Stella Dimoko Korkus.com: EGWU NDI IGBO

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, 13 February 2017

EGWU NDI IGBO

If you read and do not Understand Biko,move on to the next post...







IGBO KWENU ........... YA!
IGBO KWENU..............YA!!
IGBO KWEZUONU........ ISEEE!!!!!!



Ndi be anyi ekele m unu!
Nke onye chiri ya zere
Awuchikwala m ozo ka anyi noria taa.
A choro m ka -anyi kparita maka egwu Di iche iche ejiri Mara anyi by Ndi IGBO .
Ndi IGBO nwere otutu egwu.


Ndi be anyi na Izhiangbo na-agba egwu Odabara.
Egwu Odabara na-ato uto nke ukwuu. Akwa egwu ha makwara MMA .
A na- akpo ha ka ha gbaa egwu ebe a na-agba nkwu ma kwa ebe a na-akwa ozu.

Ndi nnewi na-agba Igba-Eze. Ndi umunze nwere egwu Mkpokiti. Egwu a nwere ukwu egwu di-iche iche eko agba ya.
Ufodu bu nke mmadu abuo ma o bu Karia na-arikwasi n'elu otu onye egwu,onye nke ikpeazu na-ano n'elu na-ayori egwu.

Ndi ihiala na-agba egwu okachamma. Ndi Afikpo na-agba Nkwa Umuagbogho.
Ndi Unubi na-agba Egedege.
Theresa onuoha mekwara ka-egwu ahu na ewu ewu.

Egwu Egedege na ato uto. Nke kachasi ato m uto na egwu ahu bu oja ha na-afu. Egwu na-ada, oja a na- afio, ukwu a na-ada n'ala. Egwu Ndi IGBO na-enye obi uto.

Umunne m ,kedu egwu unu nwere na obodo unu?
Bia gwa anyi, gwakwa anyi ka esi agba ya.

Tupu anyi emechie nke taa, ka anyi mee OKWU NTABIRE.

Okwu NTABIRE bu okwu Ndi bu ekwuo ha ngwa ngwa, ikwuhie onu. Ikwuhie okwu a na-ato ochi.
Omumatu:

1. Kpughepu mpoto,kpunyekwa mpoto ebe o puru.
.2. Ndi achi kwu chi m,na-ebe a na-ere chimchim, na-atakwa chimchim.
.3.Nwanyi na-akwa akwa ,I na-akwa akwa na okuko yiri akwa n'elu akwa ikwara Di n'elu akwa.
4. Papa pita patara popo panye papa pol, papa pol para popo pabaa na- palo.
5..Manye aka n'akpa akakpo,ka I were ihe n'akpa akakpo ka o rie.

Hahahahahaha...,okwu ntabire na-ato uto.
Biko Bia tinye nke gi
Umunne m ka odi oge ozo.

BY BV AMARA



*Hian Biko,Ndi Delta Nwe Egwu toh badt!..LMAO


102 comments:

Uriel (Freshdew) said...

😵😵😵

Istanbul said...

Beautiful post, unto the next post pls

Beloved said...

Atabie m ire

Miss Ess said...

Ngwanu,ndi igbo

Rosemary C. said...

Egwu Ndi Delta di uto nwanem.
Ndi ibem ekenem unu ooo!

Genny le boo said...

Ndi igbo kwenu

Chidinma Grace said...

Ti nchi gbim, Tipu nchi nsi

Becky Divine said...

Odinma oo
Chukwu gozie gi onye dere edemede a. Igbo kwenu

Uniq Gem said...

*moves to the next post* 👋 👋 👋

xxxTrinityxxx said...

is this amanda favour again? Nne you try. i dont really get as i was really trying hard to read but did you mean the different dances in from different states? or all those old music from imo. i love them. if its dances, i know of atilogwu, ikorodo etc

Olivia Silk said...

Headache inducing.

#okbye

EJIASINWEZEGINI said...

Okechukwu, Ukochukwu jere okwu chukwu n'ulo uka di n'arochukwu, Ti nchi kpim, tipu nchi nsi. ka o dinu oge ozo umu igbo.

Kay Bee said...

Agucha m ya biko. O toro ogologo too much. Ka m chere ebe a maka ndi nkowa.... udo!

chukwu chizaram said...

IGBO AMAKA

amanda favour said...

Ngwanuu , Umunne m putaba nu
Bia gwa anyi egwu Ndi obodo unu na-agba

Wendixx said...

Igbo Kwenu!!

Read for a while, then the mental stress became much. Had to jump and pass jare.

But from what I read; "Thumbs Up! We've got great dances indeed."

Cheers..

Pipi Lee said...

Igbo Kwenu!!!!

Biko Umunnem, amam agba egwu adanma, o kwa na sukulu ka mu mutara nka, o di ka egwu ndi Enugu steti. Biko ndi Orlu, ke egwu eji amaranyi? We seem to have lost our cultural heritage.
Dalukwa Amanda nwanyi oma, ya gaziere gi na edemede a.

Pardon all typos pls...kikiki

ego lag said...

OKWU NTABIRE
Eku su Mbepu mbe su ekupu (3times )
Ite su oku pu, oku su ite pu ( 3 times)

zion baby said...

Hahahahaha.. Stella u no go kee person.

Ndewonu!! Igbo muru eze muo ozo.
Ya dikwara nwa afo Igbo obula nma...iseeeee.
Amachaghim ofuma egwu ndi be anyi n'agba mana amaram na onwere nke anyi n'akpo egwu owu.
Tupu imara agba egwu a..ikwesiri ima ka esi ehulata ofuma tupu iwere ukwu gi were n'ete egwu a.
Amachahim ya agba ofumu maka na etoghim n'ulo mana anakwam agbali nke ikem kwerem.

Igbo di oma nwem ekelekwam unu.
Ya dikwara onye ukwu nma dikwara onye ala nma.

O buru na ana alota uwa ozo..akam ga abu onye Igbo.

Ndewo nu umu nnem!!.

Just Glamour said...

Kedu onye delu nka? Obu Amanda Favor? Onye delu jisike,onwelu igwu anakpo 'Igede' kedu onye malu agwua?

PinKy berRy said...

Nne ichetarum egwu egedege oo Chaii mgbe Uwa bu Uwa oburokwa kita ihe nile na ada komkom...


Nwanyi n'akwa akwa na akwa akwa nelu nnunu di nelu akwa....

Echefucharam Okwu nta bire nile nma oo

Anonymous said...

Mama magi gotere magi,magi rachaa magi mama magi gotere ekwe ekwe ga ekwe na ute ekwere

White Diamond said...

Ehen?

Taa ka'm mara ihe a n'akpo egwu ndi Ihiala. Daalu so. Ala bu otu ka m bu. Mana anaram obodo na ekeresimesi nkea gara aga, ka mgbe aro isii. Abu m nwa 042. Ochi atogbom oo.

#WhiteDiamondOut

Hottest Chic said...

Tinye aka na akpa akakpo ka I welu ife di na akpa akakpo ka Inye akakpo ka olie.

Anonymous said...

Lol! Egwu ndi banyi bu Egwu gbagba nkoro Bia. Lmbo

missylynn said...

Igbo amaka
Igbo kwenu

amanda favour said...

iji ya

amanda favour said...

yes, I mean those traditional IGBO dances, atiliogwu et al.
Daalu nwanne m

Rhoda Rex said...

I follow u for back. 🙈🙈🙈🙈🙈

amanda favour said...

Hahaha, I nwetera ya
mana o bu ukochukwu,okechukwu
Daalu nwanne m

amanda favour said...

Hahaha, nwanne m Daalu o!

amanda favour said...

Daalu onye oma

Efe Kevin said...

Omalicha kedu

amanda favour said...

Onye oma m Daalu
A na m ekele o!

Chidinma Gift said...

Abu m nwafor Ngwa. #igboamaka #ngwagirltothecore

Makason said...

🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌

Makason said...

No.

Makason said...

Igbo Kwenu!!!!!!!!!

Anonymous said...

Iseeee!!! Ya gazielu gi Nne

Anonymous said...

Iseeee!!! Ya gazielu gi Nne

calabar chick said...

Igbo Kwenu!
As an Igbo bride that I is nau...lol!
I want to learn the language o, hubby is not helping matters at all...Maybe he doesn't want me to sha!

Daalu Amanda!

peace maker said...

Nice

Esther Mgbolu said...

Indii igbo kedu nuu!but igbo is hard for me shar.i did igbo once in secondary school and i never understood a single thing the teacher was saying and everybody in my class knew.anyway the day he pointed at me and asked me to define unnochiaha,the whole class laughed at me ehn because they know i don't no the meaning but i passed my igbo,i got B thanks to copy and paste.Amanda Favour daalu sor naa ife ide naa onu igbo,e di too much.abeg don't mind my igbo oo

Sharon Aminu said...

Tribalism, I no gree,na here I go slp today.lols until u interprets it

zion baby said...

Adim nma😃😃

amanda favour said...

Chukwu gozi kwa gi nwanne m Becky
daalu

preciousp gal said...

Biko bv Amara,oge ozo ina edebata akwukwo,biko dee ya na central igbo k'onye obula wee ghota ihe idere.

the pretty one said...

Ndi be Nke anyi n' agba egwu Akwunechenyi. Nkea bu egwu ndi omambala n'anambra state. Ndi omambala bu ndi Oyi, Ayamelum, na ndi anambra East and west LG Areas. Dalu nu.

amanda favour said...

Ya!!!!!
Daalu nwanne m

amanda favour said...

Ego nwanne m Daalu
iji ya

amanda favour said...

Nne , o bu kwa m o!
Daalu onye oma

amanda favour said...

Pinky nwanne ,eziokwu eeh umu egwu odinala anyi na-uto, mana Ndi ogbalu ohuru achoghi zi ya.
Daalu nwanne m nwanyi

amanda favour said...

hahaha
Daalu nwanne m nwanyi

amanda favour said...

Daalu CC
oya Learn IGBO language,you'll love it

amanda favour said...

Ya!!!!!!!

amanda favour said...

Ebee bu be unu?

amanda favour said...

Iji ya

Daalu

amanda favour said...

Daalu nwannem
ala bu otu a idere atogbuem

amanda favour said...

Iji ya

amanda favour said...

Eziokwu ka I kwuru
Daalu

amanda favour said...

Ekele kwa m gi nneoma

amanda favour said...

Hahaha@ Sharon Aminu
Ana m abia ka m kowra gi ya inugo?

Hehehe

amanda favour said...

Stella you just changed my blog name to Amara
issorite.

Anonymous said...

Stella nwanyi oma ndewo.Egwu ndi be anyi na agba bu OKOROSHA na KELEKE(izaga).

Anonymous said...

Na ala Obowo di na Imo steti, anyi n'agba egwu okonko, bu egwu eji eti mmuonwu ma o bu iri ji our, ibo uzo na iwa akwa. O nwere nke ana akpo para racha, bu nke ana agba na nmenme obi uto dika igba nkwu, iwa akwa dgz ozokwa be nke ana akpo ese bu nke ana agba mgbe nwoke nwuru na uko bu nke ana agba mgbe nwanyi nwuru.ogwula ka oham na on. Ka emesis.

Beloved said...

Lmao

Beloved said...

O bu ghi central igbo ka a na akpo ya na igbo ... ka ma o bu igbo izugbe

Ide igbo fi a kwala Ahu mana a kara m ya A1 na ule senio sekondari

Ochi a to gbu e mu
😂😂😂

Beloved said...

Uniq gem na Rhoda ... ngwa na gboo nu

Beloved said...

Ndo nwanne m

Beloved said...

I gbali a na

amanda favour said...

Zion baby, nne I bu nno ezigbote nwafo IGBO.
Daalu nwanne m nwanyi

amanda favour said...

Daalu nwanne m
chukwu gozie gi

chinyere adajesus said...

🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌.

Oka osi me...

amanda favour said...

Daalu onye oma
obodo unu bu Ebee?

Pipi Lee said...

Daalu so

amanda favour said...

Daalu nwanne m
Biko gini bu iwa akwa?

Adanne said...

Daa dighi otu?

Quality Madam said...

Umu Igbo ekene mu Unu
Anambra kwenu
Dunukofia kasinu
Ukpo nwua nu zua nu ka umu Unu zua unu
Egwu eji Mara ndi be anyi bu egwu "aku na eche enyi "
Dalu nu

Eby said...

Ndewo nu umunnem

IJAY said...

Ndi ba anyi Ndewo nnu, Igbo amaka

Amacastel said...

Ndi delta Na agba egwu Amala, ufodu Na agba egwu ogolo

Amacastel said...

Abum nwa afo Obowu Na okpuru ochichi Imo state Ndi beanyi Na agba egwu ahiri ahi ukwu, anyi bu Ndi umungwa di Na Obowu agba kwazi ekpo.

Amacastel said...

Ibu ezigbote nwa afo igbo Na ezie. Nwanyi oma jide ka Iji Ada eji ejemba. Igbo gi di uso. Oburo kwa nke Ndi mama anyi si Na anyi bu igbo.iruru eru

Amacastel said...

Nwannem kwusi ike oooo.

Amacastel said...

Onye Ole ebe ka iwu Na Obowu? ikwuru eziokwu anyi Na agbakwa egwu odumodu. Abum onye Umu Ngwa ebe ahia Malaysia.
Dalu nwannem.

Amacastel said...

Nwada Amanda jide ka Iji, olisa bi n'igwe Gba gi ume. Iga adika echi.

Ekunie Ify said...

Igbo bu igbo ekene m unu
Abu nwafor Anambra sitati, onye Idemili North, egwu ejiri mara ndi obodom bu egwu "akwum eche enyi",nya bu egwu mara mma, ana agba ya na ebe ana agba nkwu nwanyi, ikwa ozu, ichi ozo ma obu ihie obuna ndi obodo na eme, ikpokworo ha bu na ha abiaghii, nya bu egwu amaka, Amanda favor, daalu nnem imere nke oma maka na ide igbo abughi oku nwata na agba ngada anya. Lolzzzzzzzz

Vivilicious said...

A maghi kwa m egwu Igbo, sooso nke m ma bu atilogwu 🙈. Amanda nwanne m nwaanyi, dalu, chukwu gozie GI

ego lag said...

Anyi na kwa gba okorocha na keleke. Iwu onye Amaokpara?

Dope PH BaBe said...

Amacastel, nnem by onye etiti na obowu ihite uboma.

Dope PH BaBe said...

Amaghim egwu ndi ulo anyi oooh. Ihere emegbuolam. Abum nwa ada ndi ubakala umuahia na abia steti.

Dope PH BaBe said...

Iwa akwa bu ihe gosiri na nwaokoro ma obu nwagboho etozuola.

Anon said...

As a bonafide Nwa afo Owerri, ka m jiri okwu Owerri jiri kowa nke anyi. Ndi Owerri na agba avu ukwu/egwu ukwu. Umuada Owerri weda ukwu ala..ego ana awu n'ala. Umu Igbo ndi eji eje mba, ya gazie oo.

Amanda favour, jishie ike oo.

amanda favour said...

DaAlu nwanne m

amanda favour said...

Ana m. ekele o!

Amacastel said...

Ya bu Na iwu okelem

Anonymous said...

Ala Mbaise muru m n'agba abiigbo na agbachaa ekuru nwa.enwekwara ndi ozo

chim_oma chim_oma said...

Unubi kwenu……ye
Kwenu……ye
Kwesuenu ooo……ye ye ye.
Unubi ana oma.
Unu bikwa? Anyi bi.
Abu m ada Unubi.
Egwu Egedege enweghi ntunyeru.
Ndi Unubi bu ndi egwu.
Unubi bu ebe ihe na eme.

Ngwa ka m banyesia na okwu ntabi ile.
#Ekwe ekwe na- ekwe na uta ekwere.
#Tinji mpiji tipu nji nsi.
#Ukochukwu okechukwu kwuru okwu chukwu n'ulo chukwu di na Alochukwu.
#Ka ahutasia ka akotasia ka nkpo jiri tu enwe na isi.

Umunne m ekelekwa m unu ooo...
Ka udo na-achinu Umunne na Uwa bu pawpaw. Uwa achoghi ntukwuba eze.

chim_oma chim_oma said...

Nekwanu onye umune nne m, ebe mama mu si. Ndi Amaigbo na Nkwere n'Ime Imo state. Chee! Okorosha! Ana m emisi umune nnem.
#Asi na obu na ndu ka oka. Onye nwere ndu, nwere orile anya.
Dalunu umunne m.

Ada Amawbia said...

Igbo umunne m abiaghim gboo ndi Amawbia be anyi nwere egwu mmawu ijele egwu ha mara mma nke ukwu. Umunwanyi na agba ya na ayo ya ayo. Onwekwara nke ana akpo igba eze


Amawbia ugbo ogiriga

zion baby said...

Daalu nu umunnem!
Onye nwa anyi gozie unu....iseeee!!
@Amanda favour& Amacastel.

Ada Ejike Onyeama said...

Mazi nine nu ooo.....
Umu nwanyi ori ihe ori ihe....
Umu okpu mu na unu ejighi ooo.
Abum nwa afo Arondizuogu di na okpuru ochichi Ideato north na Imo Steti.
Ana anum na Eke nke di na okpuru ochichi Udi na Enugu Steti.
Ndi be nnam na agba egwu Igba eze.
Ndi be dim na akwa abia.
Dooooonu ooooo...

Related Posts Plugin for WordPress, Blogger...