Stella Dimoko Korkus.com: NTUGHARI

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Thursday, July 12, 2018

NTUGHARI

Igbo kweenu.... Yaa!!
Igbo kwezuonu.... Isee !!!!!






Ndi be anyi ekele kwa m unu, nke onye chiri ya zere, eji m na aka na aru disi onye obula mma? 


Awuchikwa nu m ozo taa ka Anyi suo asusu anyi bu igbo. Ihe m choro ka anyi kparia taa bu itughari ufodu okwu Oyibo na igbo. Ufodu okwu Oyibo di, mana anyi amaghi ihe a na akpo ya na ugboala. A ga m ede ufodu m na, , dekwaa ufodu mu amaghi ,onye ma ya Biko gwa anyi .


UFODU OKWU OYIBO NA IHE A NA AKPO YA NA ASUSU IGBO :

1. Bread....... Achicha oyibo
2.phone ........Ekwenti
3.Bicycle ........ Igwe
4. Motorcycle...... Ogba tum tum
5. Pen...... Mkpisi odee
6. Pawpaw.... Nkwu anyim
7. Plantain. ...Ogede/ojoko
8.Groundnut.....Opapa
9.Bank......... Ulo odebego
10.Canoe....... Ugboala amala


Bikonu, onwere onye ma ihe a na-akpo ihe ndia na asusu igbo?
1.watch
2.Fan
3.Gate
4.kitchen
5.Trousers


Ngwanu, ka odi nu Oge ozo, Chukwu gozie onye obula.

94 comments:

  1. Replies
    1. Ama imu ma eweterem ya na Igbo, trouser ne bei ke mu Wu ebanti mukwanu ugodo. Ndi Igbo kwenu o!

      Delete
    2. Watch bu elekere
      Gate bu nguchi uzo
      Kitchen bu ulo ekwu

      Delete
    3. Gate bu Onuama.
      Kitchen bu Usekwu.
      Fan bu Nkucha.

      Delete
  2. Agam atughari na Kampala okwu ndi obodom.
    Trousers-iba
    Watch-atang
    Biko kedu onye ma ihe ana kpo Akara na Udara na okwu oyibo?
    Ndi ebe anyi kam biakwa nu😁😁😁

    ReplyDelete
  3. Why that guy in the picture looking like Phyno fino without the beards

    ReplyDelete
  4. Aham wu Fan. Mana amaghim ihe oputara na asusu Nnam😂 Bikonu umunnem nyerem aka

    ReplyDelete
  5. kitchen bu usekwu
    gate bu uzo igwe.. dalukwa nu oo

    ReplyDelete
  6. Bank is Ulo aku

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ufodu ndi na akpo ya Uyo ego..

      Mana ihe anyi na akpo ya bu kwa ulo aku.

      Delete
  7. Akara by beans cake. Udara bu apple. Dalu

    ReplyDelete
  8. Oriaku Amanda daalu nke ukuu.
    ndi be anyi siri na dibia gworo ozo mana ozo nyiri dibia. ya putara na amaghi m ntuyari ihe ndia ahu ideputara n'elu.
    mana mara na okwu Igbo ezughi ezu ya mere eji nwee okwu mbite.

    ReplyDelete
  9. Bank - Ulo aku

    ReplyDelete
  10. 1.watch.....elekere ak
    2.Fan.........akupe oyibo
    3.Gate.......Upio
    4.kitchen.....Usekwu/ enyekwu
    5.Trousers.....Ibangi..

    Daalu nwa oma, I gbalika.
    Ekelerem unu nke oma

    ReplyDelete
  11. Dalu kwa nu oohh...
    Watch bu worchi...
    Fan bu fanu!!..
    Gate bu gati...
    Kitchen bu kitchenu...
    Trouser bu tlouser!...
    Egusi bu egwushi...
    Okra bu okwuru...

    ReplyDelete
    Replies
    1. Gbam! I nwete ya ofuma! Okwa ife m n’akpo ha 😂

      Delete
    2. Queen E na ekele o! Bike bu ogbo tumtum. Aha nka na tu mu uto.

      Delete
    3. Yes ijiya,iwetaya😄😄😄

      Delete
    4. daalu queen and boss, mana ntughari Gi di egwu 😀😁😀😁

      Delete
    5. This is what I would have typed..
      Lmao

      Delete
    6. Hahahahaha nwanyi a sef. Mana i gbaliri.

      Delete
  12. Ekele'm umu igbo, ka'm gwa unu nke'm mara:
    Plantain bu Obirika/Abirika
    Kitchen nu Usekwu
    Gate bu Agbantu
    Fan bu Akwupe/Akupe.

    Dalu oo

    ReplyDelete
  13. If you want to translate, you look for strong unusual words. The ones above are simple.

    Auditorium - Ulo ezumezu.
    Professor- Okachamara.
    Fake- Adigboroja.
    Politics- Ndorondoro Ochichi.
    Democracy- Ochichi onye kwuo uche ya.
    Journalist- Onye nta akuko.
    Torch- Oku mpanaka.
    Gate - onu uzo ama.
    Competition - Ima aka.
    Lo and behold- Ma lee.

    Hahahaha, I miss my momma.

    ReplyDelete
    Replies
    1. daalu nne, ihe anyi no ebea Bu mmuta, a bughi m omacha ncha

      Delete
    2. Lo and behold - Lee ma lee.
      Tiger - Agu.
      Lion- Odum.
      So many people call lion agu and it's wrong. Any questions?

      Delete
    3. This comment has been removed by the author.

      Delete
    4. Daalu kwanu Umu Ada ibem.
      Chike Nwannem, ndeewo. O ga-adiri gi na mma.

      Delete
    5. Endtime bu ogwugwu oge...adulterated bu akuruaku....

      Delete
  14. Efifie oma, umu nnem! Chukwu gozie Kwa gi, gozie r'anyi nile.🙏

    Kitchen bu usekwu.

    Biko, ke ife ana akpo ife ndia na asusu Igbo:

    Bread
    Rice
    Beans

    Ekelem unu!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Bread bu achicha or bured!!..
      Rice bu osikapa!...
      Beans bu agwa!..

      Delete
    2. bread.... Achicha bekee
      Beans.... Agwa
      Rice.. Osikapa

      Delete
    3. Chai! Daalu Umu Ada.🙌

      Delete
  15. WATCH- ELEKERE
    FAN- AKUPE
    GATE-ONU UZO
    KITCHEN- USEKWU
    TROUSER-OGODO

    ReplyDelete
    Replies
    1. Onu uzo bu doorstep. Gate bu onu uzo ama maka na o chere iru n'ama. Ama bu street.

      Delete
  16. Ekelerem unu.

    Ndi nkem.

    Ashim Kam gwaunu na anorom ngi n'azu

    Daalu Ndi nkem

    ReplyDelete
  17. bread bu achicha
    Rice bu osikapa
    Beans? onyemazi nyere anyi aka o

    ReplyDelete
  18. Kitchen bu usekwu

    ReplyDelete
  19. Television bu oyoyo
    Handset bu ekwe nti
    Fridge bu akpati oyi

    Picture bu

    ReplyDelete
  20. Daalu nu oo
    Watch-aka oge
    Fan-oku akupe
    Gate-uzi igwe
    Kitchen-uno nli
    Trouser-trouser

    ReplyDelete
  21. Umunne m akaria va.
    Mehn pasa na ogbe, juo ese iga afu na ha bu aloba m

    ReplyDelete
  22. Akuni Owen osiso ,panyonku odwief fama olulu jumasi

    ReplyDelete
  23. Igbo ndi oma, ekelekwaam unu. Egbe bere, Ugo bere. Ya gazie.

    1.watch - Elekere aka
    2.Fan - ???
    3.Gate - Onu uzo ama
    4.kitchen - Ulo ekwu
    5.Trousers - Kaki

    Ka emesia.

    ReplyDelete
  24. Bed _ akwa
    Mirror _ugogbe oyibo

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141