Stella Dimoko Korkus.com: EGWU NDI IGBO

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Monday, February 13, 2017

EGWU NDI IGBO

If you read and do not Understand Biko,move on to the next post...







IGBO KWENU ........... YA!
IGBO KWENU..............YA!!
IGBO KWEZUONU........ ISEEE!!!!!!



Ndi be anyi ekele m unu!
Nke onye chiri ya zere
Awuchikwala m ozo ka anyi noria taa.
A choro m ka -anyi kparita maka egwu Di iche iche ejiri Mara anyi by Ndi IGBO .
Ndi IGBO nwere otutu egwu.


Ndi be anyi na Izhiangbo na-agba egwu Odabara.
Egwu Odabara na-ato uto nke ukwuu. Akwa egwu ha makwara MMA .
A na- akpo ha ka ha gbaa egwu ebe a na-agba nkwu ma kwa ebe a na-akwa ozu.

Ndi nnewi na-agba Igba-Eze. Ndi umunze nwere egwu Mkpokiti. Egwu a nwere ukwu egwu di-iche iche eko agba ya.
Ufodu bu nke mmadu abuo ma o bu Karia na-arikwasi n'elu otu onye egwu,onye nke ikpeazu na-ano n'elu na-ayori egwu.

Ndi ihiala na-agba egwu okachamma. Ndi Afikpo na-agba Nkwa Umuagbogho.
Ndi Unubi na-agba Egedege.
Theresa onuoha mekwara ka-egwu ahu na ewu ewu.

Egwu Egedege na ato uto. Nke kachasi ato m uto na egwu ahu bu oja ha na-afu. Egwu na-ada, oja a na- afio, ukwu a na-ada n'ala. Egwu Ndi IGBO na-enye obi uto.

Umunne m ,kedu egwu unu nwere na obodo unu?
Bia gwa anyi, gwakwa anyi ka esi agba ya.

Tupu anyi emechie nke taa, ka anyi mee OKWU NTABIRE.

Okwu NTABIRE bu okwu Ndi bu ekwuo ha ngwa ngwa, ikwuhie onu. Ikwuhie okwu a na-ato ochi.
Omumatu:

1. Kpughepu mpoto,kpunyekwa mpoto ebe o puru.
.2. Ndi achi kwu chi m,na-ebe a na-ere chimchim, na-atakwa chimchim.
.3.Nwanyi na-akwa akwa ,I na-akwa akwa na okuko yiri akwa n'elu akwa ikwara Di n'elu akwa.
4. Papa pita patara popo panye papa pol, papa pol para popo pabaa na- palo.
5..Manye aka n'akpa akakpo,ka I were ihe n'akpa akakpo ka o rie.

Hahahahahaha...,okwu ntabire na-ato uto.
Biko Bia tinye nke gi
Umunne m ka odi oge ozo.

BY BV AMARA



*Hian Biko,Ndi Delta Nwe Egwu toh badt!..LMAO


101 comments:

  1. Beautiful post, unto the next post pls

    ReplyDelete
  2. Replies
    1. Tribalism, I no gree,na here I go slp today.lols until u interprets it

      Delete
    2. Hahaha@ Sharon Aminu
      Ana m abia ka m kowra gi ya inugo?

      Hehehe

      Delete
    3. Igbo umunne m abiaghim gboo ndi Amawbia be anyi nwere egwu mmawu ijele egwu ha mara mma nke ukwu. Umunwanyi na agba ya na ayo ya ayo. Onwekwara nke ana akpo igba eze


      Amawbia ugbo ogiriga

      Delete
  3. Replies
    1. Unubi kwenu……ye
      Kwenu……ye
      Kwesuenu ooo……ye ye ye.
      Unubi ana oma.
      Unu bikwa? Anyi bi.
      Abu m ada Unubi.
      Egwu Egedege enweghi ntunyeru.
      Ndi Unubi bu ndi egwu.
      Unubi bu ebe ihe na eme.

      Ngwa ka m banyesia na okwu ntabi ile.
      #Ekwe ekwe na- ekwe na uta ekwere.
      #Tinji mpiji tipu nji nsi.
      #Ukochukwu okechukwu kwuru okwu chukwu n'ulo chukwu di na Alochukwu.
      #Ka ahutasia ka akotasia ka nkpo jiri tu enwe na isi.

      Umunne m ekelekwa m unu ooo...
      Ka udo na-achinu Umunne na Uwa bu pawpaw. Uwa achoghi ntukwuba eze.

      Delete
  4. Replies
    1. 🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌

      Delete
    2. Iseeee!!! Ya gazielu gi Nne

      Delete
    3. Iseeee!!! Ya gazielu gi Nne

      Delete
    4. 🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌.

      Oka osi me...

      Delete
  5. Replies
    1. Biko bv Amara,oge ozo ina edebata akwukwo,biko dee ya na central igbo k'onye obula wee ghota ihe idere.

      Delete
    2. O bu ghi central igbo ka a na akpo ya na igbo ... ka ma o bu igbo izugbe

      Ide igbo fi a kwala Ahu mana a kara m ya A1 na ule senio sekondari

      Ochi a to gbu e mu
      😂😂😂

      Delete
  6. Odinma oo
    Chukwu gozie gi onye dere edemede a. Igbo kwenu

    ReplyDelete
  7. *moves to the next post* 👋 👋 👋

    ReplyDelete
    Replies
    1. I follow u for back. 🙈🙈🙈🙈🙈

      Delete
    2. Uniq gem na Rhoda ... ngwa na gboo nu

      Delete
  8. is this amanda favour again? Nne you try. i dont really get as i was really trying hard to read but did you mean the different dances in from different states? or all those old music from imo. i love them. if its dances, i know of atilogwu, ikorodo etc

    ReplyDelete
    Replies
    1. yes, I mean those traditional IGBO dances, atiliogwu et al.
      Daalu nwanne m

      Delete
  9. Okechukwu, Ukochukwu jere okwu chukwu n'ulo uka di n'arochukwu, Ti nchi kpim, tipu nchi nsi. ka o dinu oge ozo umu igbo.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahaha, I nwetera ya
      mana o bu ukochukwu,okechukwu
      Daalu nwanne m

      Delete
  10. Agucha m ya biko. O toro ogologo too much. Ka m chere ebe a maka ndi nkowa.... udo!

    ReplyDelete
  11. Ngwanuu , Umunne m putaba nu
    Bia gwa anyi egwu Ndi obodo unu na-agba

    ReplyDelete
    Replies
    1. Stella you just changed my blog name to Amara
      issorite.

      Delete
    2. Abum nwa afo Obowu Na okpuru ochichi Imo state Ndi beanyi Na agba egwu ahiri ahi ukwu, anyi bu Ndi umungwa di Na Obowu agba kwazi ekpo.

      Delete
    3. A maghi kwa m egwu Igbo, sooso nke m ma bu atilogwu 🙈. Amanda nwanne m nwaanyi, dalu, chukwu gozie GI

      Delete
    4. Amacastel, nnem by onye etiti na obowu ihite uboma.

      Delete
  12. Igbo Kwenu!!

    Read for a while, then the mental stress became much. Had to jump and pass jare.

    But from what I read; "Thumbs Up! We've got great dances indeed."

    Cheers..

    ReplyDelete
  13. Igbo Kwenu!!!!

    Biko Umunnem, amam agba egwu adanma, o kwa na sukulu ka mu mutara nka, o di ka egwu ndi Enugu steti. Biko ndi Orlu, ke egwu eji amaranyi? We seem to have lost our cultural heritage.
    Dalukwa Amanda nwanyi oma, ya gaziere gi na edemede a.

    Pardon all typos pls...kikiki

    ReplyDelete
  14. OKWU NTABIRE
    Eku su Mbepu mbe su ekupu (3times )
    Ite su oku pu, oku su ite pu ( 3 times)

    ReplyDelete
  15. Hahahahaha.. Stella u no go kee person.

    Ndewonu!! Igbo muru eze muo ozo.
    Ya dikwara nwa afo Igbo obula nma...iseeeee.
    Amachaghim ofuma egwu ndi be anyi n'agba mana amaram na onwere nke anyi n'akpo egwu owu.
    Tupu imara agba egwu a..ikwesiri ima ka esi ehulata ofuma tupu iwere ukwu gi were n'ete egwu a.
    Amachahim ya agba ofumu maka na etoghim n'ulo mana anakwam agbali nke ikem kwerem.

    Igbo di oma nwem ekelekwam unu.
    Ya dikwara onye ukwu nma dikwara onye ala nma.

    O buru na ana alota uwa ozo..akam ga abu onye Igbo.

    Ndewo nu umu nnem!!.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Zion baby, nne I bu nno ezigbote nwafo IGBO.
      Daalu nwanne m nwanyi

      Delete
    2. Ibu ezigbote nwa afo igbo Na ezie. Nwanyi oma jide ka Iji Ada eji ejemba. Igbo gi di uso. Oburo kwa nke Ndi mama anyi si Na anyi bu igbo.iruru eru

      Delete
    3. Daalu nu umunnem!
      Onye nwa anyi gozie unu....iseeee!!
      @Amanda favour& Amacastel.

      Delete
  16. Kedu onye delu nka? Obu Amanda Favor? Onye delu jisike,onwelu igwu anakpo 'Igede' kedu onye malu agwua?

    ReplyDelete
  17. Nne ichetarum egwu egedege oo Chaii mgbe Uwa bu Uwa oburokwa kita ihe nile na ada komkom...


    Nwanyi n'akwa akwa na akwa akwa nelu nnunu di nelu akwa....

    Echefucharam Okwu nta bire nile nma oo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Pinky nwanne ,eziokwu eeh umu egwu odinala anyi na-uto, mana Ndi ogbalu ohuru achoghi zi ya.
      Daalu nwanne m nwanyi

      Delete
  18. Mama magi gotere magi,magi rachaa magi mama magi gotere ekwe ekwe ga ekwe na ute ekwere

    ReplyDelete
  19. Ehen?

    Taa ka'm mara ihe a n'akpo egwu ndi Ihiala. Daalu so. Ala bu otu ka m bu. Mana anaram obodo na ekeresimesi nkea gara aga, ka mgbe aro isii. Abu m nwa 042. Ochi atogbom oo.

    #WhiteDiamondOut

    ReplyDelete
  20. Tinye aka na akpa akakpo ka I welu ife di na akpa akakpo ka Inye akakpo ka olie.

    ReplyDelete
  21. Lol! Egwu ndi banyi bu Egwu gbagba nkoro Bia. Lmbo

    ReplyDelete
  22. Igbo Kwenu!
    As an Igbo bride that I is nau...lol!
    I want to learn the language o, hubby is not helping matters at all...Maybe he doesn't want me to sha!

    Daalu Amanda!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu CC
      oya Learn IGBO language,you'll love it

      Delete
  23. Indii igbo kedu nuu!but igbo is hard for me shar.i did igbo once in secondary school and i never understood a single thing the teacher was saying and everybody in my class knew.anyway the day he pointed at me and asked me to define unnochiaha,the whole class laughed at me ehn because they know i don't no the meaning but i passed my igbo,i got B thanks to copy and paste.Amanda Favour daalu sor naa ife ide naa onu igbo,e di too much.abeg don't mind my igbo oo

    ReplyDelete
  24. Ndi be Nke anyi n' agba egwu Akwunechenyi. Nkea bu egwu ndi omambala n'anambra state. Ndi omambala bu ndi Oyi, Ayamelum, na ndi anambra East and west LG Areas. Dalu nu.

    ReplyDelete
  25. Stella nwanyi oma ndewo.Egwu ndi be anyi na agba bu OKOROSHA na KELEKE(izaga).

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu onye oma
      obodo unu bu Ebee?

      Delete
    2. Anyi na kwa gba okorocha na keleke. Iwu onye Amaokpara?

      Delete
    3. Nekwanu onye umune nne m, ebe mama mu si. Ndi Amaigbo na Nkwere n'Ime Imo state. Chee! Okorosha! Ana m emisi umune nnem.
      #Asi na obu na ndu ka oka. Onye nwere ndu, nwere orile anya.
      Dalunu umunne m.

      Delete
  26. Na ala Obowo di na Imo steti, anyi n'agba egwu okonko, bu egwu eji eti mmuonwu ma o bu iri ji our, ibo uzo na iwa akwa. O nwere nke ana akpo para racha, bu nke ana agba na nmenme obi uto dika igba nkwu, iwa akwa dgz ozokwa be nke ana akpo ese bu nke ana agba mgbe nwoke nwuru na uko bu nke ana agba mgbe nwanyi nwuru.ogwula ka oham na on. Ka emesis.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu nwanne m
      Biko gini bu iwa akwa?

      Delete
    2. Onye Ole ebe ka iwu Na Obowu? ikwuru eziokwu anyi Na agbakwa egwu odumodu. Abum onye Umu Ngwa ebe ahia Malaysia.
      Dalu nwannem.

      Delete
    3. Iwa akwa bu ihe gosiri na nwaokoro ma obu nwagboho etozuola.

      Delete
  27. Umu Igbo ekene mu Unu
    Anambra kwenu
    Dunukofia kasinu
    Ukpo nwua nu zua nu ka umu Unu zua unu
    Egwu eji Mara ndi be anyi bu egwu "aku na eche enyi "
    Dalu nu

    ReplyDelete
  28. Ndi ba anyi Ndewo nnu, Igbo amaka

    ReplyDelete
  29. Nwada Amanda jide ka Iji, olisa bi n'igwe Gba gi ume. Iga adika echi.

    ReplyDelete
  30. Igbo bu igbo ekene m unu
    Abu nwafor Anambra sitati, onye Idemili North, egwu ejiri mara ndi obodom bu egwu "akwum eche enyi",nya bu egwu mara mma, ana agba ya na ebe ana agba nkwu nwanyi, ikwa ozu, ichi ozo ma obu ihie obuna ndi obodo na eme, ikpokworo ha bu na ha abiaghii, nya bu egwu amaka, Amanda favor, daalu nnem imere nke oma maka na ide igbo abughi oku nwata na agba ngada anya. Lolzzzzzzzz

    ReplyDelete
  31. Amaghim egwu ndi ulo anyi oooh. Ihere emegbuolam. Abum nwa ada ndi ubakala umuahia na abia steti.

    ReplyDelete
  32. As a bonafide Nwa afo Owerri, ka m jiri okwu Owerri jiri kowa nke anyi. Ndi Owerri na agba avu ukwu/egwu ukwu. Umuada Owerri weda ukwu ala..ego ana awu n'ala. Umu Igbo ndi eji eje mba, ya gazie oo.

    Amanda favour, jishie ike oo.

    ReplyDelete
  33. Ala Mbaise muru m n'agba abiigbo na agbachaa ekuru nwa.enwekwara ndi ozo

    ReplyDelete
  34. Mazi nine nu ooo.....
    Umu nwanyi ori ihe ori ihe....
    Umu okpu mu na unu ejighi ooo.
    Abum nwa afo Arondizuogu di na okpuru ochichi Ideato north na Imo Steti.
    Ana anum na Eke nke di na okpuru ochichi Udi na Enugu Steti.
    Ndi be nnam na agba egwu Igba eze.
    Ndi be dim na akwa abia.
    Dooooonu ooooo...

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141