Stella Dimoko Korkus.com: MYIRI/MYIWERE

Advertisement

Advertisement - Mobile In-Article

Wednesday, August 16, 2017

MYIRI/MYIWERE

Amanda biala kwa...oh ne kwokwu words with similar meanings...okwi hotara?...Eh hen!!!





IGBO KWEENU......YA!
IGBO KWEENU.......YA!
IGBO KWEZUONU....... ISEEE!!!!

Ndi be anyi ekele m unu,nke onye chiri ya zere. Abiala nu m ozo ka anyi nokonu suo asusu anyi bu igbo.
Unu mara na asusu igbo di iche iche,ya mere m ji si ka anyi tule isi okwu a bu MYIRI/MYIWERE.
Myiri bu okwu yiri ma o bu yitewere ibe ya na nghota. Ihe nkea putara bu na otu ihe nwere ike inwe otutu okwu eji mara ya.
Omumatu;

1. Abu : Ukwe

2. Abali : Anyasi, Uchichi

3.Ezu : Uzo, Iro, Okporo, Ama

4. Asampete : Mma, Apunanwu, Okauma

5. Efe ; Afe, Uwe,Njikwa

6. Nwata ; Nwa, Taata

7. Agha ; Ogu, Ogbaghara

8. Ebiri ; Ogbo

9. Ego ; Okpogho, Ncho-ncho

10. Anu ; Ntanta

11. Nsoala ; Aru

12. Ngwa-ngwa ; oso-oso, Osi-so

13. Agadi ; Okenye

Ngwanu,o buru na o nwere okwu ndi i mara nwere otu nghota bia gwa anyi ka anyi muta inugo?.

Daalu nu umunne m,o ka bukwa nwanne unu nwanyi BV Amanda Favour.




*Please no hating,if you want to dialogue in your native Language,send it in and those who Understand will take part in it.


73 comments:

  1. Ndigbo ke ebe unu? Anamekele o

    ReplyDelete
  2. Amanda nwanyi OMA!Daalu nne!

    Amu,utu,ngbaduga

    Ikpu,otele,Ike,ohu😁😁

    Kam biakwanu ooo

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ihe obula bayere amu na otu na atogi bullshit

      Delete
    2. Hahahaha😁 @sexy daddy,imebisigo nwoke a
      Daalu nwanne m Nwoke

      Delete
    3. Creamy Ara gbagi dia!IBU onye Ara?Ebule ahu ragbuo GI onye iberibe😈😈

      Delete
  3. Lol. Didn't understand everything but thanks to Google translate that immediately identified that the page was in Igbo and asked if I want it translated, I followed the gist small

    ReplyDelete
  4. Amanda nwa oma, dalu o. Odizim kam no na ala Igbo kita. Tinyelu na Stella na atabi ire ya na ebea. Ngwa kam tinye nkem.
    Ikpajika: Inwaka, igbaniana
    Ibioma: Itiobi, imaku
    Obi: Nkpu, Ngwuru
    Isi: Isii (Ife rere ere)
    ikpele: Ikpulu ukwu
    Okenye: Agadi
    Oji (black): Oji (kolanut)
    Kam biakwa.
    Nwunye G na Chike, kam rapulunu unu ogbo.

    ReplyDelete
  5. Ofu;Mbu;Otu

    Otu; Ikpu

    ASo;Osiso (saliva)

    Abu; Egwu

    Ike;Otele

    Sie;Wue (to cook)

    Ekperima;onye ori

    Mama;Nne

    Papa,Nna


    Ekenee mu gi Nwada Amanda!
    Kedu nke ana-etu gi?

    E tu o m gi Odiuko Na mba 1! 😂




    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahaha hahahaha 😁 Nwumye G,Ekele m gi o!
      Aka m di n'elu o! 🙌🙌

      O nwero kwa nke a na etu m mana m ga azabazi kwa nkea ituru m ugbua....hehehe

      Daalu nwanne m nwanyi,kelere m ndi be gi

      Delete
    2. Nwunye G ndewo nwanne mmadu.
      Nwada Amanda ikajara akaja.
      Dali nu ndibeanyi ekenemunuo.

      Just Krix!

      Delete
    3. Ndi nwe mmadu ekenee mu unu o!
      Oga Krix,Aku Na-esi obi Ike 1!
      Amy,Odiuko Na mba Na sexy Daddy Onwa himself ekene mu unu o!

      Delete
  6. Ndi..... nri

    Nalu....... naru hahahahaha

    otutuoma -...... ibolachi

    ReplyDelete
  7. Hahahaha 😁 chineke!
    Stella kedu ihe idere ihea ?

    Umunne m ngwanu,ka anyi suo igbo

    ReplyDelete
  8. Replies
    1. Sassy,sassy!, daalu Ada igbo. O tekwala m huru gi ebea, ama m na udo di?

      Delete
    2. Amanda Nwanne m Nwanyi,a di m no mma.Kedu k'imere nne m?

      Delete
  9. Nice! Gini ka no 8 meani biko?
    Ermm, Can I think of any to add to d list atm? Hehehe!
    Nwanne mmadu @Amanda Favour,
    Oga dili gi nma na aga. Iseeeeeeee! Daalu rinne inugo. Ngwa nara nsusu😘😘😘 #IgboAmaka

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahahaha,sandy yo!
      Biakwa bia tinye nke gi inugo?

      Delete
    2. Gini bu myiri mkpuruokwu ujo na ukwu ike

      Delete
  10. ike,: otu, ikpu

    ReplyDelete
  11. Amanda nwanyi oma imeela. Asusu Igbo amaka nke ukwuu. Mfuzikwa onye ma asu ya, obi anuli na akpa mu ofuma-ofuma.
    Enwekwara ufodu omumaatu dika:
    Agadi-Okenye,nne/nna ochie.
    Okporo uzo- uzo asaa,uzo owerre wdg(wee diri gaba)
    Asusu Igbo na ato ka mmanu aghu(honey)
    Igbo kwezuonu!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Daalu rinne Ada Aguiyi
      Onye oma o ga-adiri mma

      Delete
  12. Ezi nwanne Amanda Chi gozie gi nke ukwu.
    Uwe--efe, akwa, nwee

    ReplyDelete
  13. Una weldone, me from other tribe (southwest) wey marry una brother, how u wan make i understand?

    ReplyDelete
  14. Agam aguru unu abuoma 23 n'asusu igbo!

    Jehova bu onye nāzùm dika aguru, ó dighi ihe korom.
    N'ebe ita nri nke ahihia ndu is oneme ka makpuru. N'akuku miri nke izu-ike ka ona edum nwayo.
    Ona eweghachi nkpuru obim:Onedum n'uzo nile nke ezi omume n'ihi aha-ya.
    Ozo, asi na mu eje ije na ndagwurugwu onyinyo onwu, agaghim atu egwu ihe ojo obula; n'ihi na gi onwegi nonyerem:
    Ndele gi na nkpa n'aka gi,ya onwe ya n'akasim obi.
    I nedo table n'usoro n'irum n'anya ndi nakpagbum: itewo isim mmanu; ikom bu iwebiga ihe oke.
    Nani idi nma na eberegi gagbasom ubochi ndum nile: mgebikwa n'ulo Jehova ruo ogologo ubochi ndum nile. Amen

    Just Krix!

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ukochukwu SDK BLOOGU,A na m ekele o! Onye oma 🙌

      Delete
    2. I si na Jehovah n'azu gi dika AGURU? Chai,o dikwanu mma??😂😂😂😂

      Delete
  15. Nsusu - Nsutu - Mmicha = kiss
    Otele - ike = bum bum
    OTU - ikpu - ike = pussy

    ReplyDelete
    Replies
    1. Bia chike, A ga m apia gi na sexy Daddy utari o, unu abuo emebisigo kwa...chei!

      Delete
  16. Nnya-echi garaga
    Nwanyi-okpoho
    Osia/onu uso-akpilinogonogo
    Uku-orkpa
    Pussu-bussu
    Afele-efere
    Li nni-ri nnri
    Erm Amanda nna bia,let me come and be going,a tryigom

    ReplyDelete
    Replies
    1. Hahahaha 😁 @Esther "itryigo" nne...😁
      Daalu

      Delete
  17. ukwu/okpa
    okporo/ama ocha/uzo oyibo
    nne/mama

    ka m biakwa

    dalu nu o.

    ReplyDelete
  18. Nwanne nnwayi Amanda inaa gbali rinne, Ndewoooooooo, Chukwu Gozie gi😘😘😘

    ReplyDelete
  19. Pan, efere, abuba
    Nwatakiri, oberenwa
    Uri, egwu, nkwa, ukwe, abu
    Otikpiri, mposi, lanu (toilet)

    ReplyDelete
  20. Egwu - nkwa = music
    Echi - ahu = body
    Akpu ukwu - akpukpo ukwu = shoe

    ReplyDelete
  21. Igwe - Eze = King
    Oriaku - Nwunye - ogoli = wife
    Di - Ji (Nsukka) = husband

    ReplyDelete
  22. Asa - Nma = beauty
    Umu aka - umu azi - mmu aro = children
    Ego - Ola ocha - okpoho =money

    ReplyDelete
  23. Anyasi: uchichi, ndeli,...

    Ego: okpogho, mma nwoke,...

    Otu: otele, ike,....

    Ila otu: ipia oku,ikwokirikwo..

    Onye ochi: ekpelima, onye ohi,agu mbu.

    Akwunakwuna: onye oku enu, okwu n'ilo,

    Nsuko: okpako,...

    Aids: obili na aja ocha, oria
    mmenwu,..

    Iro: okporo uzo, ama,...

    Ima ura: ikpaka nti,..

    chim-oma a.k.a. Miss Kapusu



    ReplyDelete
  24. Mu wa = ike m= ogwe m
    Di=ji
    Oro ma=epe
    Oka=uko oro
    Abacha =akpu nmiri

    ReplyDelete
  25. I'm adding a few I know to the original one posted.
    No 2. Nngede, enyashi
    No 3. ezukwu, uzor
    No 5. Èwò, Akwa
    No 6. Igosi, nwata
    No 12. Ozigbo, ozugbo
    No 13. Ikei, egedi, agadi

    ReplyDelete
  26. Nwada Amanda,Chukwu ga agozi gi na eke,orie,afor,nkwo. Iga adika echi maka na echi adighi agwu agwu....

    ReplyDelete
  27. Amanda is Imo or Abia

    Stella, leave Igbo speaking alone, stick to your pidgin

    nkea, ke,

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141