi m ji eme onu, ekele kwa m unu. A biakwala m ozo taa ka anyi kparita nkata maka otu ajo agwa m furu ga emebiri anyi bu ndi igbo ihe. O ka kwa mma na anyi kwopuru ya bu mmiri ugbua o ka no na ikpere tupu o ruo anyi na olu. 


Ndi igbo turu ilu si na "ARU GBAA AFO, O BURU OMENALA", o ka kwa mma na anyi mere ngwa ngwa were meghara odachi a!

Ihe m na ekwu okwu ya bu na a na-agbazi kwanu nkwu umu agbogho anyi na legos? Ihe nkea odinu mma inu na nti? Kedu ka umunwoke choro inu umunne anyi nwanyi ( ntumadi ndi yoroba) ga esi agbaa nkwu ha na legos?. 

Nkea o buro ihapu zi omenala mebe omenelu? Bikonu a chokwara m ka anyi tinye nu ihe nkea onu nke oma,a ka na ekwu maka asusu anyi na-acho ifunahu anyi,anyi bido kwa nkea. Daalu nu umunne m

33 comments:

  1. I'm outta here please




    *Larry was here*

    ReplyDelete
  2. Umunne m biko ka anyi tinye onu na okwu a nke oma. Isiokwu a di ezigbote mkpa

    ReplyDelete
  3. Oburu obele ife. Anokwa ne enu ya ne eme class. Echinine aya etie na ana akpari ayi.
    Unu dozi cha legos, bu unu awuru so ofia.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Chukwi gozie gi nnem. Ihea umunne anyi na eme adiro kwa mma

      Delete
  4. NDI BEE ANYI SI NA 'ATUORO OMARA, O MARA,

    ATUORO OFEKE, OFENYE ISI N'OHIA'.


    ONYE AFULU KA AWOGBULU, O BU YA MEERE O BU ALUCHA DI NA NWUNYE,

    ANYI ANUBA N'OBU ONYE NWURU ANWU KA A LURU.


    NDI ANYI GA-AJU ESE BU NNE NA NNA NA-EKWE KA ALUOO UMU HA N' MBA.


    O BU UDI DI ABUJA ANYI N'ALU UGBU A, MANA A GWA NTI MA NTI ANUGHI, E BEPU ISI,

    NTI ESORO YA.

    YA GAZIERE ANYI NIILE.
    O GWULA KA ORAM N'ONU.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu ezigbo mmadu
      Okwu gi kwu oto
      Ndi nwere nti bia nuru

      Delete
  5. I had my trad in the village. It wasn't convenient tho,but my dad won't have it done even in an eastern state he is residing.

    These days because of distance and village people wahala,people choose to do trad in Lagos especially when both families stay in Lagos.

    ReplyDelete
  6. Na Anya nke m,afurom ife ojo obuna ni ime ya,maka na isi ka isoro uso omenaana jee na vileji mee ya,ewelu listi toolu ezigbo ogonogo nye nke nwoke,fa achoro ima ma o ga emenwukwa ife di na ime ya,fa achori ima ma nke nwoke enwere ego o ga eji gotesia ife fa degasiri na o ga egote,ya bu ife jogburu onwe ya na njo.

    Ndi be anyi ndewoonu o😙😙😙😙

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwanne m ED odiro kwa mma. Ndi mba ozo adighi eme ya o!

      Delete
    2. Oputara na ndi na agbankwu na Legosu Anaghi ewetezu ife n’ile eji alu Nwanyi? A si mu kwo, okwesiri ka agba nkwu nwanyi na obodo nwayi si.

      Ufodu nna na analu ego nwa fa na obodo abulo ebe fa si bu ndi aruputaghi uno na obodo fa. Ndi anaghi analu uno.

      Delete
  7. Onweghi oke Ihe di na nya bu Ihe, o bururaa na ndi be nke nwanyi wenara ndi no n'ulo oke ha. O ka di is a mma maka na aruru ana akarikazi na ala igbo.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwanne m o nweghi ebe aruru ala adighi. Anyi aga ejizi maka ndi ojoo gbapu na obodo anyi?

      Delete
  8. ihe kpatara aru a bu nne na nna umu Igbo agbanariala culture anyi. Na ulo oru ebe m na aru oru, o nweghi nwata igbo mara asusu anyi at all, mana ha na asu yoruba karia oyinbo; nke meziri ojiri buru official language sef. Chukwu gozie nne na nna m rinne, unu mere anyi ukwu shie anyi ike na ala ofuma. Anyi na agba nkwu na emekwa emume obula na obodo anyi na Imo. Trully, Ihe ojo gba afo, O buru Omenaala!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Nwanne m kaybee,ike gwuru m. Ana ekwu na asusu anyi na anazi ana,e buru kwa nkea bata. Ndi yoroba na mba ozo bi na ebea na bu ha choro ime ihe,ha anaa be ha,kedu ihe anyi ga na agba nkwu umu anyi na mba ozo ?

      Delete
    2. •culture
      •official language
      •truly

      Asusu Igbo adiro ofele odide

      Delete
    3. Taa puo there. Deenu nke gi ka anyi hu!. A na m agbalidi biko😂😂😂

      Delete
  9. Lmaooo @Omenelu. Okwa ka n'si fu ya bu ife Nwannem nwanyi. Oburo so na lag sef, anam afu ya bu ife eba too. Fast trending!!! Oburo ezigbo Ife mana kedu Ife mmadu ga emekwanu gbasara d something order than na ene so anya. Ike gwu jare. Daalu soo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Sandy ihea adiro mma cha cha,nwoke yoroba na akwara mu na dim akwa ,mgbe nwa ya nwanyi luru di,o kwa na be ha na ekiti ka ha mere ihe niile,o kwa onye nnewi luru nwa ya nwanyi, kedu zi ihe mere ha ji laa ekiti jee me ya? O buru ndi nke anyi ka a ga alu na mba,o di nu mma ?

      Delete
  10. daalu umu igbo,asusu igbo amaka.
    chukwu gozie umu igbo ndi oma
    nwanne eziokwu ka o bu.....daalu

    ReplyDelete
  11. Igbo ndi Oma ekenem unu, ogadiri unu nile mma. Omenala amaka

    ReplyDelete
  12. Nkea e kwuru bu ezie,ka umu nwanyi anyi a'nutara bido kuziere umu ha asusu b'anyi maka na asiri na eme ngwa ngwa emehara odachi, mana ndi b'anyi anaha eme omenala na lagosu abum onye Anambara.

    ReplyDelete
  13. how can a woman over 50years be buried in lagos. this is very bad.

    ReplyDelete
  14. chike kedu ebe inno? biko bia tinye onu na okwuo

    ReplyDelete
  15. ihe nke a di nno egwu oo,ndi ala bu otu hapuziri omenala mewezie omenelu!ogbagwojuru anya o

    ReplyDelete
  16. Amanda Olisa gozie gi maka okwu a I tuputara n'ubochi taa. A na-ekwu n'okuko manyere onu, o chiri ukwu abuo wunyekwuo. A na-ako n'onye na-alu gi abughi onye Igbo, I burukwa emume igbankwu gi buga na mba ozo. Ojogburu onwe ya. O buru na akwusighi ya ogbua, oge na adighi anya a ga amalite ili ozu ndi Igbo na Legos.
    Ndi Igbo si na o nwere ihe ndi muru nwanyi ga agwacha ya bu nwada a si ya agwakwala di ya. Nwanyi ma o bu nwoke ekwesighi ichefu ebe o si bia. Maka ndi be anyi si na emechaa na igwe nile ga a la n'uzu.
    I bi na mba ozo site na onwa nke mbu ruo na nke iri na abuo, keduzi ihe ga egbochi gi i kwanyere ala nna gi ugwu nke mkpuru ubochi ole ma ole? O na gini mezii? Anyi ekwesighi I na-eme udi nkanka omume a.
    I gbasie ukwu ike n'ala si na I choro ka emee ya na ala nna gi, onye biara ilu gi ga ama n'inwere ugwu. Ihe o bu bu omenala, o buro nsi na aja.
    Ozokwa bu ndi si na ndi be anyi na-eme ihe ojoo di iche iche. Nke a bu asi. Ndi a na-agba nkwu ha n'ime obodo ha ha anwuchago? Ndi enyere akwukwo ihe ga e go maka ilu nwanyi ha adago ukpa maka ya?
    Igbo nwem taa bu gboo. Ka anyi bido n'ubochi taa gbasawa ozi na-ekwu na igbankwu emere na mba ozo esoghi chaachaa. O burugodi na I bu onye Nsukka, oso anaghi achu gi n'obodo gi, mana ichoro i me ya na Nnewi maka na nna gi na-azu ahia na Nnewi, nne I dara ya. Ofozikwa nke Legos. Kedu udi akuko bu ihe nke a?
    Ka oragodim nofu.
    Igbo amaka!

    ReplyDelete
  17. Ndi igbo arapula omenaala mebe omeneelu. Ihe nke a dikwa egwu..nke a mere ndi ofemmanu na ndi awusa jiri ka anyi mma,maka anyi n'elezi ndi ocha anya karia ka okwesiri..igbo g'adi oooo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ihe nkea nwere otu odi o. Umu Igbo abughi ndi n'amu nwa atufuo kama ihe ndi ufodu mmadu n'eme ugbua ezighi ezi. Nne na Nna kwesiri ina alaru ulo kwaa afo,iji mara ihe n'aga n'ulo. Igba nkwu na ala legosi ma obu ugwu awusa ezighi ezi

      Delete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141